Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 13


Isi 13

Juda na Jerusalem ka aga-ata ahụhụ n’ihi erubeghị-isi ha—Onye-nwe na-arịọ maka ma na-ekpe ndị ya ikpe—Ụmụada nke Zaịọn ka a bụrụ ọnụ ma taa ha ahụhụ n’ihi ịdabere n’ihe nke ụwa—Tulee Aịsaịa 3. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 N’ihi na lee, Onye-nwe, Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha, na-esi na Jerusalem, si kwa na Juda, wepu ihe-ndabere na mkpa-n’aka, ihe-mkpa-n’aka nile nke nri, na ihe-ndabere nile nke mmiri—

2 Nwoke ahụ bụ dike, na nwoke nke agha, onye-ikpe, na onye-amụma, na onye na-akpachapụ anya, na onye ichie;

3 Ọchị-agha nye-isi nke iri-ndị-agha-ise, na nwoke a na enye-nsọpụrụ, na onye-ndụmọdụ, na onye-nka-aghụghọ, na onye okwu-okwu ire nkọ.

4 Ma a ga m enye ha ụmụ ka ha bụrụ ụmụ-eze hạ, ma ụmụaka ga-achị ha.

5 Ma a ga-achị ndị ahụ ọchịchị aka ike, onye ọbụla megide ibe ya na onye ọbụla megide agbata obi ya; nwata ga-ebuli onwe ya elu na mpako megide ichie, ma onye-eledara anya megide onye a na-asọpụrụ.

6 Mgbe otu onye ga-ejide nwanne ya nke ụlọ nna ya, ma wee sị: I nwere uwe, bụrụ onye-ọchịchị anyị, ma e kwela ka ambibi a bịa n’okpuru aka gị—

7 N’ime ụbọchị ahụ ka ọ ga-an̄ụ iyi, sị: A gaghị m abụ aonye-ọgwọ-ọrịa; n’ihi na n’ime ụlọ m ọdịghị ihe oriri ma-ọbụ ihe oyiyi dị ya; emela m onye-ọchịchị nke ndị ahụ.

8 N’ihi na e abibiwo Jerusalem, ma Juda badawo, n’ihi na ire ha na omume ha nile na-emegide Onye-nwe, ịkpasu anya abụọ nke otuto ya.

9 Ngosi mbara iru ha na-agba aka-ebe megide ha, ma na-egosipụta mmehie ha ka ọ dị, ọbụna dịka aSọdọm, ma ha agaghị enwe ike izo ya. Ahụhụ na-adịrị mkpụrụ-obi ha nile, n’ihi na ha ejiwo ihe ọjọọ kwụọ onwe ha ụgwọ!

10 Gwa ndị ezi-omume na ọ aga-adịrị ha mma; n’ihi na ha ga-eri mkpụrụ nke sitere n’omume ha.

11 Ahụhụ na-adịrị ndị ajọọ-omume, n’ihi na ha ga-ala-n’iyi; n’ihi na ụgwọ ọrụ nke aka ha nile ga-adịkwasị ha!

12 Ma ndị m, ụmụ-ntakịrị bụ ndị na-achị ha ọchịchị aka ike, ma ndịnyom na-achị ha. O ndị m, ndị ana-achị unu na-eme ka unu mee mmehie ma bibie ụzọ nke okporo-ụzọ unu nile.

13 Onye-nwe na-eguzọro ọtọ ana-rịọ arịrịọ, ma na-eguzọro ikpe ndị nile ikpe.

14 Onye-nwe ga-aba n’ikpe, ya na ndị ichie nile nke ndị ya na aụmụ ndị eze nile nọ n’ime ha; n’ihi na unu berichapụwo cubi vine na dngwo-ngwo nke endị ogbenye nọ n’ime ụlọ unu.

15 Gịnị ka unu zubere? Unu pịarisịrị ndị m, ma gwepiasịa iru nile nke ndị ogbenye, ka Onye-nwe Chineke nke usuu nile nke ndị-agha kwuru.

16 Nke ka nke, Onye-nwe sịrị: N’ihi na ụmụ-ada nke Zaịọn bụ ndị mpako, na-aga ije site n’iseti olu esite na anya nrafu, na-eje ana-arọ-mma ka ha na-aga, na-eme ka ụkwụ ha na-ada ụda—

17 Ya mere, Onye-nwe ga-eme ka ọkọ isi bịakwasị ụmụ-ada nile nke Zaịọn, ma Onye-nwe ga aachọpụta ebe nzuzo ha nile.

18 N’ime ụbọchị ahụ Onye-nwe ga-ewepụ ịkpa-ike nke ọla ha nile na-ada ụda, na aihe-ịchọ mma isi nile na bihe-isi gburu gburu dịka ọnwa:

19 Ihe nkwụnye nile na ọla-aka nile, na aakwa mkpuchi olu nile;

20 Okpu nile a chọrọ mma, na ọla-ụkwụ nile, na eriri-isi nile, na mkpọ ihe isi-ọma nile, na ihe-ntị nile;

21 Ọla-aka nile, na ọla mkwụ-n’imi nile;

22 aUwe mgbanwe nke emume nile, na uwe mwụda nile, na akwa mgbokwasị nile, na ntakịrị ihe ijide isi;

23 aEnyo nile, na ọmarịcha akwa-linen nile, na ihe mkpuchi-isi na olu nile, na akwa mgbochi nile.

24 Ma ọ ga-eru, n’ọnọdụ isi ụtọ a ga-enwe isi ihe ire ure; ma n’ọnọdụ ịhenjisi ukwu ike, andọwa; ma n’ọnọdụ agịrị-isi edoziri-edozi, nkwọchasị-isi; n’ọnọdụ bakwa ọma akpara-akpa, ihe-okike nke akwa-mkpe; cire ọkụ n’ọnọdụ ịma mma.

25 Ndịkom gị ga-ada site na mma-agha, ma ndị bụ dike, n’ime agha.

26 Ma ọnụ-ụzọ ama ya nile ga-akwa akwa arịrị ma ruo uju ma ọ ga atọgbọrọ n’efu, ma ọ ga-anọdụ n’elu ala ahụ.