Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 32


Isi 32

Ndị mụọ-ozi na-ekwu okwu site n’ike nke Mụọ Nsọ—Ndị mmadụ ga-ekperịrị ekpere ma nweta mmụta nke onwe ha site na Mụọ Nsọ. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua, lee, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, a na m eche na unu ga-na-atụgharị uche otu ọbụla n’ime obi unu nile gbasara ihe unu ga-eme mgbe unu banyeworo site n’ụzọ ahụ. Ma na, lee, gịnị mere unu ji na-atụgharị uche maka ihe nile ndị a n’ime obi unu?

2 Unu echetaghị na a sịrị m unu na mgbe unu anwetaworo Mụọ Nsọ, unu pụrụ ikwu okwu bn’asụsụ nke ndị mụọ-ozi? Ma ugbua, olee otu unu ga-esi kwuo okwu n’asụsụ nke ndị mụọ-ozi ma ọbụghị site na Mụọ Nsọ?

3 aNdị mụọ-ozi na-ekwu okwu site n’ike nke Mụọ Nsọ; ya mere, ha na-ekwu okwu nile nke Kraịst. Ya mere, a gwara m unu, bn’eri nu oriri n’elu okwu nile nke Kraịst; n’ihi na lee, okwu nile nke Kraịst ga-agwa unu ihe nile unu kwesịrị ime.

4 Ya mere, ugbua mgbe m kwusịworo okwu ndị a, ọbụrụ na unu enweghị ike ịghọta ha, ọ ga-abụ n’ihi na unu aajụghị ajụjụ, ọbụghị ma unu kụrụ aka; ya mere, ewebataghị unu n’ime ìhè, mana unu ga-alarịrị-n’iyi n’ọchịchịrị.

5 N’ihi na lee, ọzọ, a sị m unu na ọbụrụ na unu ga-abata site n’ụzọ ahụ, ma nata Mụọ Nsọ ahụ, ọ ga egosị unu ihe nile unu kwesịrị ime.

6 Lee, nke a bụ ozizi nke Kraịst, ma agaghị enwe kwa ozizi ọzọ aga-enye wee ruo mgbe o agosipụtaworo onwe ya nye unu n’anụ arụ. Ma mgbe ọ ga egosịpụta onwe ya nye unu n’anụ arụ, ihe nile ọ ga-agwa unu ka unu ga na-eleru anya na-eme.

7 Ma ugbua mụ, Nifaị, agaghị ekwu karịa; Mụọ ahụ na-akwụsị m ikwu-okwu, ma a hapụrụ m ka m na-eru uju n’ihi aekweghị-ekwe, na ajọọ-omume, na amaghị ama, na ịkpọ-ekwe-nkụ nke ụmụ mmadụ; n’ihi na ha agaghị achọ mmụta, ma-ọbụ ghọta nnukwu mmụta, mgbe enyere ha ya n’ụdị dị bmfe nghọta, ọbụna dịka ikwe nghọta dịka okwu nwere ike ịdị.

8 Ma ugbua, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya a matara m na unu ka na-atụgharị uche n’ime obi unu nile; ma ọ na-ewute m na m ga-ekwurịrị okwu gbasara ihe nke a. N’ihi na ọbụrụ na unu ga-an̄a ntị n’olu Mụọ ahụ nke na-akụziri mmadụ ikpe ekpere, unu ga-amata na unu aga-ekperiri ekpere; n’ihi na bmụọ ọjọọ anaghị akụziri mmadụ ikpe ekpere, kama ọ na-akụziri ya na o kwesịghị ka o kpe ekpere.

9 Ma na lee, a sị m unu na unu ga ana-ekperịrị ekpere oge nile, na adaghị mba; ka unu ghara imere Onye-nwe ihe ọbụla ma ọbụghị na unu ga-ebu ụzọ kpee ekpere nye Nna bn’aha nke Kraịst, ka o doo ihe ọbụla unu na-eme nsọ nye unu, ka ihe unu ga na-eme wee bụrụ maka cọdịmma nke mkpụrụ-obi unu.