Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 14


Isi 14

Zaịọn na ụmụada ya ka a ga-agbapụta ma sachaa ha n’ụbọchị ndị ahụ Jisus ga-achị otu puku afọ—Tulee Aịsaịa 4. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma n’ụbọchị ahụ, ndịnyom asaa ga-ejide otu nwoke, sị: Anyị ga-eri nri nke aka anyị, ma yiri uwe nke aka anyị; nanị kwe ka akpọkwasị anyị aha gị ka ewepụ aịta-ụta anyị.

2 N’ụbọchị ahụ ka angalaba nke Onye-nwe ga-ama mma nwee otuto; mkpụrụ nke ụwa ga-adị ezi mma ma kwesị ekwesị nye ha bụ ndị si n’Israel gbapụ.

3 Ma ọ ga-eru, ndị nile fọdụrụ na Zaịọn ma nọgide na Jerusalem a ga-akpọ ha ndị dị nsọ, onye ọbụla edebara n’etiti ndị dị ndụ na Jerusalem—

4 aMgbe Onye-nwe bga-asachapuwọrịị unyi nke ụmụada Zaịọn, ma ga-emechapụwọrịị ọbara nke Jerusalem site n’etiti ya site na mụọ nke ikpe-ikpe na site na mụọ nke cnrechapụ.

5 Ma Onye-nwe ga-ekepụta n’elu ebe obibi nile nke ugwu Zaịọn, na n’elu ọgbakọ ya nile, aigwe ojii na anwụrụ ọkụ n’ehihie na mmụke nke ọkụ na-ere ere n’abalị; n’ihi na n’elu ebube nile nke Zaịọn ka nchebe ga-adị.

6 Ma a ga-enwe ebe obibi ga-abụ ndo n’ehihie maka okpom ọkụ, ma maka ebe amgbaba, na ebe nchebe maka ebili mmiri na maka mmiri ozuzo.