Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 20


Isi 20

Mbibi nke Asịria ahụ bụ ụdị mbibi nke ndị ajọọ-mmadụ n’oge Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ—Mmadụ ole na ole ga-afọdụ mgbe Onye-nwe bịaworo ọzọ—Ndị nke Jekọb fọdụrụ ga-alaghachị n’ụbọchị ahụ—Tulee Aịsaịa 10. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 Ahụhụ na-adịrị ha bụ ndị na-eme iwu, iwu ajọọ-omume nile, na ndị na-ede ihe arịrị nile nke ha jiri aka ha depụta:

2 Ị chụghachị ndị mkpa na-akpa site an’ikpe, na ịnapụ ha ihe ruru ha, ịnapụ ọnọdụ ndị ogbenye n’etiti ndị m, ka bndịnyom isi mkpe wee bụrụ anụ ikpa-nri ha, na ka ha wee zuo ndị na-enweghị nna ori!

3 Ma gịnị ka unu ga-eme n’ụbọchị anleta, na n’ịtọgbọrọ n’efu nke ga-esi n’ebe dị anya bịa? Onye ka unu ga-agbakwuru maka enye m-aka? Ma ole ebe ka unu ga-ahapụ otuto unu?

4 Ewezuga m ha ga-erudata-isi ala n’okpuru ndị-mkpọrọ nile, ma ha ga-ada n’okpuru ndị egburu-egbu. N’ihi ihe nile ndị a iwe ya alaghachịghị azụ, kama aka ya ka setịpụtara.

5 O onye-Asirịa, okporo nke iwe ọkụ m, ma mkpa-n’aka dị n’aka ha bụ aoke iwe ha.

6 A ga m eziga ya amegide mba iru-abụọ, ma megide ndị m na-ewere iwe ọkụ ka m ga-enye ya ike iwere ihe-nkwata nke agha, na iwere anụ ikpa-nri ha, na ịzọda ha ala dịka apịtị nke ụzọ nile.

7 Otu ọbụla o si dị ọbụghị ebum-n’obi ya, ọbụghị ma obi ya ọ na-eche otu ahụ; mana n’ime obi ya ọ bụ ibibi na ibepụ ọtụtụ mba ọbụghị ole na ole.

8 N’ihi na ọ na-asị: Ọ bụ na ụmụ ndịkom ndị eze m nile ha abụghị ndị eze?

9 Kalno ọ dighị ka Kakemịsh? Hemat ọ dighị ka Apad? Samerịa ọ dịghị ka Damaskọs?

10 Dịka aaka m rụpụtaworo ala-eze nile nke arụsị nile, ma olee onye arụsị ya nile apịrị-apị karịrị ha bụ ndị nke Jerusalem na nke Sameria;

11 A gaghị m eme, dịka m meworo Sameria na arụsị ya nile, otu aka ahụ mee Jerusalem na arụsị ya?

12 Ya mere ọ ga-eru na mgbe Onye-nwe lụsịworo ọlụ ọ na-alụ n’elu ugwu Zaịọn na n’ime Jerusalem, a ga m ata amkpụrụ-afọ nke ndị obi ukwu ahụhụ bụ nke eze ndị bAsịria, na inya-isi nke ileli-anya n’elu ya nile.

13 N’ihi na a na-asị: Site n’ike aka m na site na amamihe m ka m meworo ihe ndị a nile, n’ihi na a bụ m onye na-akpachapụ anya; ma ewepụwo m oke-ala nile nke ndị mmadụ, ma a pụnarịrị m ha ihe nile ha chekwaworo, ma e wedawo m ndị nile bi n’ime ya dịka dike;

14 Ma aka m achọpụtawo na akụ ndị mmadụ nile dịka akwụ-nnunu; ma dịka mmadụ na-achịkọta akwa nile bụ ndị fọdụrụ ka m chịkọtaworo ala ahụ nile; ma ọdịghị onye n’ime ha megharịrị nku ya, ma-ọbụ meghee ọnụ ya, ma-ọbụ nyoo enyoo.

15 aAnyịke b ga aja onwe ya megide onye ji ya na-egbu ihe? Mma nkwọ ọ ga-ebuli onwe ya elu megide onye na-emegharị ya? Dịka aga-asị na okporo ga-efegharị onwe ya megide ha bụ ndị na-ewelite ya elu, ma-ọbụ dịka a ga-asị na mkpa-n’aka ahụ ga-ewelite onwe ya elu dịka aga-asị na ọ bụghị osisi!

16 Ya mere Onye-nwe, bụ Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha, ga-ezita n’etiti ndị ya gbara abụba, ịdị gịrị-gịrị; ma n’okpuru otuto aya ka ọ ga amụnye onwunwu nke dịka onwunwu nke ọkụ.

17 Ma ìhè nke Israel ga-aghọ ọkụ, ma Onye-Nsọ ya ga-abụ ire ọkụ, ma ọ ga-ere ma ọ ga-erechapụ ogwu ya nile na uke ya nile n’otu ụbọchị;

18 Ma ọ ga-erepịa inya-isi nke oke ọhịa ya, na nke ubi ya na-amị mkpụrụ, ma amkpụrụ-obi ma arụ; ma ha ga-adị ka mgbe onye-na-ebu ọkọlọtọ dara mba.

19 Ma osisi nke afọdụrụ n’ime ọhịa ya ga-adị ole na ole, nke nwata ga-enwe ike idepụta.

20 Ma ọ ga-eru an’ụbọchị ahụ, na ndị Israel fọdụrụ, bụ ndị nke gbapụrụ site bn’ụlọ nke Jekọb, agaghị kwa cadabere ọzọ n’arụ onye na-etigbu ha, mana ha ga-adabere n’arụ Onye-nwe, bụ Onye-Nsọ nke Israel, n’ezi-okwu.

21 aNdị fọdụrụ ga-alaghachị, e, ọbụna ndị nke Jekọb fọdụrụ, lakwuru Chineke ahụ di ike.

22 N’ihi na ọbụna na ndị gị Israel ga-adị ka aja nke osimiri, mana ndị nke fọdụrụ n’ime ha ga-alaghachị; amkpochapụ nke akaworo aka bga-ejubiga oke n’ezi-omume:

23 N’ihi na Onye-nwe Chineke nke usuu nile nke ndị-agha aga-eme mkpochapụ, ọbụna o kpebiwo ime ya n’elu ala nile.

24 Ya mere, otu a ka Onye-nwe Chineke nke usuu nile nke ndị-agha kwuru: O ndị m bi na Zaịọn, unu atụla egwu maka ndị Asirịa; ọ ga-eji okporo tie gị, ma ọ ga-ewelite mkpa-n’aka ya megide gị, dịka andị Ijipt mere.

25 N’ihi na ọfọdụrụ nwantịntị oge, ma oke iwe ga-akwusị, ma iwe m n’ime mbibi nke ha.

26 Ma Onye-nwe nke usuu nile nke ndị agha ga-apalite, ihe otiti maka ya dịka esị tigbuo aMidian na nkume nke Oreb; ma dịka okporo ya siri dị n’elu osimiri otu a ka ọ ga-ewelite ya elu dịka ndị Ijipt mere.

27 Ma ọ ga-eru n’ụbọchị ahụ na aibu-arọ ya ka a ga-ewezuga site n’elu ubu gị, na ihe nkedo ya site n’olu gị, ma ihe nkedo ahụ ka a ga-ebibi n’ihi bmmanụ etere gị.

28 a bịakwasịwo Aịat, ọ gabigawo jee Maịgrọn; na Mịkmash ka akwasara ibu ya nile.

29 Ha agabigawo ụzọ-nta ahụ; ha ewerewo ebe ino ọnọdụ-abalị ha na Giba; Remọt na-atụ egwụ; Gibea nke Sọl agbalagawo.

30 Welite olu, O ada nke Galịm; mee ka anụ ya na Laịsh, O Anatot ewedara ala.

31 Madmena ka ewepụworo; Ndị bi na Gibịm na-achịkọta onwe ha ka ha gbapụ.

32 Ugbua ọ ga-anọ na Nob n’ụbọchị ahụ; ọ ga-emegharị aka ya megide ugwu nke ada Zaịọn, ugwu-nta nke Jerusalem.

33 Lee, Onye-nwe, Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha ga-ebechapụ ngalaba nile nke na-akpata oke egwụ, ma andị nile di elu nke ogo ka a ga-egbuda; ma ndị mpako ka a ga-eweda ala.

34 Ma ọ ga-eji igwe gbutusịa ahịhịa nile nke oke ọhịa, ma Lebanọn ga-ada site n’aka onye dị ike.