Akwụkwọ nsọ
Hilaman 11


Isi 11

Nifaị wee mee ka Onye-nwe kwenye iji ụnwụ dochie agha ha—Ọtụtụ ndị wee nwụọ—Ha chegharịrị, ma Nifaị wee rịọsie Onye-nwe arịrịọ ike maka mmiri-ozuzo—Nifaị na Lihaị wee nata ọtụtụ mkpughe—Ndị ori Gadiantọn wee webatazie onwe ha nʼala ahụ. Ihe dịka nʼafọ 20 ruo 6 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo nʼafọ nke iri asaa na abụọ nke ọchịchị nke ndị-ikpe na ndọrọ-ndọrọ nile ahụ buwanyere ibu, nke mere na e nwere agha gazuo ala ahụ nile nʼetiti ndị nke Nifaị.

2 Ma-ọbụ ndị otu ori anzuzo a bụ ndị gara nʼiru nʼọrụ nke mbibi a na ajọọ-omume. Ma agha nke a dịgidere afọ ahụ nile; ma nʼafọ nke iri asaa na atọ ọ digidekwara.

3 Ma o wee ruo na nʼafọ nke a Nifaị bekuru Onye-nwe, na-asị:

4 O Onye-nwe, ekwela ka e bibie ndị a site na mma agha, mana O Onye-nwe kama ka enwe aụnwụ nʼala ahụ, ịkpọte ha na ncheta nke Onye-nwe Chineke ha, ma eleghị anya ha ga-echegharị ma tụgharịkwute gị.

5 Ma otu ahụ ka e mere ya, dịka okwu nile nke Nifaị siri dị. Ma e nwere nnukwu ụnwụ nʼala ahụ, nʼetiti ndị nke Nifaị nile. Ma otu a nʼafọ nke iri asaa na anọ ụnwụ ahụ gara nʼiru, ma ọrụ nke mbibi kwụsịrị site na mma agha kama wee karịa site nʼụnwụ.

6 Ma ọrụ nke mbibi a gakwara nʼiru nʼafọ nke iri asaa na ise. N’ihi na e tiri ụwa otiti ihe nke mere na ọ kpọrọ nkụ, ma ọ mịpụtaghị akụkụ-ubi nʼoge akụkụ-ubi; ma a bụrụ ụwa nile ọnụ, ọbụna nʼetiti ndị Leman dịka ọ dị nʼetiti ndị Nifaị, nke mere na e tiri ha ihe otiti nke mere na ha lara nʼiyi nʼọtụtụ puku nʼakụkụ nke ndị kara bụrụ ndị ajọọ-omume nke ala ahụ.

7 Ma o wee ruo na ndị ahụ hụrụ na o fọdụrụ ntakịrị ka ha laa nʼiyi site nʼụnwụ, ma ha malitere aicheta Onye-nwe Chineke ha; ma ha malitere icheta okwu nile nke Nifaị.

8 Ma ndị ahụ malitere ịrịọ ndị-isi-ikpe ha na ndị ndu ha arịrịọ, ka ha wee gwa Nifaị: Lee, anyị matara na ị bụ onye nke Chineke, ma ya mere tikuo Onye-nwe Chineke anyị ka o wepụrụ anyị ụnwụ a, eleghị anya aokwu nile nke ị kwuworo gbasara mbibi anyị ewee mezuo.

9 Ma o wee ruo na ndị-ikpe gwara Nifaị, dịka okwu nile nke a chọworo. Ma o wee ruo na mgbe Nifaị hụrụ na ndị ahụ echegharịwo ma wedata onwe ha ala nʼakwa mkpe, o tikuru Onye-nwe ọzọ, na-asị:

10 O Onye-nwe, lee ndị a echegharịwo; ma ha azachapụwo otu nke Gadiantọn site nʼetiti ha nke mere na ha anọghị kwa ọzọ, ma ha ezowo atụmatụ nzuzo ha nile nʼime ala.

11 Ugbua, O Onye-nwe, n’ihi umeala ha nke a biko ị ga-ewezuga iwe gị, ma ka iwe gị dajụrụ na mbibi nke ndị ajọọ-omume ahụ ibibiworọrịị.

12 O Onye-nwe, i ga ewepụ iwe gị, e, iwe gị dị egwu, ma mee ka ụnwụ nke a kwụsị nʼala nke a.

13 O Onye-nwe, i ga-an̄a m ntị, ma mee ka e mee ya dịka okwu m nile siri dị, ma zidata ammiri-ozuzo nʼiru elu nke ala ahụ, ka o wee mịpụta mkpụrụ-osisi ya, na akụkụ-ubi ya nʼoge akụkụ-ubi.

14 O Onye-nwe, ị n̄ara ntị anʼokwu m nile mgbe m sịrị, Ka e nwe ụnwụ, ka ajọọ-ọrịa nke mma agha wee kwụsị; ma a matara m na ị ga, ọbụna nʼoge nke a, an̄a-ntị nʼokwu m nile, n’ihi na i kwuru na: Ọbụrụ na ndị a chegharịa aga m edebe ha.

15 E, O Onye-nwe, ma i na-ahụ na ha echegharịwo, n’ihi ụnwụ ahụ na ajọọ-ọrịa ahụ na mbibi ahụ nke bịakwasịworo ha.

16 Ma ugbua, O Onye-nwe, i ga e wezuga iwe gị, ma nwaa ha ọzọ ma ha ga-efe gị? Ma ọbụrụ otu a, O Onye-nwe, i nwere ike ịgọzi ha dịka okwu gị nile nke i kwuworo siri dị.

17 Ma o wee ruo na nʼafọ nke iri asaa na isii Onye-nwe wezugara iwe ya site nʼebe ndị ahụ nọ, ma mee ka ammiri zokwasị ala ahụ, nke mere na ọ mịpụtara mkpụrụ-osisi ya nʼoge mkpụrụ-osisi. Ma o wee ruo na ọ mịpụtara akụkụ-ubi ya nʼoge akụkụ-ubi ya.

18 Ma lee, ndị ahụ n̄ụrịrị ọn̄ụ ma too Chineke, ma elu iru nile nke ala ahụ nile jupụtara nʼịn̄ụrị ọn̄ụ; ma ha achọghị-kwa ọzọ ibibi Nifaị, kama ha buliri ya elu dịka annukwu onye-amụma, na onye nke Chineke, ebe o nwere nnukwu ike na ikike e nyere ya site na Chineke.

19 Ma lee, Lihaị, nwanne ya nwoke, anọghị ọbụladị otu ampekele nʼazụ ya nʼihe gbasara ezi-omume.

20 Ma otu a o ruru na ndị nke Nifaị ahụ malitere ime nke ọma ọzọ nʼala ahụ, ma malite iwulite ebe nile a kwadara akwada, ma malite ịmụba na ịgbasa, ọbụna ruo mgbe ha kpuchiri elu iru nile nke ala ahụ, ma nʼakụkụ elu-elu na nʼakụkụ ndịda-ndịda, site nʼoke osimiri ọdịda anyanwụ ruo nʼoke osimiri ọwụwa-anyanwụ.

21 Ma o wee ruo na afọ nke iri asaa na isii gwụchara nʼudo. Ma afọ nke iri asaa na asaa malitere nʼudo; ma anzukọ-nsọ ahụ gbasara gazuo nʼakụkụ iru nke ala ahụ nile; ma ndị nke karịrị na ndị ahụ, ma ndị Nifaị ma ndị Leman, bụụrụ ndị nzukọ-nsọ ahụ, ma ha nwere nnukwu udo karịa nʼala ahụ; ma otu a ka afọ nke iri asaa na asaa siri gwụchaa.

22 Na kwa ha nwere udo nʼafọ nke iri asaa na asatọ, ma obụghị ndọrọ-ndọrọ ole na ole gbasara ihe nke ozizi nke ndị-amụma dedaworo.

23 Ma nʼafọ nke iri asaa na iteghete a malitere inwe nnukwu esem-okwu. Mana o wee ruo na Nifaị na Lihaị, na ọtụtụ nʼime ụmụnne ha ndị nwoke ndị matara ihe gbasara ezi-okwu ihe nile nke ozizi, ebe ha nweworo ọtụtụ amkpughe kwa ụbọchị, ya mere ha kwusaara ndị ahụ ozi-ọma, nke mere na ha kwụsịrị esem-okwu ha nʼime otu afọ ahụ.

24 Ma o wee ruo na nʼafọ nke iri asatọ nke ọchịchị nke ndị-ikpe na-achị ndị nke Nifaị ahụ, e nwere ọnụ-ọgụgụ ụfọdụ nke ndị nghọtahịe ahụ sitere na ndị nke Nifaị, ndị nʼụfọdụ afọ gara aga gafekwugaworo ndị Leman, ma kpọkwasịwo onwe ha aha nke ndị Leman, na kwa ọnụ-ọgụgụ ụfọdụ ndị bụ ezigbo ndị agbụrụ nke ndị Leman, ebe ha kpasuworo ha iwe, ma-ọbụ site na ndị nghọtahịe ahụ, ya mere ha malitere agha ha na ụmụnne ha nwoke.

25 Ma ha gburu mmadụ ma pụnara mmadụ ihe; ma mgbe ahụ ha ga-alaghachị azụ baa nʼime ugwu-ukwu nile, na nʼime ọzara na ebe nzuzo nile, na-ezo onwe ha ka a ghara ịchọpụta ha, na-anabata kwa ụbọchị mgbakwụnye nʼọnụ-ọgụgụ ha, ebe ọ bụ na e nwere ndị nghọtahịe nke gakwuru ha.

26 Ma otu a nʼoge ntakịrị, e, ọbụna nʼohere nke na-adịghị ọtụtụ afọ, ha ghọrọ ndị nnukwu otu ndị ori karịrị akarị; ma ha chọpụtara atụmatụ nzụzọ nile nke Gadiantọn; ma otu a ha ghọrọ ndị ori nke Gadiantọn.

27 Ugbua lee, ndị ori ahụ mebiri nnukwu ihe, e, ọbụna nnukwu mbibi nʼetiti ndị nke ndị Nifaị, na kwa nʼetiti ndị nke ndị Leman.

28 Ma o wee ruo na ọ dịịrị mkpa na a ga-enwe nkwụsị e tinyere nʼọrụ nke mbibi a; ya mere ha zigara ndị-agha nke ndị nwoke siri ike nʼime ọzara ahụ na nʼelu ugwu-ukwu nile ịchọpụta otu nke ndị ori a, na ibibi ha.

29 Mana lee, o wee ruo na nʼotu afọ ahụ a chụghachiri ha azụ ọbụna nʼime ala nile nke ha. Ma otu a ka afọ nke iri asatọ nke ọchịchị nke ndị-ikpe na-achị ndị nke Nifaị siri gwụchaa.

30 Ma o wee ruo na mmalite nke afọ nke iri asatọ na otu ha gara ọzọ megide otu ndị ori a, ma ha bibiri ọtụtụ; ma e letakwara ha jiri nnukwu mbibi.

31 Ma a kwagidekwara ha ọzọ ịlaghachi site nʼọzara ahụ na site nʼugwu-ukwu nile ahụ gaa nʼala nile nke ha, n’ihi nnukwu nke ọnụ-ọgụgụ karịrị akarị nke ndị ori ahụ ndị jupụtara ugwu-ukwu nile ahụ na ọzara ahụ.

32 Ma o wee ruo na otu a ka afọ nke a siri gwụchaa. Ma ndị ori ahụ ka nọ na-abawanye ma na-agbasi ike, nke mere na ha guzogidere ndị-agha nile nke ndị Nifaị ahụ, na kwa nke ndị Leman; ma ha mere ka nnukwu egwu bịakwasị ndị ahụ nʼelu iru nile nke ala ahụ.

33 E, n’ihi na ha letara ọtụtụ akụkụ nke ala ahụ, ma mee nnukwu mbibi nʼebe ha nọ; e, gbuo ọtụtụ, ma dọkpụpụ ndị ọzọ ndị a dọkpụrụ nʼagha nʼime ọzara ahụ, e, ma nke kachasị nke ndịnyom ha na ụmụ ha.

34 Ugbua nnukwu ajọọ ihe nke a, nke bịakwasịrị ndị ahụ n’ihi ajọọ-omume ha, kpatelitere ha ọzọ na ncheta nke Onye-nwe Chineke ha.

35 Ma otu a ka afọ nke iri asatọ na otu nke ọchịchị nke ndị-ikpe siri gwụchaa.

36 Ma nʼafọ nke iri asatọ na abụọ ha malitekwara ọzọ aichefu Onye-nwe Chineke ha. Ma nʼafọ nke iri asatọ na atọ ha malitere ịgbasi ike nʼajọọ-omume. Ma nʼafọ nke iri asatọ na anọ ha emezighị ụzọ ha nile.

37 Ma o wee ruo nʼafọ nke iri asatọ na ise ha gbasiri ike nʼelu mgbasi ike na mpako ha, na nʼajọọ-omume ha; ma otu a ha na-acha kwa ọzọ maka mbibi.

38 Ma otu a ka afọ nke iri asatọ na ise siri gwụchaa.