Akwụkwọ nsọ
Hilaman 15


Isi 15

Onye-nwe tara ndị Nifaị ahụhụ n’ihi na ọ hụrụ ha nʼanya—ndị Leman agbanwere kwụsịrị ike ma nọsie ike nʼokwukwe ahụ—Onye-nwe ga-emere ndị Leman ebere nʼụbọchị ndị ikpe-azụ. Ihe dịka nʼafọ 6 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua, ụmụnne m nwoke m hụrụ nʼanya, lee, ana m ekwupụtara unu na ma ọbụghị na unu ga-echegharị, a ga-ahapụrụ unu ụlọ unu nile i atọgbọrọ nʼefu.

2 E, ma ọbụghị na unu chegharịrị, ndị nwunye unu ga-enwe nnukwu ihe ga-akpatara ha iru uju nʼụbọchị nke ha ga-enye ara; n’ihi na unu ga-anwa ịgbapụ ma agaghị enwe ebe mgbaba; e, ma ahụhụ ga-adịrị ndị ajị nwa, n’ihi na ha ga-adị arọ ma ha agaghị enwe ike ịgbapụ; ya mere, a ga-azọda ha ma a ga-ahapụ ha ka ha laa nʼiyi.

3 E, ahụhụ na-adịrị ndị a, ndị a na-akpọ ndị nke Nifaị ma ọbụghị na ha ga-echegharị, mgbe ha ga-ahụ ihe iriba-ama nile ndị a na ihe-ebube nile nke a ga-egosị ha; n’ihi na lee, ha abụrụwọrịị ndị a họtara nke Onye-nwe; e, ndị nke Nifaị ka ọ hụworo nʼanya, na kwa na o nyewo ha annukwu ahụhụ; e, nʼụbọchị nile nke ajọọ-omume ha nile ka o nyeworo ha nnukwu ahụhụ n’ihi na ọ hụrụ ha nʼanya.

4 Mana lee ụmụnne m nwoke, ndị Leman ka ọ kpọworo asị n’ihi ihe nile ha meworo bu ajọọ-omume esepụghị-aka, ma nke a n’ihi ajọọ-omume nke aomenala nke ndị nna ha. Mana lee, nzọpụta abịaworo ha site na nkwusa ozi-ọma nke ndị Nifaị; ma n’ihi nzube nke a ka Onye-nwe bgbatịworo ụbọchị ha nile.

5 Ma ọ dị m ka asị na unu ga-ahụ na aakụkụ nke karịrị nʼime ha nọ nʼụzọ nke ọrụ ha, ma ha na-aga nʼihi-aka-nʼanya nʼiru Chineke, ma ha na-eleru-anya nʼidebe iwu-nsọ ya nile na usoro-iwu ya nile na mkpebi ya nile dịka iwu nke Moses siri dị.

6 E, asị m unu, na akụkụ nke karịrị nʼime ha na-eme nke a, ma ha na agbalị jiri ịrụsi-ọrụ ike nʼenweghị ike-ọgwụgwụ ka ha wee kpọta ụmụnne ha nwoke ndị fọdụrụ nʼọmụma nke ezi-okwu ahụ; ya mere e nwere ọtụtụ ndị na-agbakọnye nʼọnụ-ọgụgụ ha kwa ụbọchị.

7 Ma lee, unu matara nʼonwe unu, n’ihi na unu ahụwo ya, na ka ha ra bụ ndị nʼime ha ewetaworo nʼọmụma nke ezi-okwu ahụ, na nʼịmata maka ajọọ na ịrụ-arụ nke omenala nile nke ndị nna ha, ma e dubara nʼikwenye na akwụkwọ-nsọ nile ahụ, e, amụma nile nke ndị-amụma dị nsọ, ndị nke e dere ede, nke na-eduga ha nʼokwukwe nʼOnye-nwe, ma ruo na nchegharị, bụ okwukwe na nchegharị nke na-eweta amgbanwe nke obi nye ha—

8 Ya mere, ka ha ra bụ ndị bịaworo na nke a, unu matara nʼonwe unu na ha akwụsịrị ike ma guzogidesie ike nʼokwukwe ahụ, na nʼime ihe ahụ e jiworo mee ka ha nwere onwe ha.

9 Ma unu matakwara na ha aeliwo ngwa-ọgụ ha nile nke agha nʼala, ma ha na-atụ egwu iwelite ha eleghị-anya site nʼụzọ ọbụla ha ga-eme mmehie; e, unu ga-ahụ na ha na-atụ egwu ime mmehie—n’ihi na lee ha ga-ahapụ onwe ha ka a zọda ha nʼala na ka ndị iro ha gbuo ha, ma ha agaghị ewelite mma-agha ha nile megide ha, ma nke a n’ihi okwukwe ha na Kraịst.

10 Ma ugbua, n’ihi ịkwụsike ha mgbe ha kwere nʼihe ahụ nke ha kwere, n’ihi na n’ihi igụzosike ha mgbe ọbụla a gbaara ha ama, lee, Onye-nwe ga-agọzi ha ma gbatịa ụbọchị ha nile ogologo, na-agbanyeghị ajọọ-omume ha—

11 E, ọbụna ma ọbụrụ na ha ga-ala azụ nʼekweghị ekwe Onye-nwe aga-agbatị ụbọchị ha nile ogologo, ruo mgbe oge ahụ ga-abịa nke e kwuworo maka ya site nʼọnụ ndị nna anyị, na kwa site nʼọnụ onye-amụma bZinọs, na ọtụtụ ndị-amụma ọzọ, gbasara ciwetaghachị ụmụnne anyị nwoke, ndị Leman, ọzọ nʼọmụma nke ezi-okwu ahụ—

12 E, asị m unu, na nʼoge ndị ikpe-azụ ankwa nile nke Onye-nwe ka esetịpụworo nye ụmụnne anyị nwoke, ndị Leman; ma na-agbanyeghị ọtụtụ mkpagbu nile ndị ahụ nke ha ga-enwe, ma na-agbanyeghị a bga-akwagharị ha ma nʼiru ma nʼazu nʼiru nke elu ụwa, ma a chụọ ha nta, ma a ga-enye ha otiti ihe ma chụsasịa ha na mba nile, na-enweghị ebe mgbaba, Onye-nwe ga-emere ha cebere.

13 Ma nke a bụ dịka amụma ahụ, na a aga-akpọta kwa ha ọzọ nʼezi ọmụma-ihe, nke bụ ọmụma nke Onye-mgbapụta ha, na nnukwu na ezi bonye-ọzụzụ-atụrụ ha, ma agụnye ha nʼetiti atụrụ ya.

14 Ya mere asị m unu, ọ aga-akara ha mma karịa unu ma ọbụghị na unu chegharịrị.

15 N’ihi na lee, aegosịrị ha ọrụ nile ahụ dị ukwuu nke egosịworo unu, e, nye ha bụ ndị laworo azụ nʼekweghị-ekwe n’ihi omenala nile nke ndị nna ha, unu nwere ike ịhụ nʼonwe unu na ha agaghị ala kwa azụ ọzọ mgbe ọbụla nʼekweghị-ekwe.

16 Ya mere, ka Onye-nwe kwuru: Agaghị m ebibi ha kpam-kpam, mana a ga m eme ka nʼụbọchị nke amamihe m ha ga-alaghachịkwute m ọzọ, ka Onye-nwe kwuru.

17 Ma ugbua lee, ka Onye-nwe kwuru, gbasara ndị nke ndị Nifaị ahụ: O bụrụ na ha agaghị echegharị, ma leruo-anya na-eme ihe m chọrọ, aga m aebibi ha kpam-kpam, ka Onye-nwe kwuru, n’ihi ekweghị-ekwe ha na-agbanyeghị ọtụtụ ọrụ dị ukwuu ndị nke m rụworo nʼetiti ha; ma dịka Onye-nwe na-adị ndụ nʼezie ihe ndị a ga-adị, ka Onye-nwe kwuru.