Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 33


Isi 33

Okwu nile nke Nifaị bụ ezi-okwu—Ha na-agba-ama maka Kraịst—Ndị nile kwere na Kraịst ga-ekwere n’okwu nile nke Nifaị nke ga-eguzo dịka ihe aka-ebe n’iru oche-ikpe. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua mụ, Nifaị, agaghị enwe ike idecha ihe nile ndị akụziri n’etiti ndị m; ọbụghị ma m adị ike n’ide ihe, dịka n’ikwu okwu; n’ihi na mgbe mmadụ ji ike nke Mụọ Nsọ bna-ekwu okwu, ike nke Mụọ Nsọ na-eburu ya baa ruo n’obi nile nke ụmụ nke mmadụ.

2 Mana lee, e nwere ọtụtụ ndị ga aemesi obi ha ike megide Mụọ Nsọ, na ọ gaghị enwe ọnọdụ n’ime ha; ya mere, ha na-atụfu ọtụtụ ihe ndị e dere ede ma na-ewere ha dịka ihe efu.

3 Ma mụ, Nifaị, edewo ihe m deworo, ma ana m ewere ya dịka ihe aoke ọnụ ahịa, ma nke ka nke nye ndị m. N’ihi na a na m bekpe ekpere esepụghị-aka maka ha n’ehihie, ma anya m abụọ na-ede ohiri-isi m mmiri n’abalị, n’ihi ha; ma a na m ebeku Chineke m n’okwukwe, ma a ma m na o ga-anụ akwa nke m.

4 Ma a ma m na Onye-nwe Chineke ga-edo ekpere m nsọ ka ọ bara ndị m uru. Ma okwu nile nke m deworo na-adịghị ike ka a ga-eme ka ha asie ike nye ha; n’ihi na ọ bna-agba ha ume ime ihe ọma; ọ na-eme ka ha mata maka ndị nna ha; ma ọ na-ekwu kwa maka Jisus, ma na-agba ha ume ikwere na Ya, na nọgide ruo n’ọgwụgwụ, nke bụ ndụ cebighi-ebi.

5 Ma ọ na aekwu n’olu-ike megide mmehie, dịka bịdị mfe na nghọta nke ezi-okwu ahụ siri dị; ya mere, ọdịghị onye ga-ewe iwe n’okwu nile m deworo ma ọbụghị na ọ ga-abụ onye nwere mụọ nke ekwensu.

6 A na m enwe an̄ụrị n’ikwu okwu dị mfe nghọta; A na m enwe an̄ụrị n’ezi okwu; A na m enwe an̄ụrị na Jisus m, n’ihi na ọ agbapụtawo mkpụrụ-obi m site n’ala-mụọ.

7 E nwere m aafọ-ọma maka ndị m, na nnukwu okwukwe na Kraịst na a ga m ezute ọtụtụ mkpụrụ-obi n’enweghị ntụpọ n’oche-ikpe Ya.

8 E nwere m afọ-ọma maka andị Juu—A sị m Juu, n’ihi na a na m ekwu ndị ahụ bụ ebe m siri bịa.

9 E nwekwara m afọ-ọma maka andị Jentaịlụ. Mana lee, n’ihi na ọdịghị onye ọbụla n’ime ndị a m nwere ike inwe olile-anya ma ọbụghị na a bga-emere ha udo nyefee Kraịst, ma baa n’ime cọnụ-ụzọ-ama ahụ dị mkpafa, ma dna-aga ije n’ụzọ ahụ dị ewara-wara nke na-edụba na ndụ, ma na-aga n’ụzọ ahụ ruo ọgwụgwụ nke ụbọchị mnwale ahụ.

10 Ma ugbua, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, na kwa ndị Juu, na unu nile nsọtụ nile nke ụwa, n̄aa ntị n’okwu ndị a nile ma akwere na Kraịst; ma ọbụrụ na unu ekweghị n’okwu nile ndị a, kwere na Kraịst. Ma ọbụrụ na unu ga-ekwere na Kraịst unu ga-ekwere bn’okwu nile ndị a, n’ihi na ha bụ cokwu nke Kraịst, ma o nyewo m ha; ma ha dna-akụziri mmadụ nile na ha kwesịrị ime ihe ọma.

11 Ma ọbụrụ na ha abụghị okwu nke Kraịst, kpebie nụ—n’ihi na Kraịst ga-egosị unu, jiri aike na nnukwu ebube, na ha bụ okwu ya, n’ụbọchị ikpeazụ; ma unu na mụ ga-eguzo n’iru n’iru bn’oche ikpe ahụ; ma unu ga-amata na o nyewo m iwu ide ihe ndị a nile, na-agbanyeghị adịghị ike m.

12 Ma a na m ekpere Nna ahụ n’aha nke Kraịst ka ọtụtụ n’ime anyị, ma ọbụghị anyị nile, ga-abụ ndị a ga-azọpụta an’ala-eze ya na nnukwu na ụbọchị ikpeazụ ahụ.

13 Ma ugbua, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, ndị nile bụ ndị nke ụlọ nke Israel, na unu nile nsọtụ nile nke ụwa, a na m agwa unu okwu dịka olu onye na-ebe aakwa site n’uzuzu: Nọdunu mma ruo mgbe nnukwu ụbọchị ahụ ga-abịa.

14 Ma unu ndị na-agaghị eketa oke n’idi mma nke Chineke, ma sọpụrụ aokwu nile nke ndị Juu, na kwa bokwu m nile, na okwu nile ga-esi n’ọnụ nke Nwa-atụrụ Chineke pụta, lee, a na m asị unu nọdụ mma mgbe nile na-adigide, n’ihi na okwu ndị a cga-ama unu ikpe n’ụbọchị ikpeazụ.

15 N’ihi na ihe m rachiworo n’elu ụwa, ka a ga-ewepụta megide unu an’oche ikpe; n’ihi na otu a ka Onye-nwe nyeworo m iwu, ma a ga m eruberịrị isi. Amen.