Akwụkwọ nsọ
Hilaman 12


Isi 12

Ndị mmadụ akwụsịghị ike ma dị nzuzu ma na-eme ihe ọjọọ ngwa-ngwa—Onye-nwe na-ata ndị ya ahụhụ—Abụghị ihe nke ndị mmadụ ka atụnyeere ike nke Chineke—Nʼụbọchị ikpe, ndị mmadụ ga-erita uru ndụ mgbe nile na-adigide ma-ọbụ ọmụma-ikpe mgbe nile na-adigide. Ihe dịka nʼafọ 6 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma otu a anyị ga-ahụ otu ụgha, na kwa akwụsịghị ike nke obi nile nke ụmụ nke mmadụ dị; e, anyị ga-ahụ na Onye-nwe na nnukwu ịdị mma enweghị oke ya na-agọzi ma na-enye ndị tinyere antụkwasị-obi ha na ya bime nke ọma.

2 E, ma anyị ga-ahụ nʼotu oge ahụ mgbe ọ ga-enye ndị ya ime nke ọma, e, na mmụba nke ubi ha nile, igwe-anụ ha na igwe-anumanu ha, na nʼọla-edo, na nʼọla-ọcha, na nʼụdị ihe oke-ọnụ ahịa nile nʼụdị ọbụla dị iche iche na nka; na-edebe ndụ ha, ma na-anapụta ha site nʼaka nile nke ndị iro ha; na-eme ka obi nile nke ndị iro ha dị nro ka ha ghara ikwupụta agha megide ha; e, ma na nke-nke, na-eme ihe nile maka ọdịmma na an̄ụrị nke ndị ya: e, mgbe ahụ bụ oge ha aga-emesi obi ha ike, ma chefuo Onye-nwe Chineke ha, ma bzọgide nʼokpuru-ụkwụ ha Onye-Nsọ ahụ—e, ma nke a n’ihi inwere-onwe ha, na nnukwu ime nke-ọma ha karịrị akarị.

3 Ma otu a anyị hụrụ na ma ọbụghị na Onye-nwe ana-ata ndị ya ahụhụ site nʼọtụtụ ntaram-ahụhụ, e, ma ọbụghị na ọ ji ọnwụ leta ha ma jiri oke iyi-egwu, ma jiri ụnwụ ma jiri ụdị ajọọ ọrịa nile dị iche iche, ha agaghị becheta ya.

4 O, lee otu nzuzu, na otu ihe-efu, na otu ihe-ọjọọ, na inwe mụọ-ọjọọ, na otu aime ajọọ-omume ngwa-ngwa, na otu ejighi ngwa-ngwa eme ihe ọma, nke ụmụ nke mmadụ dị; e, lee otu ịn̄a-ntị ngwa-ngwa nye okwu nile nke ajọọ-onye ahụ, na itinye bobi ha nʼihe efu nile nke ụwa dị!

5 E, lee otu ịdị-na-njikere ibuli onwe elu na ampako dị; e, lee otu ịdị-na-njikere itu-ọnụ dị, ma mee ụdị ajọọ-omume nile dị iche iche, ma lee otu igbu-oge nʼicheta Onye-nwe Chineke ha dị, na in̄a-ntị na ndụmọdụ ya nile, e, lee otu igbu-oge bnʼiga ije nʼụzọ nile nke amamihe dị!

6 Lee, ha achọghị ka Onye-nwe Chineke ha, onye akeworo ha, bna-atụ ma na-achị ha; na-agbanyeghị nnukwu ịdị mma ya na ebere ya nʼebe ha nọ, ha na-agụ nʼihe-efu ndụmọdụ ya nile, ma ha agaghị ekwe ka ọ bụrụ onye-ndu ha.

7 O lee otu nnukwu aabụghị-ihe nke ụmụ nke mmadụ dị; e, ọbụna na ha dị nta karịa uzuzu nke ala.

8 N’ihi na lee, uzuzu nke ala na-agagharị nʼebe a na nʼebe nke ọzọ, ruo nʼikewa iche iche, nʼiwu nke nnukwu na Chineke mgbe nile na-adigide anyị.

9 E, lee nʼolu-okwu ya ka ugwu-nta nile na ugwu-ukwu nile mara ririri ma amaa jijiji.

10 Ma site anʼike nke olu-okwu ya ha gbasasịrị, ma dị larịị, e, ọbụna dịka ndagwurugwu.

11 E, site nʼike nke olu-okwu ya ka aụwa dum na-akwagharị;

12 E, site nʼike nke olu-okwu ya, ka ntọ-ala nile na-ama jijiji, ọbụna ruo nʼebe etiti ya.

13 E, ma ọbụrụ na ọ sị ụwa—Pụọ—ọ pụọ.

14 E, ọbụrụ na ọ sị aụwa—I bga-alaghachị azụ, ka o cgbatịpụ ụbọchị ahụ ruo ọtụtụ oge-awa—ọ ga-eme;

15 Ma otu a, dịka okwu ya siri dị ụwa ga-alaghachị azụ, ma ọ ga-adị mmadụ ka anyanwụ o guzoro nʼotu ebe; e, ma lee, nke a dị otu a; n’ihi na nʼezi-okwu ọ bụ ụwa na-aga ma ọbụghị anyanwụ.

16 Ma lee, ọzọ ọbụrụ na ọ sị ammiri nile nke nnukwu ogbu—bTachapụ—ọ ga-eme.

17 Lee, ọbụrụ na ọ sị ugwu-ukwu a—Ka ebulie gị elu, ma abịafeta ma dakwasị obodo-ukwu ahụ, ka e wee lie ya—lee ọ ga-eme.

18 Ma lee, ọbụrụ na mmadụ aezolite akụ nʼime ala, ma Onye-nwe ga-asị—Ka a bbụọ ya ọnụ, n’ihi ajọọ-omume nke onye ahụ zoliteworo ya—lee, a ga-abụ ya ọnụ.

19 Ma ọbụrụ na Onye-nwe ga-asị—Ka a bụọ gị ọnụ, nke mere na ọdịghị onye ga-achọta gị site nʼoge nke a gaa nʼiru ma ruo mgbe nile—lee, ọdịghị onye ga-enweta ya site ugbua gaa nʼiru ma ruo mgbe nile.

20 Ma lee, ọbụrụ na Onye-nwe ga-asị mmadụ—N’ihi ajọọ-omume gị nile, a ga-abụ gị ọnụ ruo mgbe nile—ọ ga-eme.

21 Ma ọbụrụ na Onye-nwe ga-asị—N’ihi ajọọ-omume gị nile a ga-ebepụ gị site nʼebe m nọ—ọ ga-emee ka ọ dị otu ahụ.

22 Ma ahụhụ na-adịrị ya bụ onye ọ ga-asi nke a, n’ihi na ọ ga-adịrị ya bụ onye ga-eme ajọọ-omume, ma agaghị enwe ike ịzọpụta ya; ya mere, n’ihi nke a, ka e wee zọpụta ndị mmadụ, ka e jiri kwupụta nchegharị.

23 Ya mere, ngọzi na-adịrị ha bụ ndị ga-echegharị ma n̄aa-ntị nʼolu-okwu nke Onye-nwe Chineke ha; n’ihi ndị a bụ ndị ahụ a aga-azọpụta.

24 Ma ka Chineke kwere, na nnukwu uju ya, na a ga-akpọta ndị mmadụ ruo nchegharị na ọrụ ọma nile, ka e wee weghachitara ha amara maka aamara, dịka ọrụ ha nile siri dị.

25 Ma ọ dị m ka a sị na a ga-azọpụta mmadụ nile. Mana anyị gụtara na na nnukwu na ụbọchị ikpe azụ e nwere ndị a ga-achụpụ, e, ndị a ga-achụpụ site nʼiru nke Onye-nwe;

26 E, ndị a ga-enyefe nʼọnọdụ nke nhuju-anya agwụgh-agwụ, na-mmejupụta okwu nile nke sịrị: Ndị nile ahụ meworo ihe ọma ga-enwe andụ mgbe nile na-adigide; ma ndị nile ahụ meworo ihe ọjọọ ga-enwe bọmụma-ikpe mgbe nile na-adigide. Ma otu a ka ọ dị. Amen.