Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 3


Isi 3

Josef n’Ijipt hụrụ ndị Nifaị n’óhụ̀—O buru amụma maka Joseph Smith, onye ọhụ-ụzọ nke oge ikpeazụ; maka Moses, onye ga-anapụta Israel; na maka mbịarute Akwụkwọ nke Mọmọn. Ihe dịka n’afọ 588 ruo 570 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua a na m agwa gị Josef, anwa-ikpeazụ m. A mụtara gị n’ime ọzara n’ime mkpagbu m nile; e, n’ụbọchị nile nke nnukwu iru-uju m karịsịrị ka nne gị mụrụ gị.

2 Ma, ka Onye-nwe doo aala nke a nsọ nye gị, nke bụ ala kachasị oke-ọnụ-ahịa, maka nketa gị na nketa nke mkpụrụ-afọ gị na ụmụnne gị, ndị nwoke maka nchekwa gị ruo mgbe nile, ma ọ bụrụ na unu ga-edebe iwu-nsọ nile nke Onye-Nsọ nke Israel.

3 Ma ugbua, Josef, nwa ikpe-azụ m, onye m kpọpụtaworo site n’ime ọzara n’ime mkpagbu m nile, ka Onye-nwe gọzie gị ruo mgbe nile, n’ihi na agaghị aebibi mkpụrụ-afọ gị kpam-kpam.

4 N’ihi na lee, ị bụ mkpụrụ nke ukwu m nile; ma a bụ m agbụrụ nke aJosef onye badọkpụrụ ga n’Ijipt. Ma nnukwu ka ọgbụgba-ndụ Onye-nwe ahụ nile dịịrị nke o mere nye Josef.

5 Ya mere, Josef n’ezie ahụrụ ụbọchị nke anyị. Ma o nwetara nkwa nke Onye-nwe, na site na mkpụrụ nke ukwu ya ka Onye-nwe Chineke ga-ewelite bngalaba cezi-omume nye ụlọ nke Israel; ọ bụghị dMesaịa ahụ, kama ngalaba nke a gaara agbajipụ, otu o sila dị, ka e nwe ike icheta ya n’ọgbụgba-ndụ nile nke Onye-nwe ka e mee ka Mesaịa ahụ pụta ìhè n’iru ha n’oge ikpe-azụ, na mụọ nke ike, ruo n’iwepụta ha site n’ọchịchịrị baa n’ìhè—e, site na nzuzo nke eọchịchịrị na site na ndọkpụ n’agha ruo n’inwere onwe.

6 N’ihi na Josef n’ezie kwupụtara, na-asị: aOnye ọhụ-ụzọ ka Onye-nwe Chineke m ga-ekulite elu, onye ga-abụ onye-ọhụ-ụzọ nke a họpụtara ahọpụta nye mkpụrụ nke bukwu m nile.

7 E, Josef n’ezie sịrị: Otu a ka Onye-nwe kwuru gwa m: aỌhụ-ụzọ nke a họpụtara ahọpụta ka m ga-ekulite elu site na mkpụrụ nke ukwu gị nile; ma a ga-ebuli ya n’etiti mkpụrụ nke ukwu gị nile. Ma ọ bụ ya ka m ga-enye iwu-nsọ na ọ ga-arụrụ mkpụrụ nke ukwu gị nile ọrụ, ụmụ nne ya, ndị nwoke, ndị ga-abụ nnukwu oke ọnụ ahịa nye ha, ọbụna ruo n’iweta ha ka ha mata maka ọgbụgba-ndụ nile nke m meworo mụ na ndị nna unu.

8 Ma a ga m enye ya iwu-nsọ na ọ gaghị arụ aọrụ ọzọ, ma ọbụghị ọrụ nke m ga- enye ya iwu ịrụ. Ma a ga m eme ya ka ọ dị ukwuu n’anya m; n’ihi na ọ ga-arụ ọrụ m.

9 Ma ọ ga-adị ukwuu dịka aMoses, onye nke m sịworo na m ga-ebulite elu nye unu, ka ọ bnapụta ndị m, O ụlọ nke Israel.

10 Ma Moses ka m ga-ebulite elu, ka ọ napụta ndị gị site n’ala Ijipt.

11 Ma na Onye-ọhụ-ụzọ ka m ga-ewelite elu site na mkpụrụ nke ukwu gị nile; ma-ọbụ ya ka m ga-enye aike iwepụta okwu m nye mkpụrụ nke ukwu gị nile—ma ọbụghị n’iwepụta okwu m nanị, ka Onye-nwe kwuru, kama ma nke ime ka ha kwenye n’okwu m, nke ga-apụtawọrị n’etiti ha.

12 Ya mere, mkpụrụ nke ukwu gị nile aga-ede; ma mkpụrụ nke ukwu nile nke bJuda cga-ede; ma nke ahụ a ga-ede site na mkpụrụ nke ukwu gị nile, na kwa nke ahụ a ga-ede site na mkpụrụ nke ukwu Juda, ga-etokọta, ruo dn’igbagwoju-anya nke ozizi ụgha nile na mbuda-ala nke ndọrọ-ndọrọ nile, na ihiwe udo n’etiti mkpụrụ nke ukwu gị nile, na eiweta ha na fọmụma nke ndị nna ha nile, n’ụbọchị ikpe-azụ nile, na kwa ọmụma nke ọgbụgba-ndụ m nile, ka Onye-nwe kwuru.

13 Ma site na-adịghị-ike a ga-eme ka o sie ike, n’ụbọchị ahụ mgbe ọrụ m ga-amalite n’etiti ndị m nile, ruo n’iweghachi gị, O ụlọ nke Israel, ka Onye-nwe kwuru.

14 Ma otu a ka Josef buru n’amụma na-asị: Lee, ọhụ-ụzo ahụ ka Onye-nwe ga- agozi; ma ndị ga-achọ ibibi ya ga-enwe mgbagwọju-anya; n’ihi nkwa nke a, nke m nwetaworo site n’aka Onye-nwe, site na mkpụrụ nke ukwu m, ga-emezu. Lee, a ma m nke ọma maka mmejupụta nke nkwa a.

15 Ma aaha ya ka a ga-akpọ otu ihe dịka nke m; ma ọ ga-abụ dịka baha nna ya. Ma ọ ga-adị ka m; n’ihi na ihe ahụ, nke Onye-nwe ga-ewepụta n’aka ya, site n’ike nke Onye-nwe ga-eweruta ndị m ruo na nzọpụta.

16 E, otu a ka Josef buru ya n’amụma: A ma m ihe a nke ọma, ọbụna dịka m si mara nke ọma maka nkwa nke Moses; n’ihi na Onye-nwe asịwo m, A aga m edokwa mkpụrụ-afọ gị ruo mgbe nile.

17 Ma Onye-nwe asịwo: A ga m ewelite otu Moses; ma a ga m enye ya ike n’ime okporo; ma a ga m enye ya ikpe e dere ede. Ma na a gaghị m atọpụ ire ya, ka o kwuo ọtụtụ okwu, n’ihi na a gaghị m eme ya dike n’ikwu okwu. Ma a ga m e adere ya iwu m, na mkpịsị aka nke aka m, ma a ga m emere ya bonye-nkwupụta.

18 Ma Onye-nwe sịkwara m: A ga m ewelitere mkpụrụ nke ukwu gị nile; ma a ga m emere ya onye-nkwupụta okwu. Ma mụ, lee, a ga m enye ya ka o dee ihe odide nke mkpụrụ nke ukwu gị nile, nye mkpụrụ nke ukwu gị nile; ma onye-nkwupụta okwu nke ukwu gị ga-eme ka a mata ya.

19 Ma okwu ndị ahụ ọ ga-ede ga-abụ okwu ndị dị mkpa na amamihe nke m na ha ga-agaru ruo amkpụrụ nke ukwu gị nile. Ma ọ ga-adị ka a ga-asị na mkpụrụ nke ukwu gị ebesaworo ha rị akwa bsite n’uzuzu; n’ihi na A ma m okwukwe ha.

20 Ma ha aga-ebe akwa site n’uzuzu; e, ọbụna nchegharị nye ụmụnne ha, ndị nwoke ọbụna mgbe ọtụtụ ọgbọ gafeworo ha. Ma ọ ga-eru na akwa ha ga-aga, ọbụna dịka ịdị mfe nke okwu ha nile siri dị.

21 N’ihi okwukwe ha, aokwu ha nile ga-aga n’iru site n’ọnụ m ruo ụmụnne ha ndị nwoke nile ndị nke bụ mkpụrụ nke ukwu gị, ma adịghị-ike nke okwu ọnụ ha nile ka m ga-eme ka o sie ike site n’okwukwe ha, ruo n’icheta ọgbụgba-ndụ m nke m mere nye ndị nna gị.

22 Ma ugbua, lee, nwa m Josef, n’ụdị dị otu a ka nna m na mgbe ochie jiri abuo amụma.

23 Ya mere, n’ihi ọgbụgba-ndụ nke a ị bụ onye-agọziri-agọzi; n’ihi na mkpụrụ-afọ gị ka a na-agaghị ebibi, n’ihi na ha ga an̄a ntị n’okwu nile nke akwụkwọ ahụ.

24 Ma otu dike ga-ebilite n’etiti ha, onye ga-eme nnukwu ihe ọma, ma n’okwu ọnụ ma n’omume, ebe ọ bụ ngwa-ọrụ n’aka nile nke Chineke, nwere okwukwe karịrị akarị, ịrụ nnukwu ọrụ ịtụ-n’anya, ma mee ihe ahụ nke bụ nnukwu ihe n’anya nke Chineke, ruo n’ime ka eweta na mmezu nnukwu mwetaghachi nye ụlọ nke Israel na nye mkpụrụ-afọ nke ụmụnne gị ndị nwoke.

25 Ma ugbua, ngọzi na-adịrị gị, Josef. Lee, i dị ntakịrị; ya mere, n̄aa ntị n’okwu nile nke nwanne gị, nwoke, Nifaị, ma a ga-emere gị ọbụna dịka okwu nile nke m kwuworo siri dị. Cheta okwu nile nke nna gị mgbe ọ na-anwụ. Amen.