Akwụkwọ nsọ
Hilaman 10


Isi 10

Onye-nwe wee nye Nifaị ike nrachị ahụ—E nyere ya ike ijikọta na itọpụ nʼelu ụwa na nʼelu-igwe—O nyere ndị ahụ iwu ichegharị ma-ọbụ laa nʼiyi—Mụọ ahụ wee buru ya site nʼigwe-mmadụ ruo nʼigwe-mmadụ. Ihe dịka nʼafọ 21 ruo 20 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma o wee ruo na nkewa malitere nʼetiti ndị ahụ, nke mere na ha kewara nʼebe a na nʼebe nke ọzọ ma gaa nʼụzọ ha nile, hapụ nanị Nifaị, dịka ọ na-eguzo nʼetiti ha.

2 Ma o wee ruo na Nifaị gara nʼụzọ ya chee iru nʼụlọ nke ya, ana-eche maka ihe ndị nke Onye-nwe gosịworo ya.

3 Ma o wee ruo dịka ọ nọ na-eche—ebe o nwere nnukwu mwute n’ihi ajọọ-omume nke ndị nke Nifaị, ọrụ nzuzo ha nile nke ọchịchịrị, na igbu-mmadụ ha nile, na ịpụnara ihe ha nile, na ụdị ajọọ-omume nile dị iche iche—ma o wee ruo dịka ọ na-eche otu a nʼime obi ya, lee, olu bịakwutere ya na-asị:

4 Ngọzi na-adịrị gị, Nifaị, n’ihi ihe ndị ahụ nke ị meworo; n’ihi na ahụwo m otu i siworo anʼenweghị ike-ọgwụgwụ kwupụtara ndị a okwu ahụ nke m nyeworo gị. Ma ị tụbeghị ha egwu, ma ị chọbeghị bndụ nke onwe gị, ma ịchọwo cọchịchọ m, na idebe iwu-nsọ m nile.

5 Ma ugbua, n’ihi na imewo nke a jiri enweghị ike-ọgwụgwụ dị otu a, lee, aga m agọzi gị ruo mgbe nile; ma aga m eme gị dike nʼokwu ma nʼomume, nʼokwukwe ma nʼọrụ nile; e, ọbụna na aihe nile a ga-emere gị ya dịka bokwu gị siri dị; n’ihi na ị cgaghị arịọ ihe ga-emegide ọchịchọ m.

6 Lee, ị bụ Nifaị, ma abụ m Chineke. Lee, ana m ekwupụtara gị ya nʼiru ndị mụọ-ozi m, na ị ga-enwe ike nʼebe ndị a nọ, ma ị ga-eji aụnwụ bụọ ala ahụ ọnụ, ma jiri ajọọ-ọrịa, na mbịbi, dịka ajọọ-omume nke ndị a siri dị.

7 Lee, ana m enye gị ike, na ihe ọbụla nke ị ga-arachị nʼụwa a aga-arachị ya nʼelu-igwe; ma ihe ọbụla nke ị ga-atọpụ nʼụwa a ga-atọpụ ya nʼelu-igwe; ma otu a ka ị ga-esi nwee ike nʼetiti ndị a.

8 Ma otu a, ọbụrụ na ị ga-agwa temple nke a, ọ ga-agbawa abụọ, ọ ga-eme.

9 Ma ọbụrụ na ị ga-agwa augwu ukwu a, Budata onwe gị ala ma dị larịị, ọ ga-eme.

10 Ma lee, ọbụrụ na i ga-asị na Chineke ga-eti ndị a otiti-ihe, ọ ga-emezu.

11 Ma ugbua lee, enye m gị iwu-nsọ, na ị ga eje ma kwupụtara ndị a, na otu a ka Onye-nwe Chineke kwuru, bụ Onye Pụrụ Ime Ihe nile: Ma ọbụghị na unu chegharịrị a ga-eti unu otiti-ihe, ọbụna ruo na ambibi.

12 Ma lee, ugbua o wee ruo na mgbe Onye-nwe gwaworo Nifaị okwu ndị a, ọ kwụsịrị ma ọ garughị nʼụlọ nke ya, kama ọ laghachịkwutere igwe-mmadụ ahụ ndị gbasasịrị nʼebe nile nʼelu iru nke ala ahụ, ma malite ikwupụtara ha okwu nke Onye-nwe nke o gwaworo ya, gbasara mbibi ha ma ọbụrụ na ha echegharịghị.

13 Ugbua lee, na-agbanyeghị nnukwu ọrụ-ebube ahụ nke Nifaị meworo nʼịgwa ha gbasara ọnwụ nke onye-isi-ikpe ahụ, ha ga-emesi obi ha ike ma ha an̄aghị-ntị nʼokwu nile nke Onye-nwe.

14 Ya mere Nifaị kwupụtaara ha okwu nke Onye-nwe, na-asị: Ma ọbụghị na unu chegharịrị, otu a ka Onye-nwe kwuru, a ga-eti unu otiti-ihe ọbụna ruo na mbibi.

15 Ma o wee ruo na mgbe Nifaị kwupụtawooro ha okwu ahụ, lee, ha ka mesiri obi ha ike ma ha achọghị ịn̄a-ntị nʼokwu ya nile; ya mere ha kwuru okwu ọjọọ megide ya, ma chọọ ijide ya ka ha wee kpọrọ ya ịtụba ya nʼụlọ-mkpọrọ.

16 Mana lee, ike nke Chineke nọnyeere ya, ma ha enweghị ike ịkpọrọ ya ịtụba ya nʼụlọ-mkpọrọ, n’ihi na Mụọ ahụ a kpọrọwo ya ma bupụ ya site nʼetiti ha.

17 Ma o wee ruo na otu a ka ọ gagharịrị nʼime Mụọ, site nʼigwe-mmadụ ruo nʼigwe-mmadụ, na-ekwupụta okwu nke Chineke, ọbụna ruo mgbe o kwupụtaworo ya nye ha nile, ma-ọbụ zipụga ya nʼetiti ndị ahụ nile.

18 Ma o wee ruo na ha achọghị ịn̄a-ntị nʼokwu ya nile; ma a malitere inwe ndọrọ-ndọrọ, nke mere na ha kewasịrị megide onwe ha ma malite igburịta onwe ha site na mma-agha.

19 Ma otu a ka afọ nke iri asaa na otu nke ọchịchị nke ndị-ikpe na-achị ndị nke Nifaị siri gwụchaa.