Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 30


Isi 30

Ndị Jentaịlụ e mere ka ha chegharịa ka a ga-agụnye n’ime ndị ọgbụgba-ndụ—Ọtụtụ ndị Leman na ndị Juu ga-ekwenye n’okwu ahụ ma wee dị nma ile anya—Israel ka a ga-akpọtaghachi ma e bibie ndị ajọọ mmadu. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua lee, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, a ga m agwa unu okwu; n’ihi na mụ, Nifaị, agaghị ekwe ka unu na-eche na unu bụ ndị ezi-omume karịa ka ndị Jentaịlụ ga-abụ. N’ihi na lee, ma ọbụghị na unu ga-edebe iwu-nsọ nile nke Chineke unu ga-ala kwa n’iyi otu aka ahụ; ma n’ihi okwu nile nke ekwuworo unu ekwesịghị iche na ndị Jentaịlụ ga-abụ ndị ebibiri kpam kpam.

2 N’ihi na lee, a sị m unu na ka ha ra bụ ndị Jentaịlụ ga-echegharị ga-abụ andị ọgbụgba-ndụ nke Onye-nwe. Ma ka ha ra bụ bndị Juu na-agaghị echegharị ka a ga-achụpụ; n’ihi na Onye-nwe na onye ọbụla anaghị agba-ndụ ma ọbụghị ya na ndị cchegharịrị ma kwere n’Ọkpara ya, nke bụ Onye-Nsọ nke Israel.

3 Ma ugbua, a ga m ebu-amụma ole na ole gbasara ndị Juu na ndị Jentaịlụ karịa. N’ihi na mgbe akwụkwọ ahụ nke m kwuworo okwu maka ya ga-apụtawọrịị, ma buru ihe e depụtara nye ndị Jentaịlụ, ma rachie kwa ya ọzọ nye Onye-nwe, a ga-enwe ọtụtụ ndị aga-ekwere okwu nile ahụ e dere ede; ma ha bga-eburu ha gaa ruo ndị nke fọdụrụ na mkpụrụ-afọ anyị.

4 Ma mgbe ahụ ka ndị nke fọdụrụ na mkpụrụ-afọ anyị ga-amata ihe banyere anyị, otu ọbụ na anyị siri na Jerusalem pụta, ma na ha bụ ndị siri na agbụrụ nke ndị Juu.

5 Na ozi-ọma nke Jisus Kraịst ka a ga-ekwusa n’etiti aha; ya mere, ba ga-eweghachi ha baa n’ime cmmụta nke ndị nna ha nile, na kwa n’ime mmụta nke Jisus Kraịst, bụ nke enwetara n’etiti ndị nna ha nile.

6 Ma mgbe ahụ ka ha ga-an̄ụrị ọn̄ụ; n’ihi na ha ga-amata na ọbụ ngọzi nye ha site n’aka nke Chineke; ma mkpekere nile nke ọchịchịrị ha, ga-amalite ịdasị site n’anya ha nile; ma ọtụtụ ọgbọ agaghị agafe n’etiti ha, ruo mgbe ha ga-abụ andị di ọcha na ndị di nma ile anya.

7 Ma ọ ga-eru na andị Juu bụ ndị ekposasịkwara bga-amalite ikwere na Kraịst; ma ha ga-amalite ịbịakọta n’elu iru nke ala ahụ; ma ka ha ra bụ ndị ga-ekwere na Kraịst ga-aghọkwa otu aka ahụ ndị di mma ile anya.

8 Ma ọ ga-eru na Onye-nwe Chineke ga-amalite ọrụ ya n’etiti mba nile, ebo nile, asusụ nile, na ndị mmadụ, iwetazu mkpọtaghachị nke ndị ya n’elu ụwa.

9 Ma n’ezi-omume ka aOnye-nwe Chineke bga-ekpe ndị ogbenye ikpe, ma baa mba jiri ahataha maka ndị dị cnwayọ n’obi nke ụwa. Ma ọ ga-eti ụwa ihe otiti site n’okporo nke ọnụ ya; ma site kwa n’ume nke egbụgbere ọnụ ya ka ọ ga-eji gbuo ndị ajọọ mmadụ.

10 N’ihi na aoge na-abia ọsọ-ọsọ mgbe Onye-nwe Chineke ga-eweta nnukwu bnkewa n’etiti ndị mmadụ ahụ, ma ndị ajọọ mmadụ ka ọ ga-ebibi, ma ọ cga-edebe ndị ya, e, ọbụna ma ọbụrụ na ọ dga-ebibirịrị ndị ajọọ mmadụ site n’ọkụ.

11 Ma aezi-omume ga-abụ ihe njisi ukwu ike ya, ma ikwesị-ntụkwasị-obi ga-abụ ihe njisi ukwu ike ya.

12 Ma mgbe ahụ ka nkịta ọhịa aga-ebinyere nwa-atụrụ; ma agụ ga-edịnanyere nwa ewu, na nwa ehi, na nwa ọdụm, na anụ gbara abụba, ga-anọkọta; ma nwa ntakịrị ga-edu ha.

13 Ma ehi na anụ ukwu na-eri ibe ya ga-erịkọ; ụmụ ha nile ga-edịnakọta; ma ọdum ga-ata achara dịka oke ehi.

14 Ma nwa na-an̄ụ-ara ga-egwu egwu n’ọnụ agwọ ọjọọ, ma nwa anapụworo ara ga-etinye aka ya n’elu ebe obibi agwọ ọjọọ.

15 Ha agaghị emerụ arụ ma-ọbụ bibie n’ime ugwu-nsọ m; n’ihi na ụwa ga-ejupụta na ọmụma nke Onye-nwe dịka mmiri nile siri kpuchite osimiri.

16 Ya mere, ihe nile nke amba dum ka a ga-eme ka bamata; e, ihe nile ka a ga-eme ka amata nye ụmụ nke mmadụ.

17 Ọ dịghị ihe ga-abụ ihe nzụzọ ma ọbụghị na a aga-ekpughe ya; ọdịghị ọrụ ọchịchịrị ọbụla ma ọbụghị na a ga-eme ka ewepụta ya n’ìhè; ma ọdịghị ihe arachịrị arachị n’elu ụwa ma ọbụghị na a ga-atọpe ya.

18 Ya mere, ihe nile ekpugheworo nye ụmụ nke mmadụ, n’ụbọchị ahụ ka a ga-ekpughepu ha; ma Setan aagaghị enwekwa ike n’ebe obi nile nke ụmụ nke mmadụ dị ọzọ, wee ruo ogologo oge. Ma ugbua, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, a bịawo m na ngwụcha okwu m nile.