Akwụkwọ nsọ
Hilaman 16


Isi 16

Ndị Nifaị nile kwere nʼihe Samuel kwuru, Nifaị mere ha baptism—Agaghị enwe ike igbu Samuel site n’aku nile na okwute nile nke ndị Nifaị na-echegharịbeghị—Ụfọdụ ga-emesi obi ha ike, ma ndị ọzọ na-ahụ ndị mụọ-ozi.—Ndị ahụ na-ekweghị-ekwe na-asị na o kwesịghị-ekwesị ikwere na Kraịst na ọbịbịa ya na Jerusalem. Ihe dịka nʼafọ 6 ruo 1 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua, o wee ruo na e nwere ọtụtụ ndị nụrụ okwu nile nke Samuel, onye Leman, ndị nke o kwuru nʼelu mgbidi nile nke obodo-ukwu ahụ. Ma ka ha ra bụ ndị kwere nʼokwu ya gara nʼiru ma na-achọ Nifaị; ma mgbe ha bịaruworo ma chọta ya ha kwupụtara mmehie ha nile nye ya ma ha agọghị agọ, na-achọ ka e mee ha baptism nye Onye-nwe.

2 Mana ka ha ra bụ ndị na ekweghị nʼokwu nile nke Samuel wesara ya iwe; ma ha tụrụ ya okwute nʼelu mgbidi ahụ, na kwa ọtụtụ gbara ya akụ dịka o guzoro nʼelu mgbidi ahụ; mana Mụọ nke Onye-nwe nọnyere ya, nke mere na ha enweghị ike ịtụta ya okwute ha nile ọbụghị ma akụ ha nile.

3 Ugbua mgbe ha hụrụ na ha enweghị ike ịtụta ya, e nwere ọtụtụ ndị ọzọ kwere nʼokwu ya nile, nke mere na ha pụgakwuru Nifaị ka e mee ha baptism.

4 N’ihi na lee, Nifaị nọ na-eme baptism, ma na-ebu-amụma, ma na-ekwusa ozi-ọma, na-eti nchegharị nye ndị ahụ, na-egosị ihe iriba-ama na ihe-ebube nile, na-arụ aọrụ-ebube nile nʼetiti ndị ahụ, ka ha wee mata na Kraịst ahụ bga-abịarịrị nʼoge na-adịghị anya—

5 Na-agwa ha maka ihe ndị ga-abịarịrị nʼoge na-adịghị anya, ka ha wee mata ma cheta nʼoge nke ọbịbịa ha na ha e mewo ka ha mata ha tutu oge eruo, na nzube na ha ga-ekwere; ya mere ka ha ra bụ ndị kwere nʼokwu nile nke Samuel gakwuru ya ka e mee ha baptism, n’ihi na ha bịara na-echegharị na-ekwupụta mmehie ha nile.

6 Mana akụkụ nke ndị karịrị nʼime ha ekweghị nʼokwu nile nke Samuel; ya mere mgbe ha hụrụ na ha enweghị ike ịtụta ya okwute ha nile na akụ ha nile, ha tikuru ọchị-agha nile ha, na-asị: Kpọrọ nwoke a ma kee ya agbụ, n’ihi na lee o nwere ajọọ-mụọ; ma n’ihi ike nke ekwensu ahụ nke dị nʼime ya anyị enweghị ike ịtụta ya okwute anyị nile na akụ anyị nile; ya mere kpọrọ ya ma kee ya agbụ, ma kpọpụ ya.

7 Ma mgbe ha garuru imetụ ya aka, lee ọ tụdatara onwe ya site na mgbidi ahụ, ma gbafuo site nʼala ha, e, ọbụna ruo nʼobodo nke ya, ma malite ikwusa ozi-ọma na ibu-amụma nʼetiti ndị nke ya.

8 Ma lee, anụghị kwa ihe gbasara ya ọzọ nʼetiti ndị Nifaị; ma otu a ka ihe nile nke ndị ahụ siri dị.

9 Ma otu a ka afọ nke iri asatọ na isii nke ọchịchị nke ndị-ikpe na-achị ndị nke Nifaị siri gwụchaa.

10 Ma otu a kwa ka afọ nke iri asatọ na asaa nke ọchịchị nke ndị-ikpe siri gwụchaa, akụkụ ndị nke karịrị nʼime ndị ahụ na-anọgide na mpako ha na ajọọ-omume, ma akụkụ ndị nke karịrị ntakịrị na-aga nʼihi-aka nʼanya nʼiru Chineke karịa.

11 Ma ihe ndị a bụ kwa ọnọdụ nile nke dị, nʼafọ nke iri asatọ na asatọ nke ọchịchị nke ndị-ikpe.

12 Ma e nwere nanị mgbanwe ntakịrị nʼihe omume nile nke ndị ahụ, ma ọbụghị na ndị ahụ malitere isi ike karịa nʼajọọ-omume, ma na-eme nke karịrị na nke karịrị nke ihe nke megidere iwu-nsọ nile nke Chineke, nʼafọ nke iri asatọ na iteghete nke ọchịchị nke ndị-ikpe.

13 Mana o wee ruo nʼafọ nke iri iteghete nke ọchịchị nke ndị-ikpe, e nwere nnukwu aihe iriba-ama nile e nyere ndị ahụ, na ihe-ebube nile; ma okwu nile nke ndị-amụma bmalitere imezu.

14 Ma andị mụọ-ozi pụtakwutere ndị mmadụ, ndị amamihe, ma kwupụtaara ha ozi ọma nke oke ọn̄ụ; otu a nʼafọ nke a akwụkwọ-nsọ nile malitere imezu.

15 Otu o sila dị, ndị ahụ malitere imesi obi ha ike, ha nile ma ọbụghị akụkụ ndị nke kachasịrị kwere nʼime ha, ma na ndị Nifaị na kwa na ndị Leman, ma malite ịdabere nʼume nke onwe ha na aamamihe nke onwe ha, na-asị:

16 Ụfọdụ ihe ka ha ga-akọtawọrịị, nʼetiti ọtụtụ; mana lee, anyị matara na nnukwu na ọrụ ịtụ-nʼanya nile ndị a agaghị enwe ike imezu, ndị nke e kwuworo maka ha.

17 Ma ha malitere ịtụgharị-uche na ịdọ ndọrọ-ndọrọ nʼetiti onwe ha, na-asị:

18 Na ọ adịghị akọ na uche dị na ụdị ihe dịka otu Kraịst ga-abịa; ọbụrụ otu ahụ, ma-ọbụ Ọkpara nke Chineke, Nna nke elu-igwe na nke ụwa, dịka e kwuworo ya, gịnị mere ọ gaghị egosị anyị onwe ya dịka nye ndị nke ga-anọ na Jerusalem?

19 E, gịnị mere ọ gaghị egosị onwe ya nʼala nke a dịka nʼala nke Jerusalem?

20 Mana lee, anyị matara na nke a bụ ajọọ aomenala, nke enyedataworo anyị site nʼaka ndị nna anyị, ime ka anyị kwere nʼụfọdụ nnukwu na ihe ịtụ-nʼanya nke ga-emezu, mana ọbụghị nʼetiti anyị, kama nʼala nke dị nʼebe dị anya, ala nke anyị na-amaghị; ya mere ha nwere ike idebe anyị nʼamaghị ama, n’ihi na anyị enweghị ike bịhụ nʼanya anyị na ha bụ ezi-okwu.

21 Ma ha ga, site na aghụghọ na nka nile dị omimi nke ajọọ-onye ahụ, rụọ ụfọdụ nnukwu ihe omimi nke anyị na-enweghị ike ịghọta, nke ga-edebe anyị nʼokpuru ịbụ ụmụ-oru nye okwu ha nile, na kwa ụmụ-oru nye ha, n’ihi na anyị dabere ha ịkụziri anyị okwu ahụ; ma otu a ka ha ga-esi debe anyị nʼamaghị-ama ma ọbụrụ na anyị ga-adanyere ha onwe anyị, ụbọchị nile nke ndụ anyị.

22 Ma ọtụtụ ihe ndị ọzọ ka ndị ahụ chelitere nʼobi ha, ndị bụ ihe nzuzu na aihe efu; ma e nyere ha nnukwu nsogbu, n’ihi na Setan kpalitere ha ime ajọọ-omume esepụghị-aka; e, ọ gagharịrị na-agbasa asịrị nile na ndọrọ-ndọrọ nile nʼelu iru nile nke ala ahụ, ka o wee na emesi obi nile nke ndị ahụ ike megide ihe nke dị mma na megide ihe nke ga-abịa.

23 Ma na-agbanyeghị ihe iriba-ama nile na ihe-ebube nile ndị e wetara nʼetiti ndị nke Onye-nwe, na ọtụtụ ọrụ-ebube nile nke ha mere, Setan jidesiri obi nile nke ndị ahụ ike nʼelu iru nile nke ala ahụ.

24 Ma otu a ka afọ nke iri-iteghete nke ọchịchị nke ndị-ikpe na-achị ndị nke Nifaị siri gwuchaa.

25 Ma otu a ka akwụkwọ nke Hilaman siri gwụchaa, dịka akụko-ndekọta nke Hilaman na ụmụ ya nwoke siri dị.