Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 5


Isi 5

Ndị Nifaị wee wezuga onwe ha site n’ebe ndị Leman nọ, debe iwu nke Moses, ma wuo temple—N’ihi ekweghị-ekwe ha, e bepụrụ ndị Leman site n’iru nke Onye-nwe, ma a bụrụ ha ọnụ ma bụrụ ọpịpịa ụtarị nye ndị Nifaị. Ihe dịka n’afọ 588 ruo 559 tutu amụọ Kraịst.

1 Lee, o wee ruo na mụ, Nifaị, bere nnukwu akwa nye Onye-nwe Chineke m, n’ihi aiwe nke ụmụnne m ndị nwoke.

2 Ma na lee, iwe ha bawanyere megide m, nke mere na ha chọrọ iwepụ ndụ m.

3 E, ha tamuru megide m, na-asị: Nwanne anyị nwoke nke nta chere na ọ aga-achị anyị; ma anyị enwewo nnukwu mnwale n’ihi ya; ya mere, ugbua ka anyị gbuo ya, ka anyị ghara inwekwa mkpagbu ọzọ n’ihi okwu ya nile. N’ihi na lee, anyị agaghị enwe ya ka ọ bụrụ onye ọchịchị anyị, nke a bụ ihe dịrị anyị bụ ndị tọrọ ya, ịchị ndị a.

4 Ugbua, a naghị m ede n’elu epekele ndị a okwu nile nke ha tamuru megide m. Mana o zuworo m ị sị, na ha chọrọ iwepụ ndụ m.

5 Ma o wee ruo na Onye-nwe adọrọ m aka na ntị, na mụ, bNifaị, ga-esị n’ebe ha nọ pụọ ma gbaga n’ime ọzara, na ndị nile chọrọ iso m gaa.

6 Ya mere, o wee ruo na mụ, Nifaị, kpọọrọ ezi na ụlọ m, na kwa aZoram na ezi na ụlọ ya, na Sam, nwanne m nwoke nke tọrọ m na ezi na ụlọ ya, na Jekọb na Josef, ụmụnne m ndị nwoke ndị m tọrọ, na kwa ụmụnne m ndị nwanyị na ndị nile chọrọ iso m gaa ma ndị nile chọrọ iso m bụ ndị kwere bn’ịdọ aka na ntị na mkpughe nile nke Chineke; ya mere, ha n̄ara ntị n’okwu m nile.

7 Ma anyị weere ụlọ ikwuu anyị nile na ihe ọbụla nile ndị kwere anyị, ma gaa njem n’ime ọzara ruo ogologo ọtụtụ ụbọchị. Ma mgbe anyị gaworo njem ruo ogologo ọtụtụ ụbọchị anyị rụnyere ụlọ ikwuu anyị nile.

8 Ma ndị m chọrọ ka anyị kpọọ aha ebe ahụ aNifaị; ya mere anyị kpọrọ ya Nifaị.

9 Ma ndị ahụ nile mụ na ha so jiri aka ha kpọọ onwe ha andị nke Nifaị.

10 Ma anyị chetara idebe ikpe nile, na iwu nile e dere ede, na iwu-nsọ nile nke Onye-nwe n’ihe nile, dịka aiwu nke Moses siri dị.

11 Ma Onye-nwe nọnyeere anyị; ma anyị mere nke ọma karịa, n’ihi na anyị kụrụ mkpụrụ-akụkụ, ma anyị wetara ihe ụbị ọzọ nke dị ukwuu. Ma anyị malitere ịzụlite igwe anụ ụlọ nile, na igwe ehi nile, na anụ nile n’ụdị nile dị iche iche.

12 Ma mụ, Nifaị, ewetawo kwa akụkọ-ndekọta ahụ e dekọrọ bụ ndị a kanyere n’elu aepekele bras; na kwa bbọl ma-ọbụ cihe izi-ụzọ, nke a kwadoworo nye nna m site n’aka nke Onye-nwe, dịka ihe ahụ e dere ede.

13 Ma o wee ruo na anyị malitere ime nke ọma karịa, na ịmụba n’ala ahụ.

14 Ma mụ Nifaị, weereri amma-agha nke Leban, ma n’ụdi ya m wee mee ọtụtụ mma-agha, adịghị ama-ama site n’ụzọ ọbụla enwe ka ndị a ana-akpọ bndị Leman ugbua si bịakwasị anyị ma bibie anyị; n’ihi na a ma m ịkpọ-asị ha n’ebe m nọ na ụmụ m na ndị ahụ a kpọrọ ndị m.

15 Ma a kụziiri m ndị m iwu ụlọ n’ụdị nile, na ịrụ n’ụdị osisi nile, na nke aigwe, na nke kọpa, na nke bras, na nke igwe anụrụ-anụ, na nke ọla edo, na nke ọla ọcha, na nke ntụ igwe di oke ọnụ ahịa, ndị karịrị akarị.

16 Ma mụ, Nifaị, wuru atemple, ma e wuru m ya dịka btemple nke Solomon ma ewezuga na e jighị ọtụtụ cihe oke ọnụ ahịa nile wuo ya; n’ihi na apụghị inweta ha n’elu ala ahụ, ya mere, e nweghị ike iwu ya dịka temple nke Solomon, ma ụdị owuwu ya dịka temple nke Solomon; ma aka ọrụ ya mara mma karịa.

17 Ma o wee ruo na mụ, Nifaị, mere ka ndị m bụrụ ndị ana-agba mbọ, ma na-eji aka ha na-arụ ọrụ.

18 Ma o wee ruo na ha chọrọ ka m bụrụ aeze ha. Ma mụ, Nifaị chọsịrị ike ka ha ghara inwe eze, otu o sịla dị, e meere m ha dịka ike m ha.

19 Ma lee, okwu nile nke Onye-nwe emezuwọrị nye ụmụnne m ndị nwoke, bụ nke o kwuru gbasara ha, na mụ ga-abụ aonye-ọchịchị nke ha, na bonye-nkuzi nke ha. Ya mere, a bụrụwo m rịị onye-ọchịchị ha na onye-nkuzi ha, dịka iwu-nsọ nile nke Onye-nwe siri dị, wee ruo mgbe ha chọrọ iwepụ ndụ m.

20 Ya mere, okwu nke Chineke ka e mejupụtara bụ nke o gwara m sị na: Ọbụrụraa na ha aagaghị an̄a ntị n’okwu gị nile, a ga-ebepụ ha site n’ebe Onye-nwe nọ. Ma lee, e bbepụrụ ha site n’ebe Ọ nọ.

21 Ma o meworị ka aọbụbụ-ọnụ ahụ bịakwasị ha, e, ọbụna ọbụbụ-ọnụ dị ilu, n’ihi ajọọ-omume ha. N’ihi na lee, ha emesịwo obi ha ike megide ya, nke bụ na ha aghọworiị okwute; ya mere, ebe ha dị ọcha, ma bdị mma ile anya nke ukwuu, na ụtọ ile anya, ka ha ghara ito ndị m akpịrị, Onye-nwe Chineke mere ka cakpụkpọ-arụ ojii bịakwasị ha.

22 Ma otu a ka Onye-nwe Chineke kwuru: A ga m eme ka ha bụrụ ndị ana-enweghị ihe mmasị n’ebe ndị gị nọ, ma ọbụghị na ha chegharịrị site na ajọọ-omume ha nile.

23 Ma a ga-abụ mkpụrụ-afọ nke onye ọbụla aga-agwakọta ha na mkpụrụ-afọ ha ọnụ; n’ihi na a ga-abụ ha ọnụ ọbụna otu ụdị ọbụbụ-ọnụ. Ma Onye-nwe kwuru ya, ma e wee mee ya.

24 Ma n’ihi ọbụbụ-ọnụ ha nke bịakwasịrị ha, ha ghọrọ andị na-enweghị aka ọrụ, jupụta na mkpasu-iwe na aghụghọ, ma na-achọ n’ime ọzara anụ ọhịa ndị ha ga-egbu.

25 Ma Onye-nwe Chineke siri m: Ha ga-abụ ihe ịpịa ụtarị nye mkpuru-afọ gị, ime ka ha na-echeta m, ma ọbụrụraa na ha agaghị echeta m, ma n̄aa ntị n’okwu m nile, ha ga-abụ ọpịpịa ụtarị nye ha ruo na mbibi.

26 Ma o wee ruo na mụ, Nifaị, adoro Jekọb na Josef nsọ, ka ha bụrụ ndị nchụ-aja na ndị nkuzi n’ala nke ndị m.

27 Ma o wee ruo na anyị biri ndụ n’ụdị nke an̄ụrị.

28 Ma iri afọ atọ agafewọrịị site n’oge anyị, hapụrụ Jerusalem.

29 Ma mụ, Nifaị, edebewọrịị akụkọ-ndekọta ahụ e dere n’elu epekele nke m nile, nke m meworo, nke ndị m rute n’oge ahụ.

30 Ma o wee ruo na Onye-nwe Chineke siri m: Mee aepekele ndị ọzọ; ma ị ga akanye ọtụtụ ihe n’elu ha ndị dị mma n’anya m, maka nrite uru nke ndị gị.

31 Ya mere, mụ, Nifaị, n’irube isi n’iwu-nsọ nile nke Onye-nwe, gara mee aepekele ndị a n’elu ndị nke m kanyeworo ihe ndị a nile.

32 Ma akanyere m ihe ahụ na-amasị Chineke. Ma o bụrụ na ndị m enwee mmasị n’ihe ndị nke Chineke, ha ga-enwe mmasị n’ihe nkanye m nile ndị dị n’elu epekele ndị a.

33 Ma ọbụrụ na ndị m achọọ ịmata akụkụ ka mkpa na akụkọ ndị m ha ga-agụrịrị epekele m ndị ọzọ.

34 Ma o zuworo m ị sị na iri afọ anọ nile a gafewọrịị, ma anyị enweworịị agha nile na ndọrọ-ndọrọ nile anyị na ụmụnne anyị ndị nwoke.