Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 23


Isi 23

Mbibi nke Babịlọn ahụ bụ otu ụdị nke mbibi ga-adi n’Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ ahụ—Ọ ga-abụ ụbọchị nke oke iwe na ibọ-ọbọ—Babịlọn (ụwa) ga-ada ruo mgbe nile—Tulee Aịsaịa 13. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 aIbu-arọ nke bBabịlọn, nke Aịsaịa nwa Amoz hụrụ.

2 Welite nụ aọkọlọtọ n’elu ugwu ukwu dị elu, welitere nụ ha olu elu bfeenụ aka, ka ha wee baa n’ọnụ ụzọ ama nke ndị a ma ama.

3 E nyewo m ndị m aedoworo nsọ iwu, A kpọwo kwa m ndị nke m dị ike, n’ihi na iwe m abịakwasịghị ha bụ ndị na-an̄ụrị-ọn̄ụ n’idi elu nke m.

4 Mkpọtụ nke igwe mmadụ n’ime ugwu ukwu nile dịka nke ọtụtụ mmadụ, mkpọtụ nke nnukwu ọgba-aghara nke aala-eze mba nile bachịkọtara ọnụ, Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha na-akpọkọta igwe nile nke agha ahụ.

5 Ha si mba dị anya bịa, site n’ebe elu-igwe sọtụrụ, e, Onye-nwe, na ngwa-ọgụ nke iwe ọkụ ya, ibibi ala nile ahụ.

6 Tisie nụ mkpu ike, n’ihi na ụbọchị nke Onye-nwe abiarutewo; ọ ga-abịa dịka mbibi sitere n’aka Onye ahụ Pụrụ Ime Ihe nile.

7 Ya mere aka nile ga-ada mba, obi mmadụ nile ga-agbaze;

8 Ma ha ga-atụ egwu; arụ ụfụ na mwute ga-ejide ha; ọ ga-atụ ha n’anya otu onye n’ebe ibe ya nọ; iru ha nile ga-adị ka ire ọkụ.

9 Lee, ụbọchị nke Onye-nwe na-abịa, obi ọjọọ na iwe ọkụ na iwe dị egwụ, iji mee ka ala ahụ tọgbọrọ n’efu; ma ọ aga-ebibi ndị mmehie bi n’ime ya.

10 N’ihi na kpakpando nile nke elu-igwe na mmụkasị nile nke ha n’elu agaghị enye ìhè ha; aanyanwụ ga-agbaji oji n’ije ya, ma ọnwa agaghị eme ka ìhè ya nwuo.

11 Ma a ga m aata ụwa ahụhụ n’ihi ihe ọjọọ, ma ndị ajọọ-omume n’ihi ajọọ-omume; A ga m eme ka mfuli-elu nke bndị mpako kwụsị, ma aga m ebuda nganga nke ndị dị egwu.

12 Aga m eme ammadụ ka ọ dị oke ọnụ ahịa karịa ọmarịcha ọla-edo; ọbụna mmadụ karịa ọla-edo ọma nke Ophir.

13 Ya mere, aga m eme ka elu-igwe nile megharịa arụ, ma ụwa aga-apụ site n’ebe ọ nọ, n’iwe ọkụ nke Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha; ma n’ụbọchị nke oke iwe ya dị egwụ.

14 Ma ọ ga-adị ka aanụ-ọhịa a na-achụ ọsọ, ma dịka atụrụ na-enweghị onye welitere ya; ma ha mmadụ ọbụla ga-laghachịkwuru ndị nke ya, ma gbalaga onye ọbụla n’ime ala nke ya.

15 Onye ọbụla nke na-afuli-elu ka a ga-arụfe mma; e, ma onye ọbụla nke a na-ejikọta ya na ndị ajọọ-omume ga-ada site na mma agha.

16 Ụmụ ha, ka a ga-akụpịa irighiri-irighiri n’iru ha; ụlọ ha ka a ga-ebibi ma ndị nwunye ha ka a ga-ebupu.

17 Lee, A ga m apalite ndị Medes imegide ha, ndị na-agaghị ele ọla-ọcha ma-ọbụ ọla-edo anya, ọbụghị ma ha ga-enwe mmasị n’ebe ha dị.

18 Ụta ha ga-atụpịa kwa ụmụ okorọbịa ahụ irighiri irighiri; ma ha a gaghị enwe obi ọmiko n’ebe mkpụrụ nke afọ dị; anya ha agaghị emere ụmụaka ebere.

19 Ma Babịlọn, ebube nke ala-eze nile, aịma mma nke ndị Kaldịa, ga-adị ka mgbe Chineke kwaturu bSọdọm na Gọmora.

20 Ọ dịghị onye aga-ebi kwa n’ime ya ọzọ, ọbụghị ma a ga-ebi n’ime ya site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ: ọbụghị ma ndị Arebịa ga-amanye ụlọ ikwuu ha n’ebe ahụ; ọbụghị ma ndị ọzụzụ-atụrụ ha ga-eme ka atụrụ ha makpuo n’ebe ahụ.

21 Ma aoke anụ ọhịa nile nke ọzara ahụ ga-edịna n’ebe ahụ; ma ụlọ ha nile ga-ejupụta n’anụ ndị na-eti ajọọ mkpu; ma ikwikwi nile ga-ebi n’ebe ahụ, ma bewu ọhịa ga-agba egwu n’ebe ahụ.

22 Ma oke anụ ọhịa nile nke ala nile mmiri gbara gburu-gburu ga-ebe akwa an’ụlọ ha ndị ahụ tọgbọrọ n’efu, ma bnkịta ọhịa nile n’obi-eze ha nile mara-mma; ma oge ya na-abịa nso, ma ụbọchị ya agaghị etowanye ogologo. N’ihi na aga m ebibi ya ọsọ-ọsọ; e, n’ihi na aga m enwe obi-ebere n’ebe ndị m nọ, mana ndị ajọọ-omume ga-ala-n’iyi.