Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 22


Isi 22

N’ụbọchị ọchịchị otu puku afọ n’elu ụwa mmadụ nile ga-eto Onye-nwe—Ọ ga-ebi n’etiti ha—Tulee Aịsaịa 12. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma n’ụbọchị ahụ ị ga-asị: O Onye-nwe, a ga m eto gị; ọbụnadị na iwe were gị n’ebe m nọ, ewezugawo iwe gị, ma ị na-akasi m obi.

2 Lee, Chineke bụ nzọpụta m, A ga m aatụkwasị-obi, ma ghara ịtụ-egwụ; n’ihi na Onye-nwe, bJehova bụ ume m na abụ m; ọ ghọwokwa nzọpụta m.

3 Ya mere, n’ọn̄ụ ka unu ga-esepụta ammiri site n’omimi mmiri nile nke nzọpụta.

4 Ma n’ụbọchị ahụ ka unu ga-asị: aToo Onye-nwe, kpọkụo aha ya, kwupụta ihe nile o mere n’etiti ndị mmadụ, kwute na aha ya ka ebuliri elu.

5 aBụkuo Onye-nwe abụ; n’ihi na o mewo ọtụtụ ihe dị ezi mma; nke a ka amataworo n’ụwa nile.

6 aBepụta akwa ma tie mkpu, unu ndị bi na Zaịọn; n’ihi na ukwuu ka Onye-Nsọ nke Israel dị n’etiti unu.