Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 6


Isi 6

Jekọb wee kọgharịa akụkọ ndị Juu: Ndọkpụ n’agha ahụ baa Babịlọn na nlọta ha; ije-ozi na mkpọgide n’obe nke Onye-Nsọ nke Israel; inye aka e nwetara site n’aka ndị Jentaịlụ; na mkpọtaghachi ndị Juu nke oge ikpe-azụ mgbe ha ga-ekwenye na Mesaịa ahụ. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 Okwu nile nke Jekọb, nwanne Nifaị nke nwoke, nke ọ gwara ndị nke Nifaị:

2 Lee, ụmụnne m ndị m hụrụ n’anya, mụ, Jekọb, ebe Chineke kpọworo m, ma chie m echichi n’ụdị usoro ya dị nsọ, ma ebe e doworo m nsọ site n’aka nwanne m nwoke, Nifaị, onye nke unu na-elekwasị anya dịka aeze ma-ọbụ onye-nchekwa; na onye unu na-adabere maka izere mmekpa arụ, lee unu ma na mụ agwawo unu okwu karịa maka ọtụtụ ihe.

3 Otu o sịla dị, a na m agwa unu okwu ọzọ; n’ihi na a na m achọsike maka ọdịmma nke mkpụrụ-obi unu. E, nchekasị arụ m dị ukwuu maka unu, ma unu onwe unu ma na otu a ka ọ dịrịị site n’oge gara aga. N’ihi na a gbawo m unu ume site na mgbalị m nile, ma akụziworo m unu okwu nile nke nna m; ma a gwawo m unu okwu gbasara ihe nile e dere ede, site n’okike ụwa.

4 Ma ugbua, lee, a ga m agwa unu okwu gbasara ihe nile ndị dị adị, na ndị ga-abịa abịa; ya mere, a ga m agụrụ unu okwu nile nke aAịsaịa. Ma ha bụ okwu nile nke nwanne m nwoke chọsịworo ike ka m gwa unu. Ma a na m agwa unu maka unu onwe unu, na ka unu wee mụta ma nye aha Chineke unu otuto.

5 Ma ugbua, okwu nile nke m ga-agụpụta bụ ndị nke Aịsaịa kwuru gbasara ụlọ nke Israel nile; ya mere, a ga-eji ha tụnyere unu, n’ihi na unu bụ ụlọ nke Israel. Ma e nwere ọtụtụ ihe ndị nke Aịsaịa kwuworo bụ ndị a ga-eji tụnyere unu, n’ihi na unu bụ ndị ụlọ nke Israel ahụ.

6 Ma ugbua, ndị a bụ okwu nile ahụ: aOtu a ka Onye-nwe Chineke kwuru: Lee, a ga m ewelite aka m nye ndị Jentaịlụ nile, ma dozie busoro ụzọ m gosị ndị mmadụ; ma ha ga-akpọta ụmụ ha ndị nwoke n’aka ha, ma ụmụ ha ndị nwanyị ka a ga-eku n’ubu ha nile.

7 Ma ndị eze ga-abụ ndị nna na-azụ ụmụ nye gị; ma ndị eze-nwanyị ha ndị nne na-azụ ụmụ gị; ha ga-akpọ isi-ala were iru ha kpudo n’ala, ma rachaa uzuzu nke ụkwụ gị abụọ; ma ị ga-amata na M bụ Onye-nwe; n’ihi na ihere agaghị eme ha bụ ndị ana-echere m.

8 Ma ugbua mụ, Jekọb, ga-ekwutu ihe ole na ole gbasara okwu ndị a nile. N’ihi na lee, Onye-nwe egosịwo m na ndị ahụ nọdụrụ na aJerusalem, bụ ebe anyị siri bịa, ka e gbuworo ma bbupụ ha na ndọkpụ nke agha.

9 Otu o sila dị, Onye-nwe egosịwo m na ha aga-alaghachi ọzọ. Ma o gosịwo m na Onye-nwe Chineke, Onye-Nsọ nke Israel, kwesịrị igosipụta onwe ya nye ha n’anụ arụ; ma mgbe o gosịpụtaworo onwe ya ha ga-apịa ya ụtarị ma bkpọgide ya n’obe, dịka okwu nile nke mụọ-ozi ahụ bụ onye gwara m ya siri dị.

10 Ma mgbe ha mesịworo obi ha ike ma kpọọ ekwe ha nkụ megide Onye-Nsọ nke Israel, lee, aikpe nile nke Onye-Nsọ nke Israel ga-abịakwasị ha. Ma ụbọchị ahụ na-abịa mgbe a ga-eti ha otiti ihe ma nye ha mkpagbu.

11 Ya mere, mgbe a chụlaworo ha n’iru ma n’azụ, n’ihi na otu a ka mụọ-ozi ahụ kwuru, ọtụtụ ka a ga-akpagbu n’anụ arụ, ma a gaghị ekwe ka ha laa n’iyi, n’ihi ekpere nke ndị nwere okwukwe; a ga-ekposasị ha ma a ga-apịa ha ụtarị, ma kpọọ ha asị; otu o sila dị, Onye-nwe ga-emere ha ebere, na amgbe ha ga-abịa n’ọmụma nke bOnye-mgbapụta, a cga-ekpọkọbata ha ọzọ gaa n’ala nile nke nketa ha.

12 Ma ngọzi na-adịrị andị Jentaịlụ nile, ha bụ ndị onye-amụma deworo maka ha, n’ihi na lee, ọbụrụ na ha ga-echegharị ma ghara ịlụ ọgụ megide Zaịọn, ma ghara ijikọta onwe ha nye bnnukwu nzukọ nke ahụ rụrụ arụ, a ga-azọpụta ha, n’ihi na Onye-nwe Chineke ga-emezu cọgbụgba-ndụ ya nile nke o meworo nye ụmụ ya; ma n’ihi nke a, onye-amụma ahụ edewo ihe ndị a nile.

13 Ya mere, ndị na-alụ ọgụ megide Zaịọn na ndị ọgbụgba-ndụ nke Onye-nwe ga aracha uzuzu nke ụkwụ ha; ma ndị nke Onye-nwe aihere agaghị eme ha. N’ihi na ndị nke Onye-nwe bụ ndị nke bna-eche ya; n’ihi na ha ka nọkwa na-eche ọbịbịa nke Mesaịa ahụ.

14 Ma lee, dịka okwu nile nke onye-amụma ahụ siri dị, Mesaịa ahụ ga-ejikere onwe ya ọzọ nke augbọrọ abụọ ka o wee kpọghachị ha; ya mere, ọ bga-egosịpụta onwe ya nye ha n’ike na nnukwu otuto, ruo na cmbibi nke ndị iro ha nile, mgbe ụbọchị ahụ ga-abịa mgbe ha ga-ekwere na ya; ma ọdịghị onye ọbụla ọ ga-ebibi nke kwere na ya.

15 Ma ndị na-ekweghị na ya ka a aga-ebibi, site bn’ọkụ, na site n’ebili mmiri, na site n’ala ọma-jijiji, na site n’ịkwafu ọbara, na site cn’ajọọ ọrịa, na site n’ọnwụ. Ma ha ga-amata na Onye-nwe bụ Chineke, Onye-Nsọ nke Israel.

16 aN’ihi na a ga-ewepụ anụ-ịkpa-nri n’ebe ndị ka ha ike nọ, ma-ọbụ a ga-anapụta bndị adọkpụtara n’agha n’ụzọ zịrị ezi?

17 Ma otu a ka Onye-nwe kwuru: Ọbụna andị adọkpụtara n’agha a ga-anapụta ha, ma anụ-ịkpa-nri nke ndị dị egwu ka a ga-anapụta; n’ihi na bChineke bụ Dike cga-anapụta ndị ọgbụgba-ndụ nke ya. N’ihi na otu a ka Onye-nwe kwuru: a ga m adọ ndọrọ-ndọrọ mụ na ndị na-adọso gị ndọrọ-ndọrọ—

18 Ma a ga m enyeju ha afọ bụ ndị na-emegide gị, site n’anụ arụ ha onwe ha; ọbara ha ga-egbu ha dịka mmanya na-atọ bịrịbịrị; ma anụ arụ nile ga-amata na mụ, bụ Onye-nwe, bụ Onye-nzọpụta gị na aOnye-mgbapụta gị, bOnye bụ Dike nke Jekọb.