Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 16


Isi 16

Aịsaịa wee hụ Onye-nwe—Mmehie nile nke Aịsaịa ka agbagharaworo—A kpọrọ ya ka o buo amụma—O buru amụma maka ọjụjụ nke ndị Juu jụrụ ozizi nile nke Kraịst—Ụfọdụ ga-alaghachị. Tulee Aịsaịa 6. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 N’afọ nke eze Uzaịa nwụrụ, a hụkwara m Onye-nwe ka ọ nọ-ọdụ n’oche-eze, dị elu nke ewelitere elu, ma uwe-mwụda ya jupụtara temple ahụ.

2 N’elu ya ka ndị serafịm guzoro; nke ọbụla nwere nku isii; abụọ ka o jiri kpuchie iru ya, ma abụọ ka o jiri kpuchie ụkwụ ya, ma abụọ ka o ji na-efe efe.

3 Ma otu wee tikuo ibe ya, ma si: Nsọ, nsọ, nsọ, ka Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha dị; elu ụwa nile jupụtara n’ebube ya.

4 Ma okporo nile nke ọnụ-ụzọ mere mkpọtụ mgbe ha nụrụ ọlụ onye ahụ na-akpọ oku, ma ime ụlọ ahụ jupụtara n’anwụrụ ọkụ.

5 Mgbe ahụ a sịrị m: Ahụhụ na-adịri m! n’ihi na alawo m n’iyi; n’ihi na a bụ m onye egbụgbere-ọnụ ya nile na-adịghị ọcha; ma a na m ebinyekwara ndị egbụgbere-ọnụ ha nile na-adịghị ọcha; n’ihi na anya m abụọ ahụwo Eze ahụ, bụ Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha.

6 Mgbe ahụ otu n’ime ndị serafịm ahụ wee fekwute m, jide icheku na-enwu ọkụ n’aka ya, nke o ji mkpa wepụta site n’ebe nchụ-aja;

7 Ma ọ tụkwasị ya n’elu ọnụ m, ma sị: Lee, nke a emetụwo egbụgbere ọnụ gị nile; ma ajọọ omume gị ka ebupụworo, ma mmehie gị ka asachaworo.

8 Ọzọ a nụrụ m olu nke Onye-nwe, ka ọ na-asị: Onye ka m ga-eziga, ma onye ga-ejere anyị? Mgbe ahụ asịrị m: N’ebe a ka m nọ; ziga m.

9 Ma o wee sị: Gaa ma gwa ndị a—Nụrụ nụ n’ezie, mana ha aghọtaghị; ma hụnụ n’ezie, ma ha ahụghị.

10 Mee ka obi ndị a buo ibu, ma mee ka ntị ha nile dị arụ, ma mechie anya ha nile—ka ha ghara iji anya ha hụ ụzọ, ma jịrị ntị ha nile nụ ihe, ma jịrị obi ha ghọta ihe, ma bụrụ ndị agbanwere ma mee ka a gwọọ ha.

11 Mgbe ahụ asịrị m: Onye-nwe, ruo ole mgbe? Ma o wee si: Ruo mgbe obodo-ukwu nile ga-abụ ihe e bibiri na-enweghị onye bi n’ime ha, ma ụlọ nile na-enweghị mmadụ, ma ala ahụ wee bụrụ ihe tọgbọrọ n’efu;

12 Ma Onye-nwe ewepụsịwo onye ọbụla ebe dị anya, n’ihi na a ga-enwe nnukwu ebe ahapụrụ ahapụ n’etiti ala ahụ.

13 Ma na a ga-enwe otu ụzọ n’ụzọ iri, ma ha ga-alaghachị, ma a ga-eri ha, dịka osisi teil na osisi oak, ndị nke ndụ na-adị n’ime ha mgbe ha gbụsịrị akwụkwọ ha; ya mere mkpụrụ-osisi nsọ ga-abụ ihe dị n’ime ya.

      • NB ihe dika 750 tutu a mụọ Kraịst.

      • NB isiakwa ya, ma-ọbụ nke uwe ala ala ya.

      • HIB nto-ala nile nke ọnụ-ụzọ nile mara jijiji.

      • HIB bepụ; n.b. uche zuru oke o nwetara maka mmehie ya nile na nke ndi ya gweriri ya.

      • NB otu akara nke ime ka ọ dị ọcha.

      • NB Dika otu osisi, na-agbanyeghi na-agbasasiri akwụkwọ ya nile, ndụ na ike ịmịpụta mkpụrụ ka fọdụrụ n’ime ya.

Bipụta