Akwụkwọ nsọ
Hilaman 3


Isi 3

Ọtụtụ ndị Nifaị pụrụ obi gaa nʼala dị nʼelu-elu—Ha wuru ọtụtụ ụlọ simentị ma debe ọtụtụ akụkọ-ndekọta—Iri nile nke puku nile ka a gbanwere ma mee ha baptism—Okwu nke Chineke na-eduba ndị mmadụ na nzọpụta—Nifaị nwa-nwoke nke Hilaman nochiri oche-ikpe ahụ. Ihe dịka nʼafọ 49 ruo 39 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo nʼafọ nke iri anọ na atọ nke ọchịchị nke ndị-ikpe, enweghị ndọrọ-ndọrọ dị nʼetiti ndị nke Nifaị ma ọbụghị ntakịrị mpako nke dị na nzukọ-nsọ ahụ, nke butere ụfọdụ ntakịrị nghọtahie nʼetiti ndị ahụ, bụ ihe ndị e doziri na ngwụcha nke afọ nke iri anọ na atọ.

2 Ma enweghị ndọrọ-ndọrọ dị nʼetiti ndị ahụ nʼafọ nke iri anọ na anọ; ọbụghị ma enwere ndọrọ-ndọrọ nʼafọ nke iri anọ na ise.

3 Ma o wee ruo na nke iri anọ na isii, e, enwere nnukwu ndọrọ-ndọrọ na ọtụtụ nghọtahie; nʼime nke e nwere ọtụtụ nnukwu ndị karịrị-akarị ndị pụrụ site nʼala nke Zarahemla, ma gawa nʼala dị anʼelu-elu inweta ala ahụ.

4 Ma ha gara njem ruo nnukwu ebe tere anya karịa, nke mere na ha bịara na ọtụtụ annukwu ọdọ mmiri na ọtụtụ osimiri.

5 E, ma ọbụna ha gbasara nʼime akụkụ nile nke ala ahụ, nʼime akụkụ nile ọbụla a na-emebeghi ka ọ tọgbọrọ nʼefu na nʼenweghị osisi eji ewu ụlọ, n’ihi ọtụtụ ndị obibi ndị birila nʼala ahụ mbụ.

6 Ma ugbua ọdịghị akụkụ ala ahụ tọgbọrọ nʼefu, ma ọbụghị ma-ọbụ maka osisi eji ewu ụlọ; mana n’ihi nnukwu nke ambibi nke ndị ahụ biworo nʼala ahụ mbụ dị a kpọrọ ya bọtọgbọrọ-nʼefu.

7 Ma ebe e nwere nanị ntakịrị osisi eji ewu ụlọ nʼelu iru nke ala ahụ, otu o sila dị ndị ahụ gara, ghọrọ ndị ọka-ibe karịa nʼiru ọrụ nke simentị, ya mere ha wuru ụlọ simentị, nʼime nke ha biiri.

8 Ma o wee ruo na ha mụbara ma gbasaa, ma ha gapụrụ site nʼala dị na ndịda-ndịda ruo nʼala dị nʼelu-elu, ma gbasaa ruo na ha malitere ikpuchi nʼelu iru nke ala ahụ nile, site nʼoke osimiri dị na ndịda-ndịda ruo nʼoke osimiri dị nʼelu-elu, site nʼoke osimiri dị anʼọdịda-anyanwụ ruo nʼoke osimiri dị nʼọwụwa-anyanwụ.

9 Ma ndị ahụ nọ nʼala dị nʼelu-elu biiri nʼụlọ-ịkwuu, na nʼụlọ ndị e jiri simentị wuo, ma ha hapụrụ osisi ọbụla nke pupụtara nʼelu iru nke ala ahụ ka ọ na-etolite, otu ọ ga-abụ nʼoge na-abịa ha ga-enwe osisi-iwu-ụlọ iji wuo ụlọ ha, e, obodo-ukwu ha nile na temple ha nile, na ụlọ-nzukọ ha nile, na ebe mgbaba-dị-nsọ ha nile, na ụdị ụlọ ha ọbụla nile dị iche iche.

10 Ma o wee ruo dịka osisi iwu-ụlọ ha dịịrị ụkọ karịa nʼala dị nʼelu-elu, ha zipụrụ nnukwu site nʼụzọ aụgbọ mmiri.

11 Ma otu a ha mere ka ndị bi nʼala dị nʼelu-elu nwe ike iwu ọtụtụ obodo-ukwu, ma nke osisi ma nke simentị.

12 Ma o wee ruo na e nwere ọtụtụ nke andị nke Amọn, ndị bụ ndị Leman site nʼọmụmụ, ndị garukwara nʼala nke a.

13 Ma ugbua e nwere ọtụtụ akụkọ-ndekọta e debere maka ka o-siri-gaa nile nke ndị a, site nʼaka ọtụtụ ndị a, nke na-akọ otu ihe ahụ ma buru ezigbo ibu, gbasara ha.

14 Mana lee, otu ụzọ nʼime narị nke ka o-sịrị-gaa nke ndị a, e, nkọwasị nke ndị Leman na nke ndị Nifaị, na agha ha nile, na ndọrọ-ndọrọ nile, na nghọtahie nile, na ikwusa ozi-ọma ha, na ibu-amụma ha nile, na iji ụgbọ-mmiri bupu ihe ha na iwu ụgbọ-mmiri ha nile, na iwu atemple ha, na nke ụlọ-nzukọ ha nile na ebe mgbaba-dị-nsọ ha nile, na ezi-omume ha, na ajọọ-omume ha nile, na igbu-mmadụ ha nile, na izu-ori, ịpụnara-ihe, na ụdị ihe arụ nile ọbụla dị iche iche na akwụnakwuna ha nile, agaghị abanye nʼọrụ nke a.

15 Mana lee, e nwere ọtụtụ akwụkwọ na ọtụtụ akụkọ-ndekọta nʼụdị ọbụla, ma ndị Nifaị bụ ndị debeworo ha karịa.

16 Ma ndị Nifaị aenyedatawo ha site nʼotu ọgbọ ruo nʼọzọ, ọbụna ruo na ha adabawo nʼime njehie ma e gbuwo ha, pụnara ha ihe, ma chụọ ha nta, ma chụgharịa ha, ma gbuo ha, ma chụsasịa ha nʼelu iru nke ala ahụ, ma gwakọta ha na ndị Leman ruo na banaghị akpọ kwa ha ndị Nifaị, bụrụzie ndị ajọọ-omume, na ndị a na-azụghị-azụ, ma dị egwu, e, ọbụna bụrụzie ndị Leman.

17 Ma ugbua alaghachị m na nkọwasị nke m; ya mere, ihe m kwuworo agafewọrịị mgbe e nweworo nnukwu ndọrọ-ndọrọ nile, na nsogbu nile, na agha nile, na nghọtahie nile, nʼetiti ndị nke Nifaị.

18 Afọ nke iri anọ na isii nke ọchịchị nke ndị-ikpe gwụchara;

19 Ma o wee ruo na a ka nwere nnukwu ndọrọ-ndọrọ nʼala ahụ, e, ọbụna nʼafọ nke iri anọ na asaa, na kwa nʼafọ nke iri anọ na asatọ.

20 Otu o sila dị Hilaman nochiri oche-ikpe ahụ jiri ikpe zịrị-ezi na ịha-nʼotu; e, o leziri anya idebe usoro-iwu nile, na ikpe nile, na iwu-nsọ nile nke Chineke; ma o mere ihe ahụ nke dị mma nʼanya nke Chineke esepụghị-aka; ma ọ gara nʼụzọ nile nke nna ya, nke mere na o mere nke ọma nʼala ahụ.

21 Ma o wee ruo na o nwere ụmụ-nwoke abụọ. O nyere nke okenye aha nke aNifaị, na nke kachasị nwata, aha nke bLihaị. Ma ha malitere itolitere Onye-nwe.

22 Ma o wee ruo na agha nile ahụ na ndọrọ-ndọrọ nile malitere ibelata, ntakịrị ntakịrị, nʼetiti ndị nke ndị Nifaị, nʼoge ngwụcha nke afọ nke iri anọ na asatọ nke ọchịchị nke ndị-ikpe nile na-achị ndị nke Nifaị.

23 Ma o wee ruo nʼafọ nke iri anọ na iteghete nke ọchịchị nke ndị-ikpe, e nwere udo esepụghị-aka e hiwere nʼala ahụ, ha nile ma ọbụghị ntụgwa ihe arụ nzụzọ nile nke aGadiantọn onye ori hiweworo nʼakụkụ ndị nke nọziworo anọzi nke ala ahụ, ndị nke nʼoge ahụ ndị nọ nʼisi ọchịchị amaghị ha; ya mere ebibipụghị ha site nʼala ahụ.

24 Ma o wee ruo na nʼime otu afọ ahụ e nwere nnukwu ime nke ọma karịa nʼime nzukọ-nsọ ahụ, nke mere na e nwere ọtụtụ puku ndị sonyere onwe ha na nzukọ-nsọ ahụ ma e mere ha baptism baa nʼime nchegharị.

25 Ma oke nnukwu ka ime nke ọma nke nzukọ-nsọ ahụ dịịrị, ma oke ọtụtụ ka ngọzi nile dịịrị nke a wụkwasịrị ndị ahụ, na ọbụna ndị isi nchụ-aja na ndị nkuzi nile nʼonwe ha ọ tụrụ ha nʼanya nke na-enweghị atụ.

26 Ma o wee ruo na ọrụ nke Onye-nwe mere nke ọma ruo nʼime baptism na iweta ịdị nʼotu nye nzukọ-nsọ nke Chineke, ọtụtụ mkpụrụ-obi, e, ọbụna iri nile nke puku nile.

27 Otu a anyị ga-ahụ na Onye-nwe na-eme ebere nye ndị nile chọrọ, jiri ezigbo obi ha nile, kpọkụo aha nsọ ya.

28 E, otu a anyị hụrụ na aọnụ-ụzọ nke elu-igwe ghere oghe nye bmmadụ nile, ọbụna nye ndị nke ga-ekwere nʼaha nke Jisus Kraịst, onye bụ Ọkpara nke Chineke.

29 E, anyị hụrụ na onye ọbụla chọrọ, nwere ike ijide aokwu nke Chineke, nke bdị ndụ na ike, nke ga-ekewasị iche-iche aghụghọ ahụ nile na ọnya nile na atụmatụ-aghụghọ nile nke ekwensu ahụ, ma duo onye nke Kraịst nʼụzọ dị cwara-wara ma dị kwa mkpafa gafee dọlụlụ nke ịhụjụ anya mgbe nile na-adigide nke a kwadoro ka o lomie ndị ajọọ-omume—

30 Ma wedaruo mkpụrụ-obi ha nile, e, mkpụrụ-obi ha na-adịghị anwụ-anwụ, anʼaka nri nke Chineke nʼala-eze nke elu-igwe, ịnọdụ ọdụ ha na Abraham, na Aịsak, na ha na Jekọb, na ha na ndị nna nsọ anyị nile, ghara ịpụ kwa ọzọ.

31 Ma nʼime afọ nke a e nwere in̄ụrị ọn̄ụ esepụghị-aka nʼala nke Zarahemla, na mpaghara nile gburu gburu ahụ, ọbụna nʼala nile nke ndị Nifaị nwetara.

32 Ma o wee ruo na e nwere udo na nnukwu ọn̄ụ karịrị akarị n’ime nke fọdụrụ nʼafọ nke iri anọ na iteghete; e, na kwa e nwere udo esepụghị-aka na nnukwu ọn̄ụ nʼafọ nke iri ise nke ọchịchị nke ndị-ikpe.

33 Ma nʼafọ nke iri ise na otu nke ọchịchị nke ndị-ikpe e nwekwara udo, ma ọbụghị mpako ahụ nke malitere ịbanye nʼime nzukọ-nsọ ahụ—ọbụghị nʼime nzukọ-nsọ nke Chineke, kama nʼime obi nile nke ndị ahụ na-ekwupụta na ha bụ nke nzukọ-nsọ nke Chineke—

34 Ma ha buliri onwe ha elu na ampako, ọbụna ruo na nsogbu nke ọtụtụ nke ụmụnne ha nwoke. Ugbua nke a bụ nnukwu ajọọ ihe, nke mere ka akụkụ nke ndị kara dị umeala taa ahụhụ nnukwu nsogbu nile, ma wafere nnukwu mkpagbu.

35 Otu o sila dị ha aburu ọnụ ma bkpee ekpere ugboro ugboro, ma gbasie ike nʼelu mgbasike cnʼumeala ha, na nkwụsike nʼelu nkwụsike nʼokwukwe nke Kraịst ahụ, ruo nʼimejupụta mkpụrụ-obi ha nile nʼọn̄ụ na nkasiobi, e, ọbụna ruo dnʼịsachasị na eido-nsọ nke obi ha nile, bụ ido-nsọ nke bịaworo n’ihi fnkwenye obi ha nile na Chineke.

36 Ma o wee ruo na afọ nke iri ise na abụọ gwụchara nʼudo, ma ọbụghị na nnukwu mpako karịrị akarị nke baworo nʼime obi nke ndị ahụ; ma ọ bụụrụ n’ihi nnukwu aakụ na ụba karịrị akarị na ime nke ọma ha nʼala ahụ; ma o toro nʼime ha site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị.

37 Ma o wee ruo nʼafọ nke iri ise na atọ nke ọchịchị nke ndị ikpe, Hilaman nwụrụ, ma ọkpara ya Nifaị malitere ịchị nʼọnọdụ ya. Ma o wee ruo na ọ nochiri oche-ikpe ahụ jiri ikpe-ziri-ezi na ịha nʼotu; e, o debere iwu-nsọ nile nke Chineke, ma gaa nʼụzọ nile nke nna ya.