Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 12


Isi 12

Aịsaịa wee hụ temple nke ụbọchị-ikpeazụ, mkpọkọta nke Israel, na ikpe nke oge Jisus ga-abịa n’ụwa chịa otu puku afọ na udo—Ndị mpako na ajọọ-omume ka a ga-eweda ala n’Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ—Tulee Aịsaịa 2. Ihe dika n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 Okwu nke aAịsaịa, nwa nwoke nke Amọz, bhụrụ gbasara Juda na Jerusalem:

2 Ma ọ ga-eru n’ụbọchị ikpe-azụ nile, mgbe a ga ewulite augwu nke bụlọ Onye-nwe n’elu ugwu nile, ma a ga-ebulite ya elu karịa cụgwụ-nta nile, ma mba nile ga-ekwobakwute ya.

3 Ma ọtụtụ mmadụ ga-eje na-asị, Bịanụ, ka anyị gbagoro n’ugwu nke Onye-nwe, n’ụlọ nke Chineke nke Jekọb; ma ọ ga akụziri anyị maka ụzọ ya nile, ma aanyị ga-aga n’ụzọ ya nile; n’ihi na site na Zaịọn ka biwu ahụ ga-esi pụta, ma okwu nke Onye-nwe site na Jerusalem.

4 Ma ọ aga-ekpe ikpe n’etiti mba nile, ma ọ ga-abara ọtụtụ mmadụ mba: ma ha ga akụ mma-agha ha nile n’ime igwe-eji amari ala, ma igwe-eji amari ala ha n’ime mma ntakịrị rọrọ arọ eji ebecha ngalaba osisi—mba agaghị ebulite mma-agha megide mba, ọbụghị ma ha ga amụta ịlụ ọgụ ọzọ.

5 O ụlọ nke Jekọb, bịanụ ka anyị gaa ije n’ìhè nke Onye-nwe; e, bịa, n’ihi na unu nile aakpafusịwo, onye ọbụla n’ụzọ ajọọ-omume ya nile.

6 Ya mere, O Onye-nwe ịrapụwo ndị nke gị, ụlọ nke Jekọb, n’ihi na ha aemejupụtawo mkpa ha ọzọ site na ọwụwa-anyanwụ, ma n̄aa ntị n’olu ndị ọkọwa-akara aka dịka ndị bFilistịa, ma cha na-eme onwe ha obi ụtọ n’arụ ụmụ ndị mba ọzọ.

7 Ala ha kwa jupụtara na ọla-ọcha na ọla-edo, ọbụghị ma enwere ọgwụgwụ n’ebe akụ ha nile dị; ala ha jupụtakwara na ịnyịnya-ibu, ọbụghị ma enwere ọgwụgwụ dịrị ụgbọ ala ha nile.

8 Ala ha jupụtakwara an’arụsị apịrị-apị; ha na-efe ọrụ nke aka ha, ihe nke mkpịsị-aka ha nile meworo.

9 Ma onye-na-abụghị ezigbo mmadụ aanaghị erudata ala, ma nnukwu mmadụ anaghị-enwe ume-ala, ya mere, agbaghakwarala ya.

10 O unu ndị ajọọ-omume, baa nụ n’ime nkume, ma azoo onwe unu n’ime uzuzu, n’ihi na ịtụ egwu nke Onye-nwe na ebube nke ịbụ-eze ya ga akụtu unu.

11 Ma ọ ga-eru na olile-anya mpako nke mmadụ ka a ga-eweda ala, ma mbụli-elu nke mmadụ ka a ga-ekpu iru n’ala, ma nanị Onye-nwe ka a ga-ebuli-elu n’ime ụbọchị ahụ.

12 N’ihi na aụbọchị nke Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha na-abịa ọsọ-ọsọ n’elu mba nile, e, n’elu onye ọbụla; e, n’elu bndị mpako na ndị na-ebuli onwe ha elu, na n’elu onye ọbụla nke e buliri elu, ma a ga-ewedata ya.

13 E, ma ụbọchị nke Onye-nwe ga-abịakwasị osisi sida nile nke Lebanon, n’ihi na ha dị elu bụrụ ihe ndị ebuliri elu; na n’elu osisi oak nile nke Bashan.

14 Ma n’elu ugwu-ukwu nile, na n’elu ugwu-nta nile, ma n’elu mba nile ndị ebuliworo elu, ma n’elu ndị mmadụ nile;

15 Ma n’elu ụlọ-elu tọwa nile dị elu, ma n’elu mgbidi nile ewuru ewu;

16 Ma n’elu ụgbọ-mmiri nile nke aosimiri, ma n’elu ụgbọ-mmiri nile nke Tashish, ma n’elu ihe-ile-anya nile e sere-ese na-enye mmasị.

17 Ma mbụli-elu nke mmadụ ka a ga-erudata ala, ma ịkpa nganga nile nke mmadụ ka a ga-eme ka ọ dị ala; ma Onye-nwe nanị ya ka a ga-ebuli elu an’ụbọchị ahụ.

18 Ma arụsị-apịrị-apị nile ahụ ka ọ ga-akwụsị kpam kpam.

19 Ma ha ga-aga n’ime ọnụ nke nkume nile ahụ, ma n’ime ọgba nile dị n’ime ala, n’ihi na egwu nke Onye-nwe ga-abịakwasị ha, na ebube nke ịchị-eze ya ga-akụtu ha, mgbe ọ ga-ebili ịhụsi ụwa ike di-egwụ.

20 N’ụbọchị ahụ mmadụ aga-atụfu arụsị nile nke ọla-ọcha na arụsị nile nke ọla-edo, ndị nke o meworo onwe ya ka ọ na-efe, nye ụmụ oke na ụmụ ụsụ.

21 Ka ha ga n’ime oghere nile nke oke nkume nile, na n’ime elu nile nke mgbawa nkume, n’ihi na egwu nke Onye-nwe ga-abịakwasị ha ma ichi-eze nke otuto ya ga-akụtu ha, mgbe o ga-ebili ịhụsi ụwa ike dị-egwụ.

22 Si na ammadụ wezuga onwe gị, onye iku ume ya dị n’oghere imi ya; n’ihi na n’ime gịnị ka a ga-agụnye ya?