Akwụkwọ nsọ
Hilaman 14


Isi 14

Samuel wee buo-amụma ìhè nʼoge abalị na otu kpakpando ọhụrụ nʼoge ọmụmụ Kraịst—Kraịst wee gbapụta mmadụ site nʼọnwụ nke arụ na nke mụọ—Ihe iriba-ama nile nke ọnwụ ya tinyere ụbọchị atọ nke ọchịchịrị, nkewa nke nkume nile, na nnukwu nsogbu nile nke ụdị-okike. Ihe dịka nʼafọ 6 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo na aSamuel, Onye Leman, buru amụma ọtụtụ nnukwu ihe ndị ọzọ ndị agaghị enwe ike ide.

2 Ma lee, ọ sịrị ha: Lee, ana m enye unu ihe ịrịba-ama; n’ihi na afọ ise ọzọ na-abịa, ma lee, mgbe ahụ Ọkpara nke Chineke ga-abịa ịgbapụta ndị nile ga-ekwere nʼaha ya.

3 Ma lee, nke a ka m ga-enye unu maka aihe ịrịba-ama nʼoge nke ọbịbịa ya; n’ihi na lee, a ga-enwe nnukwu ìhè nʼelu-igwe, nke ga-eme na nʼabalị ahụ tutu ọ bịa agaghị enwe ọchịchịrị, nke mere na ọ ga-adị mmadụ ka ọ bụ nʼehihie.

4 Ya mere, a ga-enwe otu ehihie na otu abalị na otu ehihie, dịka ọ bụ otu ụbọchị ma enweghị abalị; ma nke a ga-adịrị unu nʼihe iriba-ama; n’ihi na unu ga-amata maka ọwụwa nke anyanwụ na kwa maka ọdịda ya; ya mere ha ga-amata nʼezi-okwu na a ga-enwe ehihie abụọ na otu abalị; otu o sila dị abalị ahụ agaghị agba ọchịchịrị; ma ọ ga-abụ abalị tutu a amụọ ya.

5 Ma lee, a ga-enwe akpakpando ọhụrụ ga-awapụta, ụdị nke unu na-ahụtụbeghị mbụ; ma nke a ga-abụ kwa ihe iriba-ama nye unu.

6 Ma lee nke a abụghị ihe nile, a ga-enwe ọtụtụ ihe iriba-ama na ihe-ebube nʼelu-igwe.

7 Ma ọ ga-eru na ọ ga-atụ unu nile nʼanya, na ịdị ebube, nke ga-eme ka unu adaa nʼala.

8 Ma ọ ga-eru na onye ọbụla aga-ekwere nʼỌkpara nke Chineke, onye ahụ ga-enwe ndụ mgbe nile na-adigide.

9 Ma lee, otu a ka Onye-nwe nyeworo m nʼịwu, site nʼọnụ mụọ-ozi ya, ka m bịa gwa unu ihe nke a; e, o nyewo iwu na m ga-eburu unu amụma ihe ndị a; e, ọ sịwo m: Bekuo ndị a, chegharịa ma kwadobe ụzọ nke Onye-nwe.

10 Ma ugbua, n’ihi na abụ m onye Leman, ma agwawo m unu okwu nile nke Onye-nwe nyeworo m nʼiwu, ma n’ihi na o siri ike megide unu, unu na-ewere m iwe, ma achụpụ m site nʼetiti unu.

11 Ma unu ga-anụ okwu m nile, n’ihi na maka ebum-nʼobi a ka m bịaliteworo nʼelu mgbidi nile nke obodo-ukwu a, ka unu wee nụrụ ma mata maka ikpe nile nke Chineke nke na-eche unu n’ihi ajọọ-omume unu nile, na kwa ka unu wee mata ọnọdụ nile nke nchegharị;

12 Na kwa ka unu wee mata maka ọbịbịa nke Jisus Kraịst, Ọkpara nke Chineke, aNna nke elu-igwe na ụwa, Onye-okike nke ihe nile site na mmalite; na ka unu wee mata maka ihe iriba-ama nile nke ọbịbịa ya, nʼebum-nʼobi na unu ga-ekwere nʼaha ya.

13 Ma ọbụrụ na unu akwere nʼaha ya, unu ga-echegharị site na mmehie unu nile, na site na ya unu ga-enwe nsachapụ ha site nʼihe ọ brụrụ.

14 Ma lee, ọzọ, ihe iriba-ama ọzọ ka m na-enye unu, e, ihe ịrịba-ama nke ọnwụ ya.

15 N’ihi na lee, ọ ga-anwụrịrị ka anzọpụta wee bịa; e, ọ masịrị ya ma dị mkpa na ọ ga-anwụ, iweta na mmezu bmbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, na site na ya a ga-akpọbata ndị mmadụ nʼiru nke Onye-nwe.

16 E, lee, ọnwụ a na-eweta mbilite nʼọnwụ ahụ, ma ana-agbapụta mmadụ nile site nʼọnwụ nke mbụ—ọnwụ nke mụọ ahụ; maka ụmụ mmadụ nile, site bnʼọdịda nke Adam, ebe e cbepụrụ ha site nʼebe Onye-nwe nọ, e weere ha ka ndị dnwụrụ-anwụ, ma nʼihe nile nke arụ na nʼihe nile nke mụọ.

17 Mana lee, mbilite nʼọnwụ nke Kraịst ana-agbapụta ụmụ mmadụ, e, ọbụna ụmụ mmadụ nile, ma na-akpọtaghachị ha nʼiru nke Onye-nwe.

18 E, ma ọ na-eweta ọnọdụ nke nchegharị, nke mere na onye ọbụla chegharịrị onye ahụ a gaghị egbutu ya ma tụba ya nʼime ọkụ; mana onye ọbụla nke na-echegharịghị a ga-egbutu ya ma tụba ya nʼime ọkụ; ma ọzọ ọnwụ nke mụọ na-abịakwasị ha, e, ọnwụ nke ugboro abụọ, n’ihi na a ga-ebepụ ha ọzọ nʼihe nile gbasara ezi-omume.

19 Ya mere chegharịa nụ, chegharịa nụ, eleghị anya site nʼịmata ihe ndị a na adịghị eme ha, unu ga-ahapụ onwe unu ịbịa nʼokpuru amam-ikpe, ma ewebata unu rute nʼọnwụ nke ugboro abụọ nke a.

20 Mana lee, dịka m gwara unu gbasara aihe iriba-ama ọzọ, ihe ịrịba-ama nke ọnwụ ya, lee, nʼụbọchị ahụ nke ọ ga-ata ahụhụ ọnwụ anyanwụ bga-agbaji ojii ma jụ inye unu ìhè ya; na kwa ọnwa na kpakpando nile; ma agaghị enwe ìhè nʼelu iru nke ala nke a, ọbụna site nʼoge nke ọ ga-ata ahụhụ ọnwụ, nʼohere dị mkpụrụ cụbọchị atọ, ruo nʼoge nke ọ ga-ebilite ọzọ site na ndị nwụrụ anwụ.

21 E, nʼoge nke ọ ga-enyepụ mụọ ahụ a ga-enwe aịgba egbe-elu-igwe nile na igbu amụma-elu nile nʼohere nke dị ọtụtụ oge awa, ma ụwa ga-eme mkpọtụ ma maa jijiji; ma nkume nile nke dị nʼelu iru nke ala nke a, nke dị ma nʼelu ụwa ma nʼokpuru, ndị nke unu matara nʼoge nke a siri ike, ma-ọbụ akụkụ nke karịrị nʼime ya bụ otu ala siri ike, a ga betiwasi ya;

22 E, a ga etiwa ha abụọ, ma site nʼoge a gaa anʼiru a ga-ahụ ha na njikọ nile ma na mgbawa nile, na na mpekele ntiwasị nʼelu iru nke ala ahụ nile, e, ma nʼelu ụwa ma nʼokpuru.

23 Ma lee, a ga-enwe nnukwu ebili mmiri nile, ma a ga-enwe ọtụtụ ugwu-ukwu ewedatara ala, dịka ndagwụrụgwụ, ma a ga-enwe ọtụtụ ebe nke a na-akpọ ndagwụrụgwụ ugbua nke ga-aghọ ugwu-ukwu, nke ịdị-elu ya dị nnukwu.

24 Ma a ga-etiwa ọtụtụ okporo-ụzọ, ma ọtụtụ aobodo-ukwu ga-abụ ihe tọgbọrọ nʼefu.

25 Ma a ga-emeghe ọtụtụ aili, ma ha ga-enyepụ ọtụtụ ndị ha nwụrụ-anwụ; ma ọtụtụ ndị nsọ ga-egosị ọtụtụ onwe ha.

26 Ma lee, otu a ka amụọ-ozi gwaworo m; n’ihi na ọ gwara m na a ga-enwe ọtụtụ ịgba egbe-elu-igwe nile na igbu amụma-elu nile nʼohere nke dị ọtụtụ oge awa.

27 Ma ọ gwara m na mgbe egbe elu-igwe na amụma-elu ka na-eme, na ebili-mmiri, na ihe ndị a ga-adị, ma na aọchịchịrị ga-ekpuchi ịrụ nke ụwa nile nʼohere nke dị mkpụrụ ụbọchị atọ.

28 Ma mụọ-ozi ahụ gwara m na ọtụtụ ga-ahụ ihe ndị dị ukwuu karịa ndị a, ruo nʼebum-nʼobi na ha ga-ekwere na aihe iriba-ama nile ndị a na ihe-ebube nile ndị a ga-emezu nʼelu iru nile nke ala nke a, ruo nʼebum-nʼobi na-agaghị enwe ihe ga-akpata ekweghị ekwe nʼetiti ụmụ nke mmadụ—

29 Ma nke a ruo nʼebum-nʼobi na onye ọbụla ga-ekwere a ga-azọpụta ya, ma na ndị ọbụla nke na-agaghị ekwere, aikpe ziri-ezi ga-abịakwasị ha; na kwa ọbụrụ na a ma ha ikpe ha wetakwasịrị onwe ha amam-ikpe nke ha.

30 Ma ugbua cheta, cheta, ụmụnne m nwoke, na onye ọbụla nke lara nʼiyi, na-alara onwe ya nʼiyi; ma onye ọbụla na-eme ajọọ-omume, na-emere ya onwe ya; n’ihi na lee, unu anwere onwe unu; e nyere unu ohere imere onwe unu otu unu chọrọ; n’ihi na lee, Chineke enyewo unu bọmụma ihe ma o mewo ka unu nwere onwe unu.

31 O nyewo unu ka unu wee amata ihe-ọma site nʼihe ọjọọ, ma o nyewo unu ka unu nwe ike bhọrọ ndụ ma-ọbụ ọnwụ; ma unu nwere ike ime ihe ọma ma cewetaghachị unu nʼihe ahụ nke dị mma, ma-ọbụ nweta ihe ahụ nke dị mma eweghachịrị nye unu; ma-ọbụ unu nwere ike ime ihe ọjọọ, ma nweta ihe ahụ nke dị njọ eweghachịrị nye unu.