Akwụkwọ nsọ
Hilaman 13


Ibu-amụma nke Samuel, onye nke Leman, nye ndị nke Nifaị.

Mejupụtara isi 13 ruo isi 15 e tinyekọtara.

Isi 13

Samuel onye nke Leman wee buo amụma mbibi nke ndị Nifaị ma ọbụgbị na ha chegharịrị—Ha na akụ na ụba ha ka a bụrụ ọnụ—Ha jụrụ ma tụọ ndị-amụma nile ahụ okwute, ndị mụọ ọjọọ gbachibidoro ha gburu-gburu—Ma na-achọ an̄ụrị na-ime ajọọ-omume. Ihe dịka nʼafọ 6 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo nʼafọ nke iri asatọ na isii, ndị Nifaị nọgidekwara nʼajọọ-omume, e, na nnukwu ajọọ-omume, ebe andị Leman lerusiri anya ike idebe iwu-nsọ nile nke Chineke, dịka iwu nke Moses siri dị.

2 Ma o wee ruo na nʼime afọ nke a e nwere otu Samuel, onye nke Leman, batara nʼala nke Zarahemla, ma malite ikwusara ndị ahụ ozi-ọma. Ma o wee ruo na o kwusara ozi-ọma, ọtụtụ ụbọchị, nchegharị nye ndị ahụ, ma ha chụpụrụ ya, ma ọ chọrọ ịlaghachi nʼala nke ya.

3 Mana lee, olu nke Onye-nwe bịakwutere ya, ka ọ laghachị ọzọ, ma buoro ndị ahụ amụma ihe ọbụla ga-abata nʼime aobi ya.

4 Ma o wee ruo na ha ekweghị ka ọ baa nʼime obodo-ukwu ahụ; ya mere ọ gara rigoro nʼelu mgbidi nke dị nʼebe ahụ, ma gbatịpụ aka ya ma tie mkpu nʼolu dị elu, ma buoro ndị ahụ amụma ihe nile ọbụla Onye-nwe tinyere nʼime obi ya.

5 Ma ọ sịrị ha: Lee, mụ, Samuel, onye nke Leman, na-ekwu okwu nile nke Onye-nwe ndị nke ọ na-etinye nʼobi m; ma lee o tinyewo ya nʼobi m ikwupụtara ndị a na amma-agha nke ikpe zịrị-ezi na-ekoro nʼofe isi ndị a; ma narị afọ anọ agaghị agafe tutu mma-agha nke ikpe zịrị-ezi ahụ ga-adakwasị ndị a.

6 E, ambibi dị arọ na-eche ndị a, ma ọ na-abịakwute ndị a nʼezie, ma ọdịghị ihe ga-azọpụta ndị a ma-ọbụghị nchegharị na okwukwe nʼOnye-nwe Jisus Kraịst, onye ga-abịa nʼime ụwa nʼezie, ma ọ ga-ata ahụhụ ọtụtụ ihe ma a ga-egbu ya maka ndị ya.

7 Ma lee, onye amụọ-ozi nke Onye-nwe ekwupụtaworo m ya, ma o wetara bozi ọma nke obi-ụtọ nye mkpụrụ-obi m. Ma lee, e zitara m nye unu ikwupụta ya nye kwa unu, ka unu wee nwee ozi ọma; mana lee, unu achọghị ịnabata m.

8 Ya mere, otu a ka Onye-nwe kwuru: N’ihi isi-ike nke obi nile, ndị nke ndị Nifaị, ma ọbụghị na ha chegharịrị, aga m ewepụ okwu m site nʼebe ha nọ, ma aga m aewereghachị Mụọ m site nʼebe ha nọ, ma agaghị m anagide ha ọzọ, ma aga m atụgharị obi nile nke ụmụnne ha nwoke megide ha.

9 Ma anarị afọ anọ agaghị agafee tutu m ga-eme ka e tie ha otiti ihe; e, aga m eleta ha jiri mma-agha na jiri ụnwụ na jiri ajọọ-ọrịa.

10 E, aga m eleta ha nʼiwe m dị egwu, ma a ga-enwe ndị nke aọgbọ nke anọ ndị ga-adị ndụ, bụ ndị iro unu, ịhụ mbibi unu kpam-kpam; ma nke a ga-abịarịrị ma ọbụghị na unu chegharịrị, ka Onye-nwe kwuru, ma ndị nke ọgbọ nke anọ ga-eweta mbibi unu.

11 Mana ọbụrụ na unu ga-echegharị ma alaghachịkwute Onye-nwe Chineke unu, aga m atụgharịpụ iwe m, ka Onye-nwe kwuru; e, otu a ka Onye-nwe kwuru, ngọzi na-adịrị ha bụ ndị ga-echegharị ma tụgharịkwute m, mana ahụhụ na-adịrị onye ahụ nke na-agaghị echegharị.

12 E, aahụhụ na-adịrị nnukwu obodo-ukwu nke Zarahemla nke a; n’ihi na lee, ọ bụ n’ihi ndị ezi-omume ahụ ka e jiri zọpụta ya; e, ahụhụ na-adịrị nnukwu obodo-ukwu nke a, n’ihi na ahụrụ m, ka Onye-nwe kwuru, na e nwere ọtụtụ, e, ọbụna akụkụ ndị nke karịrị na nnukwu obodo-ukwu nke a, ndị ga-emesi obi ha ike megide m, ka Onye-nwe kwuru.

13 Mana ngọzi na-adịrị ndị ahụ ga-echegharị, n’ihi na ha ka m ga-edebe. Mana lee, ọbụrụ na ọbụghị maka ndị ezi-omume nọ na nnukwu obodo-ukwu nke a, lee, aga m eme ka aọkụ rịdata site nʼelu-igwe ma bibie ya.

14 Mana lee, ọ bụ n’ihi ndị ezi-omume ka e jiri debe ya. Mana lee, oge na-abịa, ka Onye-nwe kwuru, na mgbe unu ga-achụpụ ndị ezi-omume site nʼetiti unu, mgbe ahụ ka unu ga-acha-maka mbibi; e, ahụhụ ga-adịrị nnukwu obodo-ukwu nke a, n’ihi ajọọ-omume na ihe arụ nile nke dị nʼime ya.

15 E, ma ahụhụ ga-adịrị obodo-ukwu nke Gịdiọn, n’ihi ajọọ-omume na ihe arụ nile nke dị nʼime ya.

16 E, ma ahụhụ ga-adịrị obodo-ukwu nile ndị dị nʼala ahụ gburu-gburu, nke ndị Nifaị nwere, n’ihi ajọọ-omume na ihe arụ nile nke dị nʼime ha.

17 Ma lee, aọbụbụ-ọnụ ga-abịakwasị ala ahụ, ka Onye-nwe nke usu nile nke ndị-agha kwuru, n’ihi ndị ahụ bụ ndị nọ nʼala ahụ, e, n’ihi ajọọ-omume ha na ihe arụ ha nile.

18 Ma ọ ga-eru, ka Onye-nwe nke usu nile nke ndị-agha kwuru, e, nnukwu na ezi Chineke anyị, na onye ọbụla aga-ezo akụ nile nʼime ala agaghị achọtakwa ha ọzọ, n’ihi nnukwu ọbụbụ-ọnụ nke ala ahụ, ma ọbụghị na ọ bụ onye ezi-omume ma ọ ga-ezolite ya nye Onye-nwe.

19 N’ihi na aga m achọ, ka Onye-nwe kwuru, na ha ga-ezolitere m akụ ha; ma ọbụbụ-ọnụ ga-adịrị ha bụ ndị na-anaghị ezolitere m akụ ha; n’ihi na ọdịghị ndị na-ezolitere m akụ ha ma ọbụghị ndị ezi-omume; ma onye ọbụla nke na-anaghị ezolitere m akụ ya, ọbụbu-ọnụ na-adịrị ya, na kwa akụ ahụ, ma ọdịghị onye ga-agbapụta ya n’ihi ọbụbụ-ọnụ nke ala ahụ.

20 Ma ụbọchị ahụ ga-abịa mgbe ha ga-ezolite akụ ha nile, n’ihi na ha atụkwasịwo obi ha nile nʼakụ na ụba; ma n’ihi na ha atụkwasịwo obi ha nile nʼakụ na ụba ha, ma ha ga ezolite akụ ha nile mgbe ha ga-agbapụ site nʼiru ndị iro ha; n’ihi na ha agaghị ezolitere m ha, ọbụbụ-ọnụ ga-adịrị ha na kwa akụ ha nile, ma nʼụbọchị ahụ ka a ga eti ha otiti-ihe, ka Onye-nwe kwuru.

21 Lee nu, ndị nke nnukwu obodo-ukwu nke a, ma an̄aa-ntị nʼokwu m nile; e, n̄aa-ntị nʼokwu nile nke Onye-nwe na-ekwu; n’ihi na lee, o kwuru na abụrụ unu ọnụ n’ihi akụ na ụba unu, na kwa abụrụ akụ na ụba unu ọnụ n’ihi na unu atụkwasịwo obi unu nile na ha, ma unu an̄abeghị ntị nʼokwu nile nke onye ahụ nyeworo unu ha.

22 Unu anaghị echeta Onye-nwe Chineke unu nʼihe nile ndị nke o jiworo gọzie unu, mana unu na-echeta aakụ na ụba unu oge nile, na anaghị ekele Onye-nwe Chineke unu maka ha; e, obi unu nile anaghị abịakwute Onye-nwe, mana ha na afụli-elu na nnukwu bmpako, ruo na itu-ọnụ, na ruo na nnukwu mfụli-elu, cntaji-anya nile, esem-okwu, echiche-ọjọọ, inye-nsogbu nile na igbu-mmadụ nile, na ụdị ajọọ-omume nile dị iche iche.

23 N’ihi nke a ka Onye-nwe Chineke jiri mee na ọbụbụ-ọnụ ga-abịakwasị ala ahụ, na kwa nʼakụ na ụba unu nile, ma nke a n’ihi ajọọ-omume unu nile.

24 E, ahụhụ na-adịrị ndị a, n’ihi oge nke a nke bịarutaworo, na unu ana-achụpụ ndị-amụma nile, ma na-akwa ha emu, ma na-atụ ha okwute, ma na-egbu ha, ma na-emeso ha ụdị ajọọ-omume nile dị iche iche, ọbụna dịka ha mere na mgbe ochie.

25 Ma ugbua mgbe unu na-ekwu okwu, unu na-asị: Ọbụrụ na ụbọchị anyị nile bụ rịị nʼụbọchị nile nke andị nna anyị mgbe ochie, anyị agaraghị egbu ndị-amụma nile ahụ; anyị agaraghị atụ ha okwute, ma chụpụ ha.

26 Lee unu dị njọ karịa ha; n’ihi na dịka Onye-nwe na-adị ndụ, ọbụrụ na aonye-amụma ga-abịa nʼetiti unu ma kwupụtara unu okwu nke Onye-nwe, nke na-agba ama maka mmehie unu nile na ajọọ-omume unu nile, unu ga-eweso ya biwe, ma chụpụ ya ma chọọ ụzọ dị iche-iche ibibi ya; e, unu ga-asị na ọ bụ conye-amụma ụgha, ma na ọ bụ onye-mmehie, na nke ekwensu, n’ihi na ọ dna-agba ama na omume unu jọrọ-njọ.

27 Mana lee, ọbụrụ na otu nwoke ga-abịa nʼetiti unu ma ọ ga-asị: Mee nke a, ma enweghị ihe ọjọọ; mee nke ahụ ma unu agaghị ata ahụhụ; e, o ga-asị: Gaa ije nʼụdị mpako nke obi onwe unu nile; e, gaa ije nʼụdị mpako nke anya unu nile, ma mee ihe ọbụla obi unu chọrọ—ma ọbụrụ na otu nwoke ga-abịa nʼetiti unu ma kwuo nke a, unu ga-anabata ya, ma sị na ọ bụ aonye-amụma.

28 E, unu ga-ebuli ya elu, ma unu ga-enye site nʼihe unu nwere; unu ga-enye ya site nʼọla-edo unu, na site nʼọla-ọcha unu, ma unu ga-eyibe ya uwe dị oke-ọnụ ahịa; ma n’ihi na ọ na-agwa unu aokwu otuto erughị nʼobi, ma ọ ga-asị na ihe nile dị mma, mgbe ahụ unu agaghị achọpụta iri mpe ya.

29 O unu ndị ajọọ-omume na unu ọgbọ nduhie; unu ndị obi-ike na unu ndị na-akpọ-ekwe-nkụ, ruo ole mgbe ka unu ga-eche na Onye-nwe ga-anagide unu? E, ruo ole mgbe ka unu ga-ahapụ onwe unu ka andị nzuzu na ndị ndu bkpuru-isi na-edu unu? E, ruo ole mgbe ka unu cga-ahọrọ ọchịchịrị karịa dihe?

30 E, lee, iwe nke Onye-nwe adịwo rịị ọkụ megide unu; lee, ọ bụwo ala ọnụ maka ajọọ-omume unu.

31 Ma lee, oge na-abịa mgbe ọ ga-abụ akụ na ụba unu ọnụ, ka ha ana-ami-ami, ka unu ghara inwe ike ijide ha; ma nʼụbọchị nile nke ịda-ogbenye unu, unu enweghị ike idebe ha.

32 Ma nʼụbọchị nile nke ịda-ogbenye unu unu ga-akpọku Onye-nwe; ma nʼefu ka unu ga-akpọ, n’ihi na ịtọgbọrọ nʼefu unu abịakwasịwo rịị unu, ma mbibi unu e mewo ka ọ bụrụ ezi-okwu; ma mgbe ahụ ka unu ga-akwa akwa ma tie ogologo mkpu nʼụbọchị ahụ, ka Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha kwuru. Ma mgbe ahụ ka unu ga-akwa akwa arịrị, ma sị:

33 O a dị m ka asị na m cheghariworọrịị, ma e gbụghị ndị-amụma nile, ma btụọ ha okwute, ma chụpụ ha. E, nʼụbọchị ahụ unu ga-asị: O ọ dị ka asị na anyị chetaworọrịị Onye-nwe Chineke anyị nʼụbọchị ndị nke o nyere anyị akụ na ụba nile, ma mgbe ahụ ha agaraghị amị-amị nke ga-eme ka anyị tufuo ha; n’ihi na lee, akụ na ụba anyị nile apụwo site nʼebe anyị nọ.

34 Lee, anyị na-atọgbọ ngwa-ọrụ nʼebe a ma nʼechi ya ọ pụwo; ma lee, a na-anapụ anyị mma-agha anyị nile nʼụbọchị anyị chọrọ ha maka ịlụ-agha.

35 E, anyị ezolitewo akụ anyị nile ma ha amịpụnariwo anyị, n’ihi ọbụbụ-ọnụ nke ala ahụ.

36 O ọ dị m ka asị na anyị chegharịworọrịị nʼụbọchị ahụ nke okwu nke Onye-nwe bịakwutere anyị; n’ihi na lee a bụwo ala ahụ ọnụ, ma ihe nile na-ami-ami, ma anyị enweghị ike ijide ha.

37 Lee ajọọ-mụọ gbara anyị gburu-gburu, e, mụọ-ozi nke onye ahụ chọworo ibibi mkpụrụ-obi anyị gbachibidoro anyị gburu-gburu. Lee, ajọọ-omume anyị nile dị ukwuu. O Onye-nwe i nweghị ike iwepụ iwe gị site nʼebe anyị nọ? Ma nke a ga-abụ asụsụ ụnụ nʼụbọchị nile ndị ahụ.

38 Mana lee, aụbọchị nile nke mnwale unu agafewo; unu begbuwo oge maka ụbọchị nzọpụta unu ruo mgbe oge gafeworo ruo mgbe ebighi-ebi, ma mbibi unu e mewo ka ọ bụrụ ezi-okwu; e, n’ihi na unu achọwo nʼụbọchị nile nke ndụ unu ihe nke unu na-agaghị enwe ike inweta; ma unu cachọwo inweta an̄ụrị site nʼime ajọọ-omume, bụ ihe nke na-emegide ụdị-okike nke ezi-omume ahụ nke dị nʼime nnukwu na Isi nke Ebighi-ebi anyị.

39 O unu ndị ala a, na unu ga-anụ okwu m nile! Ma ana m ekpe ekpere ka atụgharịpụ iwe nke Onye-nwe site nʼebe unu nọ, ma na unu ga-echegharị na ka a zọpụta unu.