Akwụkwọ nsọ
Hilaman 5


Isi 5

Nifaị na Lihaị nyefere onwe ha ikwusa ozi-ọma—Aha ha na-akpọ ha oku imezi ndụ ha dịka nke ndị bu ha ụzọ—Kraịst na-agbapụta ndị na-echegharị—Nifaị na Lihaị nwetara ọtụtụ ndị gbanwere ma a tụrụ ha mkpọrọ, ma ọkụ gbachibidoro ha gburu-gburu—Igwe-ojii nke ọchịchịrị kpuchidere ndị mmadụ dị narị atọ—Ụwa na-ama jijiji, ma otu olu na-enye ndị mmadụ iwu ka ha chegharịa—Nifaị na Lihaị wee kparịta ụka ha na ndị mụọ-ozi, ma igwe mmadụ ahụ ọkụ gbachibidoro ha gburu-gburu. Ihe dịka nʼafọ 30 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma o wee ruo na nʼime otu afọ nke a, lee, aNifaị nyefere otu nwoke aha ya bụ Sizorọm oche-ikpe ahụ.

2 N’ihi na ebe ọbụ na iwu ha nile na ọchịchị ha nile ehiwere ha site anʼolu nke ndị ahụ, ma ndị nke bhọọrọ ajọọ-ihe dị imerime nʼọnụ-ọgụgụ karịa ndị nke họọrọ ihe ọma, ya mere ha nọ na-acha maka mbibi, n’ihi na iwu nile ahụ e mebiwo ha.

3 E, ma nke a abụghị ihe nile; ha bụụrụ ndị na-akpọ-ekwe-nkụ, nke mere na e nweghị ike iji iwu ma-ọbụ ikpe-ziri-ezi chịa ha, ma ọbụghị na mbibi ha.

4 Ma o wee ruo na Nifaị ike agwụwo ya n’ihi ajọọ-omume ha; ma o anyepụrụ oche-ikpe ahụ, ma wekwasị ya onwe ya ikwusa okwu nke Chineke ụbọchị ya nile nke fọdụrụ, na kwa nwanne ya nwoke Lihaị, ụbọchị ya nile fọdụrụ;

5 N’ihi na ha chetara okwu nile nke nna ha Hilaman gwara ha. Ma ndị a bụ okwu ndị nke o kwuru:

6 Lee, ụmụ m nwoke, a chọrọ m ka unu cheta idebe iwu-nsọ nile nke Chineke, ma ọ ga-adị m mma ka unu kwupụtara ndị ahụ okwu ndị a. Lee, e nyewo m unu aha nile nke andị nne na nna mbụ anyị ndị sitere nʼala nke Jerusalem pụta; ma nke a ka m meworo ka ọ ga-abụ na mgbe unu chetara aha unu, unu ga-echeta ha; ma mgbe unu chetara ha, unu ga-echeta ọrụ ha nile; ma mgbe unu chetara ọrụ ha nile, unu ga-amata otu e siri kwuo, ma dee kwa, na ha bụ ndị dị bmma.

7 Ya mere, ụmụ m nwoke, ọ ga-adị m mma ka unu na-eme ihe-ọma, ka e wee kwuo maka unu, ma dee kwa, ọbụna dịka e sịworo kwuo ma dee maka ha.

8 Ma ugbua ụmụ m nwoke, lee, e nwere m ihe ụfọdụ ọzọ m na-achọ nʼaka unu, nke ihe ahụ m na-achọ bụ, ka unu ghara ime ihe ndị a ka unu wee na-etu ọnụ, kama ka unu mee ihe ndị a ịkpadolitere onwe unu aakụ nʼelu-igwe, e, nke dị ebighi-ebi, na nke na-anaghị an̄achapụ-an̄achapụ; e, ka unu nweta bonyinye oke-ọnụ-ahịa nke ndụ-ebighi-ebi ahụ, nke anyị nwere ihe kpatara anyị ji na-eche na enyewo ya ndị nna anyị ha.

9 O cheta, cheta, ụmụ m nwoke, aokwu nile nke eze Benjamịn gwara ndị ya; e, cheta na ọ dịghị ụzọ ọzọ ma-ọbụ otu mmadụ ga-esi nwee-nzọpụta, nanị site na bọbara-aja mgbaghara mmehie nke Jisus Kraịst, onye ga-abịa; e, cheta na ọ na-abịa cịgbapụta dụwa.

10 Ma cheta kwa aokwu nile nke Amiulek gwara Ziezrọm, nʼobodo-ukwu nke Amọnaịha; n’ihi na ọ gwara ya na Onye-nwe ga-abịa nʼezie ịgbapụta ndị ya, ma na ọ gaghị abịa ịgbapụta ha nʼime mmehie ha nile, kama ịgbapụta ha site na mmehie ha nile.

11 Ma o nwere ike e nyere ya site na Nna ahụ ịgbapụta ha site na mmehie ha nile n’ihi nchegharị; ya mere o azigawo ndị mụọ-ozi ya ikwusa ozi ọma nile ahụ nke ọnọdụ nile nke nchegharị, nke na-eweta ike nke Onye-mgbapụta, ruo na nzọpụta nke mkpụrụ-obi ha nile.

12 Ma ugbua, ụmụ m nwoke, cheta, cheta na ọ bụ nʼelu ankume nke Onye Mgbapụta anyị, onye bụ Kraịst, Ọkpara nke Chineke, ka unu ga-ewurịrị bntọ-ala unu; ka ọ ga-abụ mgbe ekwensu ga-ezipụ ikuku ike ya, e, akụ ya nile n’ime ifufe-gburu-gburu, e, mgbe uzu mmiri elu-igwe ya na cebili mmiri ike ya ga-apịakwasị unu, ọ gaghị enwe ike nʼarụ unu ịdọkpụda unu nʼọlụlụ nke nhuju-anya na ahụhụ agwụgh-agwụ, n’ihi nkume ahụ nʼelu nke e wuru unu, nke bụ ezigbo ntọ-ala, ntọ-ala nʼelu nke ọbụrụ na ndị mmadụ wuo ụlọ, ha agaghị ada.

13 Ma o wee ruo na ndị a bụ okwu nile nke Hilaman akuziiri ụmụ ya ndị nwoke; e, ọ kuziiri ha ọtụtụ ihe ndị ana-edeghị ede, na kwa ọtụtụ ihe ndị e dere ede.

14 Ma ha chetara okwu ya nile; ma ya mere ha gagharịrị, na-edebe iwu-nsọ nile nke Chineke, ikuzi okwu nke Chineke nʼetiti ndị nile nke Nifaị, malite nʼobodo-ukwu Uju;

15 Ma site nʼebe ahụ ruo nʼobodo-ukwu nke Gịd; ma site nʼobodo-ukwu nke Gịd ruo nʼobodo-ukwu nke Miulek;

16 Ma ọbụna site nʼotu obodo-ukwu ruo nʼọzọ, ruo mgbe ha gagharịworo nʼetiti ndị nke Nifaị nile ndị nọ nʼala dị na ndịda-ndịda; na site nʼebe ahụ baa nʼime ala nke Zarahemla, nʼetiti ndị Leman.

17 Ma o wee ruo na ha jiri nnukwu ike kwusaa ozi-ọma, nke mere na ha mechịrị ọnụ ọtụtụ andị nghọtahie ahụ ndị gafeworo site na ndị Nifaị, nke mere na ha bịaruru ma kwupụta mmehie ha nile ma e mere ha baptism baa nʼime nchegharị, ma otu mgbe ahụ ha laghachịkwuru ndị Nifaị ijisike imeziri ha ihe nile ha meluru.

18 Ma o wee ruo na Nifaị na Lihaị kwusaara ndị Leman ozi-ọma jiri nnukwu ike na ikike, n’ihi na ha nwere ike na ikike e nyere ha ka ha wee akwuo, ma ha nwekwara ihe ha ga-ekwu e nyere ha—

19 Ya mere ha kwuru okwu dị nnukwu ịtụ-nʼanya nke ndị Leman, ruo nʼime ka ha akwenye, nke mere na e nwere puku asatọ nke ndị Leman ndị nọ nʼala nke Zarahemla na gburu-gburu e mere baptism baa na nchegharị, ma ha kwenyere maka ajọọ-omume nke omenala nile nke ndị nna ha.

20 Ma o wee ruo na Nifaị na Lihaị gara nʼiru site nʼebe ahụ ịga nʼala nke Nifaị.

21 Ma o wee ruo na ndị-agha nke ndị Leman kpọrọ ha ma tụba ha nʼime aụlọ-mkpọrọ; e, ọbụna nʼime otu ụlọ-mkpọrọ ahụ nʼime nke ụmụ-oru nke Lịmhaị tụbara Amọn na ụmụnne ya nwoke.

22 Ma mgbe a tụbaworo ha nʼime ụlọ-mkpọrọ ọtụtụ ụbọchị nʼerịghị nri, lee, ha gabara nʼime ụlọ-mkpọrọ ịkpọrọ ha ka ha gbuo ha.

23 Ma o wee ruo na Nifaị na Lihaị a gbachibidoro ha gburu-gburu dịka site anʼọkụ, ọbụna nke mere na ha anwaghị anwa imetụ ha aka n’ihi ịtụ-egwu eleghị anya a ga-agba ha ọkụ. Otu o sila dị, Nifaị na Lihaị a gbaghị ha ọkụ; ma ha dịka ha na-eguzo nʼetiti ọkụ ma ọkụ ereghị ha.

24 Ma mgbe ha hụrụ na aogidi nke ọkụ gbachibidoro ha gburu-gburu, ma na o reghị ha, obi ha nile nwere mgbam-ume.

25 N’ihi na ha hụrụ na ndị Leman anwaghị-anwa imetụ ha aka; ọbụghị ma ha nwara anwa ịbịakwute ha nso, kama guzoro dịka akụrụ ha ogbu nʼoke ịtụnʼanya.

26 Ma o wee ruo na Nifaị na Lihaị guzoro ma malite ịgwa ha okwu, na-asị: Atụla egwu, n’ihi na lee, ọ bụ Chineke bụ onye gosịworo unu ihe ịtụnʼanya nke a, nʼime nke e gosịrị unu na unu enweghị ike imetụ anyị aka igbu anyị.

27 Ma lee, mgbe ha kwuworo okwu ndị a, ala mara jijiji karịa, ma mgbidi nile nke ụlọ-mkpọrọ ahụ mara jijiji dịka ha na-achọ ịtụgharị daa nʼala; mana lee, ha adaghị. Ma lee, ndị nke nọ nʼụlọ mkpọrọ bụ ndị Leman na ndị Nifaị bụ ndị nghọtahie.

28 Ma o wee ruo na igwe-ojii nke aọchịchịrị kpuchidere ha, ma ezigbo ụjọ dị egwu bịakwasịrị ha.

29 Ma o wee ruo na aolu bịara dịka ọ dị nʼelu igwe-ojii nke ọchịchịrị ahụ, na-asị: Chegharịa nụ, chegharịa nụ, ma achọkwala ọzọ ibibi ndị na-ejere m ozi ndị m zipụtaworo nye unu ikwupụta ozi nke ihe ọma.

30 Ma o wee ruo mgbe ha nụrụ olu nke a, ma hụ na ọbụghị olu nke egbe-elu-igwe, ọbụghị ma-ọbụ olu nke nnukwu mkpọtụ ọgba-aghara, kama lee, ọ bụ aolu dị nwayọ nke ọdị-nwayọ zuru-oke, dịka ọ bụ ntaka-ụka, ma ọ dụpuru ọbụna ruo nʼime mkpụrụ-obi—

31 Ma na-agbanyeghị ịdị-nwayọ nke olu ahụ, lee ala mara jijiji karịa, ma mgbidi nile nke ụlọ-mkpọrọ ahụ megharịkwara arụ ọzọ, dịka ọ chọrọ ịtụgharị daa nʼala; ma lee igwe-ojii nke ọchịchịrị, nke kpuchiteworo ha, agbasasịghị—

32 Ma lee olu ahụ bịara ọzọ, na-asị: Chegharịa nụ, chegharịa nụ, n’ihi na ala-eze nke elu-igwe dị nso; ma achọla ibibi ndị na-ejere m ozi ọzọ. Ma o wee ruo na ala mara jijiji ọzọ, ma mgbidi nile ahụ megharịrị arụ.

33 Ma ọzọ kwa nke ugboro atọ olu ahụ bịara, ma gwa ha okwu ịtụ-nʼanya nile nke mmadụ na-enweghị ike ikwu; ma mgbidi nile ahụ megharịrị arụ ọzọ, ma ala mara jijiji dịka ọ chọrọ ikewasị ekewasị.

34 Ma o wee ruo na ndị Leman enweghị ike ịgbafu n’ihi igwe-ojii nke ọchịchịrị ahụ nke kpuchidere ha; e, na kwa ha enweghị ike ịpụ n’ihi egwu nke bịakwasịrị ha.

35 Ugbua e nwere otu nʼetiti ha onye bụ onye nke ndị Nifaị site nʼọmụmụ, onye bụrụwororịị onye nke nzukọ-nsọ nke Chineke otu mgbe ma o nwewo nghọtahie site nʼebe ha nọ.

36 Ma o wee ruo na ọ tụgharịrị ya gburu-gburu, ma lee, o hụrụ site nʼigwe-ojii nke ọchịchịrị ahụ iru nke Nifaị na Lihaị; ma lee, ha nyere aìhè karịa, ọbụna dịka iru nke ndị mụọ-ozi. Ma o hụrụ na ha welitere anya ha nʼelu-igwe; ma ha nọ dịka ha na-ekwu okwu ma-ọbụ na-ewelite olu ha nye ihe dịka mmadụ onye ha na-ele.

37 Ma o wee ruo na nwoke a tikuru igwe-mmadụ ahụ, ka ha wee tụgharịa ma lee. Ma lee, e nwere ike e nyere ha nke mere na ha tụgharịrị ma lee; ma ha hụrụ iru nile nke Nifaị na Lihaị.

38 Ma ha sịrị nwoke ahụ: Lee, gịnị ka ihe nile ndị a pụtara, ma onye ka ọ bụ nke ya na ndị a na-akparịta ụka?

39 Ugbua aha nwoke ahụ bụ Amịnadab. Ma Amịnadab sịrị ha: Ha na-akparịta ụka ha na ndị mụọ-ozi nke Chineke.

40 Ma o wee ruo na ndị Leman sịrị ya: aGịnị ka anyị ga-eme, ka e wepụ igwe-ojii nke ọchịchịrị a site nʼikpuchite anyị?

41 Ma Amịnadab sịrị ha: Unu aga-echegharịrị, ma tikuo olu ahụ, ọbụna ruo mgbe unu ga-enwe bokwukwe nʼime Kraịst, onye a kuziiri unu maka ya site nʼaka Alma, na Amiulek, na Ziezrọm; ma mgbe unu ga-eme nke a, a ga ewepụ igwe-ojii nke ọchịchịrị ahụ site nʼikpuchide unu.

42 Ma o wee ruo na ha tikuru olu nke onye ahụ meworo ka ala maa jijiji; e, ha tiri ọbụna ruo mgbe e kposasịrị igwe-ojii nke ọchịchịrị ahụ.

43 Ma o wee ruo na mgbe ha legharịrị anya ha gburu-gburu, ma hụ na e kposasịrị igwe-ojii nke ọchịchịrị ahụ site nʼikpuchide ha, lee, ha hụrụ na a agbachibidoro ha gburu-gburu, e mkpụrụ-obi ọbụla, site nʼogidi nke ọkụ.

44 Ma Nifaị na Lihaị nọọrọ nʼetiti ha; e, a gbachibidoro ha gburu-gburu; e, ha dịka ha nọ nʼetiti ire ọkụ, ma na o merụghị ha arụ, ọbụghị na o rekwasịrị mgbidi nile nke ụlọ-mkpọrọ ahụ; ma ha jupụtara anʼọn̄ụ ahụ nke ọnụ na-apụghị ikwu ma jupụtara nʼotuto.

45 Ma lee, aMụọ Nsọ nke Chineke gbadatara site nʼelu-igwe, ma banye nʼime obi ha nile, ma e mejupụtara ha dịka e jiri ọkụ, ma ha nwere ike bkwupụta ọtụtụ okwu ịtụ-nʼanya.

46 Ma o wee ruo na olu bịakwutere ha, e, olu nwere mmasị, dịka ọ bụ ntaka-ụka, na-asị:

47 aUdo, udo dịrị unu, n’ihi okwukwe unu nʼime Onye m Huru-nʼanya Ezie, onye dị site na ntọ-ala nke ụwa.

48 Ma ugbua, mgbe ha nụrụ nke a ha leliri anya ha nile dịka nʼile ebe olu ahụ siri bịa; ma lee, ha hụrụ aelu-igwe ka o meghere; ma ndị mụọ-ozi gbadatara site nʼelu-igwe ma kwusaara ha ozi-ọma.

49 Ma ha dị ihe dịka narị mmadụ atọ ndị hụrụ ma nụ ihe ndị a; ma a gwara ha ka ha gaa nʼiru ma ghara ịtụ egwu, ọbụghị ma ha ga-enwe obi abụọ.

50 Ma o wee ruo na ha gara nʼiru, ma kwusaara ndị ahụ ozi-ọma, na-ekwupụta gazuo mpaghara ahụ nile gburu-gburu ihe nile nke ha nụworo ma hụ, nke mere na akụkụ ndị nke karịrị na ndị Leman, ha mere ka ha kwenye, n’ihi nnukwu ịgba-ama nile nke ha nataworo.

51 Ma ka ha ra bụ ndị e mere ka ha akwenye tọgbọrọ ngwa-ọgụ ha nile nke agha, na kwa ịkpọ-asị ha na omenala nke ndị nna ha.

52 Ma o wee ruo na ha nyepụrụ ndị Nifaị ala nile nke onwunwe ha.