Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 21


Isi 21

Ogwe-osisi nke Jesi ahụ (Kraịst) ga-ekpe ikpe n’ezi-omume—Ọmụma nke Chineke ga-ekpuchi ụwa n’Oge Jisus ga-achị ụwa otu puku afọ—Onye-nwe ga-ewelite ọkọlọtọ ma chịkọta Israel—Tulee Aịsaịa 11. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma aokporo ga-esi bn’ogwe-osisi nke cJesi pụta, ma ngalaba-osisi ga-eto site na mgbọrọgwụ ya nile.

2 Ma aMụọ nke Onye-nwe ga-abịakwasị ya, bụ Mụọ nke amamihe na nghọta, Mụọ nke ndụmọdụ na ịdị-ike, Mụọ nke ọmụma ihe na nke ịtụ-egwụ Onye-nwe;

3 Ma ọ ga-eme ya ịdị uchu na ịghọta ọsọ-ọsọ n’egwụ nke Onye-nwe; ma ọ gaghị aekpe ikpe dịka anya ya siri hụ, ọbụghị ma ọ ga-aba mba dịka ọnụnụ nke ntị ya abụọ siri dị.

4 Kama ọ ga-eji aezi-omume kpee ndị ogbenye ikpe, ma bbaa mba zịrị-ezi banyere cndị dị umeala n’obi n’ụwa nke a; ma ọ ga-eti ụwa ihe otiti site na okporo nke ọnụ ya, na iku-ume nke egbụgbere-ọnụ ya ka ọ ga-eji gbuo ndị ajọọ-omume.

5 Ma ezi-omume ga-abụ ihe-okike n’ukwu ya, ma ikwesị-ntụkwasị-obi ga-abụ ihe-aokike nke ụkwụ ya.

6 Nkịta-ọhịa kwa ga-ebi ya na nwa-atụrụ, ma agụ ga-edịna ala ya na nwa-ewu, ma nwa ehi na nwa ọdụm na anụ gbara-abụba ga-anọkọta; ma nwatakịrị ga-edu ha.

7 Ma ehi na nnukwu anụ na-eri ibe ya ga-atakọta nri; ụmụ ha nile ga-edịnakọta; ma ọdụm ga-ata ahịhịa dịka oke ehi.

8 Ma nwa-na-an̄ụ-ara ga-egwụ egwụ n’elu ọnụ aajụ-ala, ma nwa ahụ a napụrụ ara ga-etinye aka ya n’elu bọnụ ebe obibi nke ajọọ-agwọ.

9 Ha aagaghị emerụ arụ ma-ọbụ bibie ihe n’ime ugwu nsọ m nile, n’ihi na ụwa ga-ejupụta na bọmụma nke Onye-nwe, dịka mmịri si kpuchie osimiri.

10 Ma n’ime aụbọchị ahụ a ga-enwe bmgbọrọgwụ nke Jesi, nke ga-eguzo dịka ọkọlọtọ nke ndị mmadụ; c bụ ya ka dndị Jentaịlụ ga-achọ; ma izu-ike ya ga-adị ebube.

11 Ma ọ ga-eru n’ụbọchị ahụ na Onye-nwe ga-esetịpụ aka ya ọzọ nke augboro abụọ inwetaghachị ụfọdụ ndị ya ndị nke ga-afọdụ, site na Asịria na site n’Ijipt, na site na Petros, na site Kush, na site na Ilam, na site na Shaịna, na site na Hemat, na site n’ala nile mmiri gbara gburu-gburu nke oke osimiri ahụ.

12 Ma ọ ga-ewelite aọkọlọtọ nye mba nile, ma ọ ga-akpọkọta bndị nile ajụrụ ajụ nke Israel, ma cchịkọta ndị ekposasịrị nke Juda site n’akụkụ anọ nke ụwa.

13 aEkworo nke Ifrem kwa ga-arapụ ya, ma ndị iro nile nke Juda ka a ga-ebepụ; Ifrem agaghị bekwoso cJuda ekworo, ma Juda agaghị akpasu Ifrem iwe.

14 Mana ha aga-efekwasị n’ubu nile nke ndị Filistịa n’akụkụ ọdịda anyanwụ; ha ga-ebibi ndị ọwụwa-anyanwụ n’otu ebe; ha ga-atụkwasị aka ha n’elu Idọm na Moab; ma ụmụ nke Amọn ga-erube isi nye ha.

15 Ma Onye-nwe aga-ebibi ire nke oke osimiri Ijipt kpam kpam; ma site na oke ifufe ya dị ike ka ọ ga-emegharị aka ya n’elu osimiri ahụ, ma ọ ga-eti ya ihe otiti n’ime iyi asaa nile ahụ, ma mee ka ndị mmadụ gafee n’ala-akọrọ.

16 Ma a ga-enwe aokporo-ụzọ dịrị ụfọdụ ndị nke ya bụ ndị ga-afọdụ, site na Asịria, dịka o si dị n’Israel n’ụbọchị nke ọ rigopụtara site n’ala Ijipt.