Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 15


Isi 15

Ubi vine Onye-nwe ahụ (Israel) ga-atọgbọrọ n’efu, ma ndị ya ka a ga-ekposasị—Ọtụtụ ahụhụ ga-abịakwasị ha n’ime ngọnarị-okwukwe na ọnọdụ mkposasị ha—Onye-nwe ga-ewelite ọkọlọtọ ma chịkọta Israel—Tulee Aịsaịa 5. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma mgbe ahụ ka m ga-abụrụ onye m hụrụ n’anya ezi aabụ nke onye m hụrụ n’anya, metụta ubi-vine ya. Onye m hụrụ n’anya ezie nwere ubi-vine n’ime ugwu na-amị ezi mkpụrụ.

2 Ma ọ gbara ya ogige, ma chịkọpụtachaa okwute nile dị ya, ma kụọ aosisi vine ndị dị ya mma, ma wuo ụlọ-elu tọwa n’etiti ya, ma mee kwa ebe ịpịpụta mmanya n’ime ya; ma o lee anya na ọ ga-amịta mkpụrụ-vine, ma ọ mịtara mkpụrụ-vine ọhịa.

3 Ma ugbua, O unu ndị bi na Jerusalem, na ndị nke Juda, kpee nụ ikpe, arịọ m unu, n’etiti mụ na ubi-vine m.

4 Gịnị ka e kwesịkwara ime ọzọ n’ubi-vine m nke m na-emebeghi n’ime ya? Ya mere, mgbe m tụworo anya na ọ ga-ewepụta mkpụrụ-vine, o wepụtara mkpụrụ-vine ọhịa.

5 Ma ugbua, gaanụ, a ga m agwa unu ihe m ga-eme ubi-vine m—aa ga m ewepụ ogige ya, ma a ga-erichapụ ya; ma a ga m etịkpọ mgbidi ya, ma ọ ga-abụ ebe azọdara ala;

6 Ma a ga m ebibi ya; a gaghị akwacha ma-ọbụ gwuo ya, ma aogwu na uke ga-epupụta; a ga kwa m enye igwe ojii nile iwu ka ha ghara bizokwasị ya mmiri.

7 N’ihi na aubi vine nke Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha bụ ụlọ nke Israel, ndịkom nke Juda bụ ihe ọkụkụ nke na-atọ ya ụtọ nke ukwuu; ma o lere anya bikpe-zịrị-ezi, ma lee, ọchịchị-aka-ike; n’ọnọdụ ezi-omume, ma lee, iti mkpu akwa.

8 Ahụhụ na-adịrị ha bụ ndị na ejikọta aụlọ na ụlọ, ruo mgbe n’onwekwaghị ebe ga-adị, na a ga-etinye bnanị ha n’etiti ala ahụ!

9 Na ntị nke m, otu a ka Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha kwuru, n’ezie ọtụtụ ụlọ ga atọgbọrọ n’efu, ma ọtụtụ nnukwu obodo-ukwu agaghị enwe ndị bi n’ime ha.

10 E, oke ala eka iri nke ubi-vine ga amịpụta otu aabọ, ma mkpụrụ-osisi nke họma ga amịpụta otu efa.

11 Ahụhụ na-adịrị ha bụ ndị na-ebili ọtọ n’isi ụtụtụ, ka ha wee agbaso ihe ọn̄ụn̄ụ siri ike, ndị na-aga n’iru ruo abalị, ma bmmanya wee nwuo ha ọkụ n’arụ!

12 Ma ụbọ akwara, na une, na egwụ otiti na ọja na mmanya dị n’ihe ọgbakọ-oriri ha nile; mana aha anaghị echeta ọrụ nke Onye-nwe, ọbụghị ma ha na atule ọrụ nke aka Ya abụọ.

13 Ya mere, ndị m agawo n’ime ndọkpụ n’agha, n’ihi na ha enweghị ammụta; ma ndị-ana-enye-nsọpụrụ n’ime ha, akpịrị akpọwo ha nkụ, ma igwe mmadụ ha akpọwo nkụ na-enweghị ihe ọn̄ụn̄ụ.

14 Ya mere, ala-mụọ asawo mbara, ma meghee ọnụ ya otu na-enweghị atụ; ma otuto ha, na igwe ha, na ihe ngosi ha, ma onye nke na-an̄ụrị ọn̄ụ, ga arịda n’ime ya.

15 Ma nwoke na-abụghị ezigbo mmadụ ka a ga-eweda ala, ma onye bụ dike ka a ga-ewedata, ma anya nke ndị na-eweli onwe ha elu ka a ga-ewedata ala.

16 Mana Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha ka a ga-ebuli elu an’ikpe, ma Chineke nke dị nsọ ka a ga-asacha n’ezi-omume.

17 Mgbe ahụ ka ụmụ atụrụ ga-eri ihe n’ụdị nke ha, ma ebe bibiworo ebibi nke ndị buru ibu ka ndị ọbịa ga-eri.

18 Ahụhụ na-adịri ha bụ ndị na-adọkpụrụ ajọọ-omume n’eriri nke aihe-efu, ma na-emehie bdịka eriri e ji adọkpụ ụgbọ-ala;

19 Ndị na-asị: Ka, o amee ngwa ngwa, rụọ ọrụ ya ọsọ-ọsọ, ka anyị bhụ ya; ma ka ndụmọdụ nke Onye-Nsọ nke Israel rute nso ma bịa, ka anyị mata ya.

20 Ahụhụ na-adịrị ha bụ ndị ana-akpọ ihe ọjọọ ihe ọma, na ihe ọma ihe ọjọọ, ndị na-etinye bọchịchịrị n’ọnọdụ ìhè, na ìhè n’ọnọdụ ọchịchịrị, ndị n’etinye ihe ilu n’ọnọdụ ihe ụtọ, na ihe ụtọ n’ọnọdụ ihe ilu!

21 Ahụhụ na-adịrị andị maara ihe n’anya nke onwe ha na ndị na-akpachapụ-anya n’olile-anya nke onwe ha!

22 Ahụhụ na-adịrị ndị dị ike n’ịn̄ụ mmanya, na ndịkom nwere ume n’ịgwakọta mmanya ndị siri ike.

23 Ndị na-agụ ndị ajọọ-omume ka ndị ziri-ezi maka nketa uru, ma awezuga-agwa ezi-omume nke onye ezi-omume site n’arụ ya!

24 Ya mere, dịka aọkụ sị erechapụ bahihịa-kpọrọ-nkụ, na ire ọkụ na-erichapụ cafụrụ, mgbọrọgwụ ha ga-abụ ire ure, ma ifuru ha ga-alali elu dịka uzuzu; n’ihi na ha atụfuwo iwu nke Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha, ma dlelịa okwu nke Onye-Nsọ nke Israel.

25 Ya mere, aiwe nke Onye-nwe wee dị ọkụ megide ndị ya, ma o setịpụwo aka Ya megide ha, ma tiwo ha ihe; ma ugwu nile mara jijiji, ma ozu ha nile ka adọkasịrị n’etiti ụzọ nile. N’ihi ihe nile ndị a iwe ya atụgharịghị, kama aka ya ka ọ ka setịpụtara.

26 Ma ọ ga-ewelite aọkọlọtọ Ya elu nye mba nile site n’ebe dị anya, ma ọ ga-eji bopi-ọnụ kpọkọta ha site n’ebe ụwa sọtụrụ; ma lee, ha ga-eji ike cbịa ọsọ-ọsọ; ọdịghị onye ike ga-agwụ ma-ọbụ kpọbie-ụkwụ n’etiti ha.

27 Ọdịghị onye ga-ero ụra ma-ọbụ rahụ ụra; ọbụghị ma ihe njisi-ukwu ha ike ọ ga-atọpụ, ma-ọbụ eriri akpụkpọ-ụkwụ ha ọ ga-adọbi;

28 Ndị akụ ha nile ga-adị nkọ, ma ụta ha nile ga-arọzi, ma ụkwụ ịnyịnya ibu ha nile ka a ga-agụnye dịka okwute, ma ụkwụ igwe ugbọ-ala ha nile ga-efegharị n’ike n’ike dịka oke ifufe, mbigbọ ha ga-adị ka nke ọdụm.

29 Ha ga-ebigbọ dịka ụmụ aọdụm; e, ha ga-ebigbọ, ma jide anụ-ịkpa-nri ha, ma ha ga-eburu ha laa n’enweghị nsogbu, ma ọdịghị onye ga-anapụta.

30 Ma n’ụbọchị ahụ ha ga-ebigbọ megide ha dịka mbigbọ nke oke osimiri; ma ọbụrụ na ha lee anya n’ala, lee, ọchịchịrị na iru uju, ma ìhè ahụ ga-agba ojii n’elu-igwe nile ebe ahụ.