Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 18


Isi 18

Kraịst ga-adị ka otu okwute nke nkpọbi ụkwụ na nke otu nkume nkpasu-iwe—Chọọ Onye-nwe, ọbụghị ndị amụsu n’enyo-enyo—Lekwasị iwu ahụ na ama ahụ anya maka ndụzi.—Tulee Aịsaịa 8. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 Nke ka nke, okwu nke Onye-nwe sịrị m: Were nnukwu mbadamba akwụkwọ, ma jiri mkpịsị nwoke ji ede ihe dee n’ime ya, gbasara aMaha-shalal-hash-baz.

2 Ma a kpọrọ m andị-aka-ebe kwesịrị-ntụkwasị-obi ka ha dekọọ, Ụraịa bụ onye nchụ-aja na Zekaraịa nwa Jeberekaịa.

3 Ma e jekwuru m aonye-amụma-nwanyị ahụ; ma o tụrụ ime ma mụta nwa nwoke. Mgbe ahụ Onye-nwe sịrị m: Kpọọ aha ya, Maha-shalal-hash-baz.

4 N’ihi na lee, anwa ahụ bagaghị ama ihe ibeakwa, Nna m, na nne m, tutu akụ na ụba Damaskọs na cibu Sameria akwatara n’agha ga-abụ ihe ewepụru n’ịrụ eze Asịria.

5 Onye-nwe gwara m okwu ọzọ na-asị:

6 Ebe ọbụ na ndị a na-ajụ mmiri nile nke aShiloah na-aga nwayọ, ma n̄ụrịa ọn̄ụ n’ime bRizịn na nwa nwoke Remalaịa;

7 Ugbua ya mere, Lee, Onye-nwe na-ewelite mmiri nile nke osimiri ahụ ka ọ bịakwasị aha, nke siri ike dị kwa ọtụtụ, ọbụna eze nke Asịria na ebube ya nile; ma ọ ga-arịgota n’elu ebe mmiri ahụ nile si eru, ma gafee nsọtụ ya nile.

8 Ma ọ ga aagafe site na Juda; ọ ga-ejubiga oke ma gafee, ọ ga-eru ọbụna ruo n’olu: ma ịgbasapụ nku ya ga ejupụta mbara ala gị, O bImmanuel.

9 aJikọọ nụ onwe unu ọnụ, O unu ndị mmadụ, ma a ga-agbaji unu na mpekere mpekere; ma gee ntị unu nile ndị mba dị anya; kekọta nụ onwe unu, ma a ga-agbajisị unu na mpekere mpekere; kekọta nu onwe unu, ma a ga-agbajisị unu na mpekere-mpekere.

10 Dụrịtanụ onwe unu ọdụ, ma ọ ga-abịa n’ihe efu, kwuo okwu ahụ, ma ọ gaghị egụzọ; an’ihi na Chineke nọnyere anyị.

11 N’ihi na Onye-nwe gwara m otu a n’aka dị ike, ma kuziere m ka m ghara ịga n’ụzọ ndị nke a, na-asị:

12 Unu asịla, aNchịkọta ọnụ, nye ndị nile nke ndị a ga-asị, Nchịkọta ọnụ, ọbụghị ma unu ga-atụ egwụ ihe ha na-atụ egwụ, ma-ọbụ tụọ egwụ.

13 Doo nụ Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha nsọ n’onwe ya, ka ọ bụrụ onye unu ga aatụ egwụ, ka ọ bụrụ onye unu na-atụ oke egwụ.

14 Ma ọ ga-abụ aebe mgbaba dị nsọ; ma na ka ọ bụrụ bokwute mkpọbe ụkwụ na oke nkume nke mkpasu-iwe nye ụlọ Israel ahụ nile, ọ ga-abụ igbudu na ọnya nye ndị bi na Jerusalem.

15 Ma ọtụtụ n’etiti ha aga-akpobe ụkwụ daa n’ala, ma gbajisịa, ma ma n’ọnya, e wee jide ha.

16 Kechie ihe ịgba-ama ahụ, rachie aiwu ahụ n’etiti ndị na-eso ụzọ m nile.

17 Ma a ga m echere Onye-nwe, nke ana-ezonarị ụlọ nke Jekọb iru ya, ma a ga m ele anya ya.

18 Lee, mụ na ụmụ nile ndị Onye-nwe nyeworo m bụ maka aihe iriba-ama nile na maka ihe-ebube nile n’Israel sitere n’Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha, Onye na-ebi n’ụgwụ Zaịọn.

19 Ma mgbe ha ga-asị unu: Jụọ nụ ha bụ ndị na-akpọpụta andị mụọ a dị mbụ mara amara, na bndị amụsu nile na-enyo na atamụ—c bụ na ndị mmadụ ha ekwesịghị ịjụta Chineke ha ka ndị dị ndụ wee nụrụ dn’ọnụ ndị nwụrụ anwụ?

20 N’iwu ahụ na ịgba-ama ahụ; ma ọbụrụ na aha ekwughị dịka okwua si dị, ọ bụ n’ihi na ìhè adịghị n’ime ha.

21 Ma aha ga-agabiga ya n’oke mkpa na agụụ, ma ọ ga-eru na mgbe agụụ ga-agụ ha, ha ga-akpasu onwe ha iwe, ma kọcha eze ha na Chineke ha, ma lelie anya n’elu.

22 Ma ha ga-ele anya n’ala ma hụ nsogbu, na ọchịchịrị, mgbachu nke nnukwu arụ mgbu, ma a ga-achụba ha n’ọchịchịrị.