Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 1


Akwụkwọ nke Abụọ nke Nifaị

Nkọwasị maka ọnwụ nke Lihaị. Ụmụnne Nifaị ndị nwoke wee nupu isi megide ya. Onye-nwe dọrọ Nifaị aka na ntị ka ọ puọ baa n’ime ọzara. Njem ya nile n’ime ọzara na ihe ndị ọzọ.

Isi 1

Lihaị wee buo amụma gbasara ala nke ntọhapụ—Mkpụrụ-afọ ya ka a ga-ekposasị ma tie ihe ma ọ bụrụ na ha jụ ịnabata Onye-Nsọ nke Israel—O wee gbaa ụmụ ya ume ka ha yiri ngwa agha nke ezi-omume. Ihe dịka n’afọ 588 ruo 570 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo na mgbe mụ, Nifaị, bịaruworo n’isi ngwụcha nke ikuziri ụmụnne m, anna anyị Lihaị kwukwaara ha ọtụtụ ihe, ma kwụgharịara ha, ụdi nnukwu ihe Onye-nwe mewooro ha n’ịkpọpụta ha site n’ala Jerusalem.

2 Ma ọ gwara ha okwu gbasara annupụ isi ha n’elu mmiri ahụ, na ebere nile nke Chineke site n’ihapụrụ ha ndụ ha, nke mere na elodaghị ha n’ime osimiri ahụ.

3 Ma ọ gwakwara ha okwu gbasara ala e kwere na nkwa, nke ha nwetaworo—ụdị obi ebere Onye-nwe nwere n’ịdọ anyị aka na ntị ka anyị gbapụ site n’ala Jerusalem.

4 N’ihi na, lee, o kwuru, a hụwo m aọ́hụ̀, nke m si n’ime ya mata na e bibiwo bJerusalem; ma ọ bụrụ na anyị gaara nọrọ n’ime Jerusalem, anyị gaara abụ ndị clara n’iyi.

5 Ma na, o kwuru, na-agbanyeghị mkpagbu anyị nile, anyị enwetawo aala e kwere na nkwa, ala a bhọọrọ karịa ala ndị ọzọ; ala nke Onye-nwe Chineke jiworo mee ihe cọgbụgba-ndụ mụ na ya, kwesịrị ịbụ ala nke nketa mkpụrụ-afọ m. E, Onye-nwe ejiwo ala a mee ihe ọgbụgba-ndụ nye m, ma nye ụmụ m ruo mgbe nile, na kwa ndị nile a ga-edupụta site na mba ọzọ nile site n’aka nke Onye-nwe.

6 Ya mere, mụ, Lihaị, na-ebu amụma dịka ọrụ nile nke Mụọ nke di n’ime m siri dị, na aọdịghị onye ọbụla ga-abịa n’ime ala a ma ọbụghị na a kpọtara ndị ahụ site n’aka nke Onye-nwe.

7 Ya mere, aala a ka e doworo nsọ nye ya bụ onye ọ ga-kpọta. Ma ọbụrụ na ha ga-ejere ya ozi site n’idebe iwu-nsọ nile ahụ nke o nyeworo, ọ ga-abụ ala nke bntọhapụ nye ha; ya mere, ọdịghị mgbe a ga-ewedata ha ala na ndọkpụ n’agha; ọbụrụ otu a, ọ ga-abụ n’ihi mmebi iwu, n’ihi na ọbụrụ na mmebi iwu ga-aba ụba, a cga-abụ ala ahụ ọnụ n’ihi ha, ma na nye ndị ezi-omume, a ga-agọzi ya ruo mgbe nile.

8 Ma lee, Ọ bụ amamihe ka ezobegodi ala a, ka ndị mba ọzọ ghara ịmata maka ya; n’ihi na lee, ọtụtụ mba ga-emeri ala ahụ na agha, nke ga-eme ka a ghara kwa inwe ebe maka nketa.

9 Ya mere, mụ, Lihaị, enwetawo nkwa, na aọbụrụraa na ndị nile Onye-nwe Chineke ga-akpọpụta site n’ala Jerusalem ga-edebe iwu-nsọ ya nile, ha ga-enwe bọga n’iru n’elu iru nke ala nke a; ma a ga-edebe ha iche n’ebe mba ndị ọzọ nọ, ka ha wee-nwere ala a n’onwe ha. Ma ọbụrụ na ha cga-edebe iwu-nsọ ya nile, a ga-agọzi ha n’elu iru ala a, ma ọdịghị onye ga-emegide ha, ma-ọbụ napụ ha ala ahụ bụ nke nketa ha, ma ha ga-ebi na-enweghị nsogbu ruo mgbe nile.

10 Ma lee, mgbe oge ruru na ha ga-ala azụ site n’ekweghị ekwe, mgbe ha nwetasịworo nnukwu ngọzi ndị a nile site n’aka nke Onye-nwe—ebe ha matara ihe gbasara okike nke ụwa, na mmadụ nile, matakwa nnukwu na oke ọrụ ịtụ n’anya nile nke Onye-nwe site n’okike ụwa; ebe e nwere ike e nyere ha ime ihe nile site n’okwukwe, nwere iwu-nsọ nile site na mmalite; na ebe a kpọtara ha site n’ịdị mma ya na-enweghị òkè n’ime ala nke a dị oke-ọnụ-ahịa e kwere na nkwa—lee, A sị m, ọbụrụ na ụbọchị ga-abịa na ha ga-ajụ Onye-Nsọ nke Israel, ezi aMesaịa, Onye-mgbapụta ha na Chineke ha, lee, ikpe nile nke ya zịrị ezi ga-abịakwasị ha.

11 E, Ọ ga-eweta amba ndị ọzọ tinyere ha, ma ọ ga-enye ha ike, ọ ga-anakwara ha ala nile nke onwunwe ha, ma ọ ga-eme ha ka ha bgbasasịa ma e tie ha ihe otiti.

12 E, dịka otu ọgbọ na-agafe ruo n’ọzọ, a ga-enwe ankwafu ọbara, na ọtụtụ nnukwu nleta n’etiti ha; ya mere, ụmụ m, ọ ga-adị m mma ma ọbụrụ na unu ga-echeta; e, ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na unu ga-an̄a ntị n’okwu m nile.

13 O ọ dị m ka a sị na unu ga eteta n’ụra; teta n’ụra dị omimi, e, ọbụna site n’ụra nke aala mụọ, ma hụchapụ bagbụ nke di egwu nke e jiri kee unu, nke bụ agbụ kere ụmụ nke mmadụ, nke bụ na a dọkpụrụ ha n’agha gbada ruo colulu ịhụju-anya na ahụhụ ebighi-ebi.

14 Tetanụ! ma bilienụ site n’uzuzu, ma nụrụnụ okwu nile nke onye amụrụ unu onye na-ama jijiji, onye nke unu ga-atọgbọ anụ arụ ya n’ala na nso nso a n’oyi ọtụtụ na ịda jụụ nke bili, site n’ebe ọdịghị onye ije nwere ike ịlọta; mkpụrụ ụbọchị ole na ole fọdụrụ ka m gaa cụzọ nke ụwa nile.

15 Ma lee, Onye-nwe aagbapụtawo mkpụrụ-obi m site n’ala mụọ; A hụwo m otuto ya, ma baka nke cịhụnanya ya gbara m gburu-gburu ruo mgbe ebighi-ebi.

16 Ma a na m achọsike na unu ga-echeta idebe aiwu nile e dere ede na ikpe nile nke Onye-nwe; lee, nke a abụrụwọrị ihe mkpụrụ-obi m na-echekasị onwe ya site na mmalite.

17 Mkpụrụ-obi m ka iru uju nyịdaworọrị site n’oge ruo n’oge, n’ihi egwu atụwo m, na eleghị anya n’ihi imesike nke obi unu nile ka Onye-nwe Chineke unu ga-apụta n’uju nke aoke iwe ya, bịakwasị unu, na a bga-ebepụ ma bibie unu ruo mgbe nile.

18 Ma ọbụ, na ịbụ-ọnụ ga-abịakwasị unu mgbe aọtụtụ ọgbọ gasịworo, ma a ga-eji mma-agha leta unu, na ụnwụ, ma a ga-akpọ unu asị, ma a ga-eduru unu dịka uche na ndọkpụ n’agha nke bekwensu siri dị.

19 O ụmụ m ndịkom, ka ihe ndị a nile ghara ịbịakwasị unu, ma ka unu bụrụ andị ahọpụtara na ndị Onye-nwe gosiri iru ọma. Ma lee, ka uche ya mee; n’ihi na ụzọ ya nile bụ bụzọ ezi-omume ruo mgbe nile.

20 Ma O kwuwo na: aỌbụrụraa na unu ga-edebe biwu-nsọ m nile unu ga-enwe cọgan’iru n’ala ahụ; ma ọbụrụraa na unu agaghị edebe iwu-nsọ m nile a ga-ebepụ unu site n’ebe m nọ.

21 Ma ugbua ka obi m wee nweta ọn̄ụ n’ime unu, na kwa ka mkpụrụ-obi m wee hapụ ụwa nke a n’obi ụtọ n’ihi unu, ka aghara iwedata m na mwuta na iru uju n’ala ili, bilie site n’uzuzu, ụmụ m, ma bụrụnụ ndịkom andị nwoke, ma nweenụ mkpebi bn’otu uche na n’otu obi, dị n’otu n’ihe nile, ka unu ghara ịgbadata n’ime ndọkpụ n’agha.

22 Ka a ghara iji ọbụbụ-ọnụ nke oke iwe bụọ unu ọnụ; na kwa, ka unu ghara ịdaba n’ime ịkpasu aChineke nke na-ekpe ikpe zịrị ezi obi ọjọọ n’aru unu, ruo na mbibi, e, mbibi nke mgbe ebighi-ebi nke mkpụrụ-obi na arụ.

23 Teta, ụmụ m ndị nwoke; yikwasịnụ angwa-ọgụ nke ezi-omume. Hụchapụ agbụ nile ahụ nke e jiri kee unu, ma si nụ n’ọchịchịrị pụta, ma bilie site n’uzuzu.

24 Unu e nupukwala isi ọzọ megide nwanne unu nwoke, onye nke echiche ya diworo otuto, na onye debeworo iwu-nsọ nile site n’oge anyị hapụrụ Jerusalem; na onye nke buworọrị ngwa-ọrụ n’aka nile nke Chineke, site n’ịkpọpụta anyị rute n’ala e kwere na nkwa; n’ihi na a sị na ọbụghị ya, anyị gaara alaworịị n’iyi site an’agụụ n’ime ọzara; otu o sila dị, unu chọrọ biwepụ ndụ ya, e, ma ọ hụsiwo anya nke mwute n’ihi unu.

25 Ma a na m atụ nnukwu egwụ na-ama jijiji n’ihi unu, ka ọ ghara ịhụsianya ọzọ; n’ihi na lee, unu ebowo ya ebubo na ọ chọrọ ike na ikike iwu iji chịwa unu; mana a ma m na ọ chọghịrịị ike ma-ọbụ aikike iwu iji chịwa unu, kama ọ chọwororịị otuto nke Chineke, na ọdịmma nke mgbe ebighi-ebi unu.

26 Ma unu atamuwo n’ihi na ọ na-ekwupụtara unu ezi-okwu. Unu sị na o jiwo aimesi-ike; unu sị na o wesowo unu iwe; ma lee, imesi-ike ya bụ imesị-ike nke ike nke okwu Chineke, nke dịịrị n’ime ya; ma ihe ahụ unu na-akpọ iwe bụụrụ ezi-okwu, dịka ihe ahụ dị n’ime Chineke siri dị, nke ọ na-enweghị ike igbochị, na-igosịpụta nke ọma gbasara ajọọ-omume unu nile.

27 Ma ọ ga abụrịrị na aike nke Chineke dịnyere ya, ọbụna ruo na inye unu iwu na unu ga-eruberịrị-isi na olu ya. Ma lee, ọbụghị ya, ma-ọbụ bMụọ nke Onye-nwe nke di n’ime ya, nke cmeghere ọnụ ya n’ikwu okwu nke mere na onweghịkwa ike ikpuchi ya.

28 Ma ugbua nwa m nwoke, Leman, na kwa Lemuel na Sam, na kwa ụmụ m ndị nwoke bụ ụmụ Ịshmel, lee, ọbụrụ na unu ga an̄a ntị n’ọlụ nke Nifaị, unu agaghị ala-n’iyi. Ma ọbụrụ na unu ga an̄a ntị n’olu ya, a na m arapụrụ unu angọzi, e, ọbụna ngọzi nke mbụ m.

29 Ma o bụrụ na unu agaghị an̄a ntị n’olu ya, a ga m ewepụ angọzi nke mbụ m, e, ọbụna ngọzi m, ma ọ ga-adakwasị ya.

30 Ma ugbua, Zoram, a na m agwa gị: lee, ị bụ anwa oru nke Leban; otu o sila dị, a kpọpụtawo gị site n’ala Jerusalem, ma a ma m na ị bụ ezigbo enyi nwa m nwoke, Nifaị, ruo mgbe nile.

31 Ya mere, n’ihi na i kwesịrị ntụkwasị-obi, mkpụrụ-afọ gị ka a ga-agọzi ha na amkpụrụ-afọ nke ya, ka ha nwe ike bie n’ọgan’iru ogologo oge n’elu ala nke a; ma ọdighị ihe ọbụla ma ọbụghị ajọọ-omume n’etiti ha ga-emerụ ha arụ ma-ọbụ nye nsogbu n’ebe ọgan’iru ha dị n’elu iru nke ala nke a ruo mgbe nile.

32 Ya mere, ọbụrụ na unu ga-edebe iwu-nsọ nile nke Onye-nwe, Onye-nwe edowo ala nke a nsọ maka nchekwa nke mkpụrụ-afọ gị ya na mkpụrụ-afo nwa m nwoke.