Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 26


Isi 26

Kraịst ga-ekwusara ndị Nifaị ozi-ọma—Nifaị wee hụ mbibi nke ndị ya n’oge—Ha ga-ekwu okwu site n’uzuzu—Ndị Jentaịlụ ga-ewulite ọtụtụ nzukọ ụgha na ntụgwa nzuzo nile—Onye-nwe wee gbochịe ndị mmadụ ime nchụ-aja aghụghọ. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma mgbe Kraịst aga-ebilitewọrịị n’ọnwụ ọ bga-egosị unu onwe ya, ụmụ m, na ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya; ma okwu ndị ahụ ọ ga-agwa unu ga-abụ ciwu nke unu ga-eme.

2 N’ihi na lee, asị m unu na ahụwo m na ọtụtụ ọgbọ ga-agafe, na a ga-alụ ọtụtụ nnukwu agha nile na ndọrọ-ndọrọ nile n’etiti ndị m.

3 Ma mgbe Mesaịa ahụ ga-abịawọrịị, a ga-enwe ọtụtụ aihe iriba-ama a ga-enye ndị m maka bọmụmụ ya, na kwa maka ọnwụ ya na mbilite-n’ọnwụ ya, ma ọ ga-abụ nnukwu na ụbọchị dị egwụ nye ndị ajọọ-omume, n’ihi na ha ga-ala-n’iyi, ma ha na-ala n’iyi n’ihi na ha chụpụrụ ndị-amụma nile na ndị-nsọ nile, ma tụọ ha okwute, ma gbuo ha; ya mere akwa nke cọbara ndị nsọ nile ga-agbagoru Chineke site n’ala megide ha.

4 Ya mere, ndị mpako nile, na ndị na-eme ajọ-omume, ụbọchị nke na-abịa aga-akpọ ha ọkụ, otu a ka Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha kwuru, n’ihi na ha ga-adị ka mkpirisi-osisi refọrọ-erefọ.

5 Ma ndị ahụ na-egbu ndị-amụma, na ndị nsọ nile, omimi nile nke ụwa aga-elo ha, otu a ka Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha kwuru; ma bugwu ukwu nile ga-ekpuchi ha, ma ufufe gburu-gburu nile ga-ebupu ha, ma ụlọ ga-adagide ha ma kurisie ha irighiri irighiri ma gwerie ha ka ha ghọọ ntụ.

6 Ma a ga-eji egbe-elu-igwe leta ha, na amụma nile, na ala-ọma-jijiji nile, na ụdị mbibi nile dị iche iche, n’ihi na ọkụ nke iwe nke Onye-nwe ka a ga-emenwu megide ha, ma ha ga-adị ka mkpirisi-osisi refọrọ erefọ, ma ụbọchị nke na-abịa ga-erechapụ ha, otu a ka Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha kwuru.

7 O mgbu ahụ, na nnukwu mgbu nke mkpụrụ-obi m n’ihi ntufu nke ogbugbu nke ndị m! N’ihi na mụ, Nifaị, ahụwo ya, ma ọ fọdụrụ ntakịrị ka oregbuo m n’iru nke Onye-nwe; mana a ga m ebeku Chineke m: Ụzọ Gị nile azịrị-ezi.

8 Ma lee, ndị ezi-omume ndị na-an̄a-ntị n’okwu nile nke ndị-amụma, ma ghara ibibi ha, ma lekwasị anya na Kraịst na nkwụsi ike n’ihi ihe ịrịba-ama nile bụ ndị e nyeworo, na -agbanyeghị ansogbu nile—lee, ha bụ ndị bna-agaghị ala-n’iyi.

9 Mana Ọkpara nke Ezi-omume aga-apụtakwute ha; ma ọ bga-agwọ ha, ma ha ga-enwe cudo ha na ya, wee ruo mgbe dọgbọ atọ gafesịworo, ma ọtụtụ n’ime eọgbọ nke anọ ga-agafewo n’ezi-omume.

10 Ma mgbe ihe ndị a nile ga-agafewọrịị, ambibi dị ọsọ ọsọ ga-abịakwasị ndị m; n’ihi na na-agbanyeghị ihe mgbu nile nke obi m, a hụwo m ya; ya mere, a ma m na ọ ga-emezu; ma ha na-ere onwe ha n’ihe efu; n’ihi na, maka ọkwụkwụ-ụgwọ nke nganga ha na nzuzu ha, ha ga-aghọta mbibi; n’ihi na maka ha na-ekwenyere ekwensu ahụ ma na-ahọrọ ọrụ nile nke ọchịchịrị karịa ìhè, ya mere, ha ga-agbadarịrị bn’ala mụọ.

11 N’ihi na Mụọ nke Onye-nwe agaghị aanọgide ya na mmadụ oge nile. Ma mgbe Mụọ ahụ kwụsịrị inọnyere mmadụ, mgbe ahụ ka mbibi ọsọ ọsọ ga-abịa, ma nke a na-ewute mkpụrụ-obi m.

12 Ma dịka m kwuru gbasara ime ka ndị aJuu bkwenye, na Jisus bụ cKraịst ahụ, ọ ga-adịkwa mkpa na ndị Jentaịlụ ga-ekwenye kwa na Jisus bụ Kraịst ahụ, bụ Chineke nke mgbe Ebighi-ebi;

13 Ma na ọ na-egosipụta onwe ya nye ndị nile kwere na ya, site n’ike nke aMụọ Nsọ; e, nye mba nile, ebo, asụsụ na mmadụ nile, na-arụ ọrụ-ebube nile siri ike, ihe iriba-ama nile, na ihe-ebube nile, n’etiti ụmụ nke mmadụ dịka okwukwe ha siri dị.

14 Ma lee, a na m eburu gị amụma gbasara aụbọchị ikpe-azụ nile; gbasara ụbọchị ndị ahụ mgbe Onye-nwe Chineke bga-ewepụta ihe ndị a nile nye ụmụ nke mmadụ.

15 Mgbe mkpụrụ-afọ m na mkpụrụ-afọ nke ụmụnne m ga-adaghachị-azụ n’ekweghị ekwe, ma bụrụ ndị etigburu site n’aka ndị Jentaịlụ; e, mgbe Onye-nwe Chineke ka binyeworo onwe ya gburu-gburu imegide ha, ma were ugwu bịakwasị ha ma welite ebe arụsịrị-ike elu megide ha; ma mgbe a ka budataworo ha daruo ala n’ime uzuzu, ọbụna ruo na ha-anọghịkwa, ma na okwu nile nke ndị ezi-omume ka a ga-ede, ma ekpere nke ndị nwere okwukwe ka a ga-anụ, ma ndị nile na-adaghachị laa azụ n’ekweghị ekwe agaghị echefu ha.

16 N’ihi na ndị a ga-ebibi aga-agwa ha okwu site n’ime ala, ma olu-okwu ha ga-adị ala site n’ime uzuzu, ma olu ha ga-adị ka nke onye nwere mụọ adị mbụ mara amara; n’ihi na Onye-nwe Chineke ga-enye ya ike, ka o wee gbaa-izu gbasara ha, ọbụna dịka o si n’ime ala; ma olu okwu ha ga-agba-izu site n’uzuzu.

17 N’ihi na otu a ka Onye-nwe Chineke kwuru: aHa ga-ede ihe nile ndị a ga-eme n’etiti ha, ma a ga-ede ma rachie ha n’ime akwụkwọ, ma ndị ahụ na-alaghachị azụ n’ekweghị ekwe a gaghị enweta ha, n’ihi na ha bna-achọ ibibi ihe nke Chineke nile.

18 Ya mere, dịka ndị ebibiworo, ebibiworiị ha ọsọ-ọsọ; ma igwe ndị ha ndị dị oke egwu ga-adị ka aafụrụ na-agafe agafe—e, otu a ka Onye-nwe Chineke kwuru: Ọ ga-abụ n’otu ntabi-anya, na mberede—

19 Ma ọ ga-eru, na ndị ahụ na-ala azụ n’ekweghị ekwe ka a ga-eme ka ha ataa ahụhụ site n’aka ndị Jentaịlụ.

20 Ma ndị Jentaịlụ na-ebuli onwe ha elu na ampako nke anya ha, ma ha bakpọbiwo ụkwụ, n’ihi ịdị ukwuu nke cosisi mkpọbi-ụkwụ ha, ka ha wuliteworo otutụ dnzụkọ; otu o sila dị, ha na-eweda ike na ọrụ ebube nke Chineke, ma na-ekwusalite nye onwe ha, amamihe nke onwe ha ena mmụta nke onwe ha, ka ha wee nweta uru ma fgwerie n’elu iru ndị ogbenye.

21 Ma e nwere ọtụtụ ụlọ-nzukọ e wuru, ndị na-akpata antaji-anya, na esem-okwu, na echiche-ọjọọ.

22 Ma e nwekwara antụgwa-nzuzo nile, ọbụna dịka n’oge ochie, dịka ntụgwa nile nke ekwensu, n’ihi na ọ bụ onye chọpụtara ihe ndị a nile; e, onye-nchọpụta nke igbu-mmadụ, na ọrụ nile nke ọchịchịrị; e, ma o ji eriri dị nro na-edu ha n’olu, ruo mgbe ọ ga-eji eriri siri ike kee ha ruo mgbe nile.

23 N’ihi na lee, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, a na m agwa unu na Onye-nwe Chineke anaghị arụ ọrụ n’ọchịchịrị.

24 Ọ naghị eme ihe ọbụla ma ọbụghị na ọ ga-abara ụwa uru; n’ihi na ọ ahụrụ ụwa n’anya, ọbụna na ọ tọgbọrọ ndụ nke ya ka o wee kpọta bmmadụ nile n’ebe ọ nọ. Ya mere, onweghị onye ọbụla o nyere iwu ka ọ ghara iketa oke na nzọpụta ya.

25 Lee, ọ na-etiku onye ọbụla, na-asị: Si n’ebe m nọ pụọ? Lee, a sị m unu, E-e; mana ọ na-asị: aBịakwutenu m unu nsọtụ nile nke ụwa, bzụrụ mmiri-ara ehi na mmanụ-an̄ụ, na-ejighi ego, na na-enweghị ọnụ ahịa.

26 Lee, o nyewo onye-ọbụla iwu ka ha si n’ụlọ-nzukọ nile pụọ, ma-ọbụ site n’ụlọ nile nke ekpere? Lee, a sị m unu, E-e.

27 O nyewo onye-ọbụla iwu na ha agaghị eketa oke na anzọpụta ya? Lee, a sị m unu, E-e; mana o bnyewo ya n’efu maka mmadụ nile; ma o nyewo ndị Ya iwu ka ha gbaa mmadụ nile ume ka ha cchegharịa.

28 Lee, Onye-nwe o nyewo onye-ọbụla iwu ka ha ghara iketa oke n’idi mma ya? Lee, a sị m unu, E-e; kama ammadụ nile nwere ohere otu onye dịka ibe ya, ma ọdịghị ndị ọ na-egbochi.

29 O nyere iwu na a gaghị enwe anchụ-aja aghụghọ; n’ihi na lee, nchụ-aja aghụghọ nile bụ na ndị mmadụ na-ekwusa ma debe onwe ha ka ha bụrụ ìhè nye ụwa, ka ha wee nweta uru na botuto nke ụwa; mana ha adịghị achọ ọdịmma nke Zaịọn.

30 Lee, Onye-nwe egbochiwo ihe nke a; ya mere, Onye-nwe Chineke enyewo iwu-nsọ na mmadụ nile ga-enwe aafọ-ọma, afọ-ọma nke bụ bịhụnanya, ma ewezuga na ha ga-enwe afọ-ọma ọdịghị ihe ha bụ. Ya mere, ọ bụrụ na ha ga-enwe afọ-ọma ha agaghị ekwe ka onye-na-arụ ọrụ na Zaịọn laa n’iyi.

31 Ma na onye-na-arụ ọrụ na aZaịọn ga arụrụ Zaịọn ọrụ; n’ihi na ọbụrụ na ha na-arụ maka inweta bego ha ga-ala-n’iyi.

32 Ma ọzọ, Onye-nwe Chineke enyewo aiwu na ndị mmadụ agaghị egbu mmadụ; na ha agaghị ekwu okwu ụgha; na ha agaghị ezu ori; na ha agaghị eji aha Onye-nwe bụ Chineke ha eme bihe efu; na ha agaghị ekwo ekworo; na ha agaghị enwe echiche-ọjọọ; na ha agaghị adọ ndọrọ-ndọrọ onye na ibe ya; na ha agaghị agba akwụnakwụna, na ha agaghị eme nke ọbụla n’ime ihe ndị a nile; n’ihi na onye ọbụla mere ha ga-ala-n’iyi.

33 N’ihi na ọdịghị nke ọbụla n’ime ajọọ-omume ndị a si n’ebe Onye-nwe nọ bịa; n’ihi na ọ na-eme nke dị mma n’etiti ụmụ nke mmadụ; ma ọdịghị ihe ọ na-eme ma ọbụghị na ụmụ nke mmadụ ghọtara ya; ma ọ na-akpọ ha nile ka ha bịakwute ya ma keta oke n’ịdị mma ya; ma ọdịghị onye ọ ana-ajụ bụ onye na-abịakwute ya, ndị ojii na ndị ọcha, ndị oru na ndị nwe onwe ha, nwoke na nwanyị; ma ọ na-echeta bndị na-ekweghị ekwe; ma cha nile dị otu ụdị n’anya Chineke, ma ndị Juu ma ndị Jentaịlụ.