Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 24


Isi 24

Israel ka a ga-akpọkọta ma ha ga-enwe ọn̄ụ n’oge ezumike nke oge ọchịchị otu puku afọ n’ụwa—Lusịfa ka achụpụrụ site n’elu-igwe n’ihi nnupụ-isi—Israel ga-emeri Babịlọn (ụwa).—Tulee Aịsaịa 14. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 N’ihi na Onye-nwe ga-enwe obi ebere n’arụ Jekọb, ma arọpụtakwa Israel, ma debe ha n’ala nke aka ha; ma bndị mba ọzọ ka a ga-etịkọtara ha, ma ha ga-arapara n’ụlọ nke Jekọb.

2 Ma andị ahụ ga-akpọrọ ha ma kpọta ha n’ebe ha nọ; e, site n’ebe dị anya wee ruo na nsọtụ nile nke ụwa; ma ha ga-alaghachị bn’ala nile e kwere ha na nkwa. Ma ụlọ nke Israel ga-enwe ha, ma ala nke Onye-nwe ga-abụ maka cụmụ-oru nile na ụmụ-nwanyị na-eje ozi; ma ha ga-adọkpụrụ ha n’agha nye kwa ndị dọkpụụrụ ha n’agha; ma ha ga achị ndị nile chịrị ha ọchịchị aka ike.

3 Ma ọ ga-eru n’ụbọchị ahụ na Onye-nwe ga-enye gị aezumike, site na mwute gị, na site n’ịtụ egwụ gị, na site n’ịbụ oru-ike nke akwanyere gị n’ime ya ka ị jee ozi.

4 Ma o ga-eru n’ụbọchị ahụ, na ị ga-ewelite ilu a megide eze nke aBabịlọn, ma sị: Lee otu onye-ọchịchị-aka ike siri kwụsị, obodo-ukwu nke ọla-edo akwụsị!

5 Onye-nwe agbajiwo mkpa-n’aka nke ndị-ajọọ-omume, okporo nile nke ndị ọchịchị nile.

6 Ya bụ onye merụrụ ha arụ n’iwe ọkụ site n’iti ha ihe na-esepụghị aka, ya bụ onye chịrị mba nile n’iwe, a na-esogbu ya, ma ọdịghị onye ga-egbochị.

7 Ụwa nile ezuwo ike, ma daa jụụ; ha etipụwo mkpu aabụ.

8 E, aosisi fir nile na-an̄ụrị n’ihi gị, na kwa osisi cedar nile nke Lebanọn, na-asị: Site n’oge batọgbọworo gị n’ala ọ dịghị conye-ogbu-osisi biliteworo imegide anyị.

9 aAla-mụọ site n’okpuru ka e meworo ka ọ pụọrọ gị ịbịakwute gị n’ọbịbịa gị; ọ na-akpọlite bndị nwụrụ-anwụ n’ihi gị; ọbụna ndị nile bụ ndị a ma-ama nke ụwa; o kulitewo site n’oche-eze ha ndị eze nile nke mba nile.

10 Ihe nile ha ga-ekwu na-asị gị: Ị bụrụwo onye-na-adịghị ike dịka anyị? Ị dịwokwa ka anyị?

11 Oke ịma mma gị ka e ewedatara ala ruo n’ili; adịghị anụ kwa mkpọtụ nke une gị ọzọ; ikpuru ka agbasaworo n’okpuru gị, ma ịkpuru ndị a kpuchiri gị:

12 aLee otu i si daa site n’elu-igwe, O bLusịfa, nwa nwoke nke ụtụtụ! E gbudawo gị n’ala, gị onye mere ka ike gwụ mba nile!

13 N’ihi na i sịwo n’obi gị: aAga m arịgoro n’ime elu-igwe, aga m ebuli oche-eze m elu karịa kpakpando nile nke Chineke; aga m anọdu kwa n’elu ugwu nke igwe ndị ọgbakọ, n’akụkụ nile nke belu elu.

14 Aga m arịgoro n’ebe di elu karịa igwe ojii nile; aga m adị ka onye-kachasị ihe nile elu.

15 Mana, a ga-eweda gị n’ala mụọ, n’akụkụ nile nke aolulu ahụ.

16 Ndị na-ahụ gị aga-elekwasị gị anya nke-nke, ma ha ga-atule gị, ma ha ga-asị: Nke a ọ bụ nwoke ahụ nke mere ka ụwa maa jijiji, nke kwagharịrị ọtụtụ ala-eze?

17 Ma mee ụwa ka ọ dịka ọzara, ma bibie obodo-ukwu nile dị n’ime ya, ma o megheghị ụlọ nke ndị mkpọrọ ya?

18 Ndị eze nile nke mba nile, e, ha nile, dina n’otuto, onye ọbụla n’ime ha an’ụlọ nke aka ya.

19 Mana a tụpụrụ gị site n’ili gị dịka angalaba ihe-arụ, na ndị nke fọdụrụ egbuworo, ndị e ji mma agha dupuo, ndị na-agbada ru bn’okwute nile nke olulu ahụ; dịka ozu a na azọgide ụkwụ.

20 A gaghị ejikọta gị na ha n’olili, n’ihi na ibibiwo ala gị ma gbuo ndị gị; amkpụrụ nke bndị ajọọ-omume ka anagaghị enye ugwu.

21 Dozie ebe ogbugbu maka ụmụ ya n’ihi aajọọ-omume nile nke ndị nna ha, ka ha ghara ibilite, ma-ọbụ nwere ala ahụ, ma-ọbụ jiri obodo ukwu nile wujuo iru elu ụwa.

22 N’ihi na aga m ebili megide ha, ka Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha kwuru, ma bepụ site na Babịlọn aha aahụ, na ndị fọdụrụ, na nwa nwoke, na bnwa nwoke nke nwanne, ka Onye-nwe kwuru.

23 Aga kwa m eme ya aihe onwunwe nke ụmụ nnụnụ, na ọdọ nile nke mmiri; ma a ga m eji bazịza nke mbibi zachapụ ya, ka Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha kwuru.

24 Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha an̄ụwo iyi, na-asị: N’ezie dịka m cheworo otu a ka ọ ga-esi mezuo; ma dịka m zubeworo, otu a ka ọ ga-eguzo.

25 Na m ga-akpọta ndị aAsirịa n’ime ala m, na n’elu bugwu m nile zọpịa ya n’okpuru ụkwụ m; mgbe ahụ ka cihe nkedo ya ga-esi n’ebe ha nọ pụọ, ma ibu-arọ ya si n’elu ubu ha nile pụọ.

26 Nke a bụ nzube ahụ nke ezubere n’elu ụwa nile; ma nke a bụ aka ahụ nke esetịpụrụ n’elu amba nile.

27 N’ihi na Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha ezubewo, ma onye ga-agbanwe ya? Ma aka ya esetịpụwo, ma onye ga-achụghachị ya azụ?

28 N’ime aafọ nke eze bAhaz nwụrụ ka ibu-arụ a dị.

29 An̄ụrịla ọn̄ụ, gị Palestaịna dum, n’ihi na okporo nke onye a tiri gị ihe a gbajiwo; n’ihi na site na mgbọrọgwụ agwọ ka agwọ ọjọọ ga-esi pụta, ma mkpụrụ ya ga-abụ agwọ-ofufe dị ọkụ.

30 Ma nwa-mbụ nke onye-ogbenye ga-eri ihe, ma ndị mkpa na-akpa ga-edịna ala na nchekwa; ma aga m eji oke ụnwụ gbuo mgbọrọgwụ gị, ma ọ ga-egbu ndị gị fọdụrụ.

31 Tisie ike, O ọnụ-ụzọ-ama; bee akwa, O obodo-ukwu; gị Palestaịna dum, a gbariwo gị; n’ihi na anwụrụ ọkụ ga-esi n’elu-elu bịa, ma ọdịghị onye ọbụla ga-anọ nanị ya n’oge nile nke ya a kara aka.

32 Mgbe ahụ gịnị ka ndị-ozi nile nke mba nile ga-aza? Na Onye-nwe ewusịwo aZaịọn ike, ma bndị ogbenye nke ndị ya cga-atụkwasị ya obi.