Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 17


Isi 17

Ifrem na Sịria busoro Juda agha—Kraịst ka a ga amụta site n’afọ nwa-agbọghọ-na-amaghị-nwoke—Tulee Aịsaịa 7. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma o wee ruo na n’ụbọchị nile nke Ahaz nwa nke Jotam, nwa nke Uzaịa, eze ndị Juda, ka Rizịn, eze ndị Siria, na Pika nwa nke Remalaịa, eze ndị Israel, galitere chee iru na Jerusalem ibuso ya agha, ma onweghị ike imeri ya.

2 Ma a gwara ya ụlọ nke Devid, na-asị: Siria ejikọtawo ndị-agha ya na aIfrem. Ma o metụrụ ya n’obi, ma obi nke ndị ya, dịka oke ifufe siri na-emetu osisi nile nke oke ọhịa.

3 Mgbe ahụ ka Onye-nwe gwara Aịsaịa: Gaa ugbua izute Ahaz, gị na aSheajashub nwa gị, na nsọtụ nke olulu-mmiri nke elu-elu ọdọ-mmiri di n’okporo ụzọ nke ama onye-mmezi akwa,

4 Ma sị ya: Lezie anya, ma nọrọ ajụu; atụla egwụ, ọbụghị ma obi gị ọ ga-ada mba n’ihi ọdụdụ abụọ ndị a nke ọlọkọ ọkụ na-akwụ anwụrụ ọkụ nile, n’ihi iwe dị ọkụ nke Rizịn na Sịria, na nke nwa Remalaịa.

5 N’ihi na Sịria, Ifrem, na nwa nke Remalaịa, anatawo ndụmọdụ ọjọọ imegide gị, na-asị:

6 Ka anyị rigo megide Juda ma kpasuo ya iwe, ma aka anyị kewaara ya onwe anyị ma debe eze n’etiti ya, e, nwa nke Tabeel.

7 Otu a ka Onye-nwe Chineke kwuru: Ọ gaghị eguzo, ọbụghị ma ọ ga-eru.

8 N’ihi na isi Sịria bụ Damaskọs, ma isi Damaskọs, Rizịn; ma n’ime iri afọ isii na ise ka a ga ekewa Ifrem ka ọ ghara ịbụ ndị ọbụla.

9 Ma isi nke Ifrem bụ Sameria, ma isi nke Sameria bụ nwa Remalaịa. Ọbụrụ na aunu agaghị ekwe n’ezie agaghị eme ka unu kwụsie ike.

10 Nke ka nke, Onye-nwe gwakwara Ahaz ọkwụ ọzọ na-asị:

11 Rịọnụ aihe-ịrịba ama n’aka Onye-nwe Chineke unu; rịọ ya ma-ọbụ n’ime omimi nile, ma-ọbụ n’ebe dị elu n’elu.

12 Ma na Ahaz wee sị: A gaghị m arịọ, ọbụghị ma m aga-anwa Onye-nwe.

13 Ma o wee si: Nụrụnụ ugbua, O ụlọ David; ọ bụ ihe ntakịrị na unu na-abụrụ mmadụ ike ọgwụgwụ, ma na unu ga-abukwara Chineke m ike ọgwụgwụ?

14 Ya mere, Onye-nwe n’onwe ya ga-enye unu ihe iriba-ama—Lee, anwa-agbọghọ na-amaghị-nwoke ga-atụrụ ime, ma ọ ga amụta nwa nwoke, ma ọ ga-akpọ aha ya bImmanuel.

15 Bọta na mmanụ-an̄ụ ka ọ ga-eri, ka o wee mata i jụ ihe ọjọọ na ka ọ họrọ ihe ọma.

16 N’ihi na tutu anwata ahụ amata ịjụ ihe ọjọọ na ịhọrọ ihe ọma, ala nke a Ị kpọrọ-asị ga-abụ ihe bndị eze ya abụọ hapụworo.

17 Onye-nwe aga-ewetakwasịrị gị, na wetakwasị ndị gị, na wetakwasị ụlọ nna gị, ụbọchị ndị na-abịabeghị site n’ụbọchị nke bIfrem hapụrụ Juda, eze nke Asịria.

18 Ma ọ ga-eru n’ụbọchị ahụ na Onye-nwe ga-eji aopi-ọnụ kpọkọta ijiji site n’ebe ala Ijipt sọtụrụ, ma an̄ụ site n’ala nke Asịria.

19 Ma ha ga-abịa, ma ọ ga-eme ka ha nile bekwasịrị na ndagwurugwu nile tọgbọrọ n’efu, na n’ime oghere nke okwute nile, na n’elu ogwu nile, na n’elu ahihịa nile.

20 N’ime otu ụbọchị ahụ ka Onye-nwe ga-eji mma agụba egotara egota, site n’aka ndị ofe osimiri, site n’aka aeze nke Asịria, bkpuchaa isi, na ajị-ụkwụ; ma ọ ga-erichapụ kwa àhụ̀-ọnụ ahụ.

21 Ma ọ ga-eru n’ụbọchị ahụ, na otu onye ga aazụ otu ehi na atụrụ abụọ.

22 Ma ọ ga-eru, n’ọnọdụ uju mmiri-ara-ehi ha ga-enye, o ga-eri bọta; n’ihi na bọta na mmanụ-an̄ụ ka mmadụ nile ga-eri bụ ndị fọdụrụ n’ala ahụ.

23 Ma ọ ga-eru n’ụbọchị ahụ, ebe nile ga abụ, ebe e nwere otu puku osisi-vine, ọnụ ahịa ya ruru otu puku aọla-ọcha, bụ ndị ga-adịrị uke nile na ogwu nile.

24 Akụ na ụta ka ndị mmadụ ga-eji bịaruo n’ebe ahụ, n’ihi na ala nile ahụ ga-aghọ uke nile na ogwu nile.

25 Ma ugwu nile nke a ga-eji igwe gwuo, ọ dịghị egwu ọbụla ga-adị nso n’ebe ahụ n’ihi uke na ogwu; mana ọ ga-abụ maka iziga oke ehi, na maka ịzọ ụkwụ nke aehị-nta ndị ọzọ.