Akwụkwọ nsọ
Jakọb 1


Akwụkwọ nke Jekọb
Nwanne Nwoke nke Nifaị

Okwu nile nke nkwusa ozi-ọma ya nye ụmụnne ya nwoke. O tinyere nwoke onye nke chọworo ịkwada ozizi nke Kraịst na mgbagwọjụ-anya. Mkpụrụ okwu ole na ole gbasara akụkọ nke ndị Nifaị.

Isi 1

Jekọb na Josef wee chọọ ịtụgharị obi ndị mmadụ ịkwere na Kraịst na-idebe iwu-nsọ ya nile—Nifaị wee nwụọ—Ajọọ-omume wee jupụta n’etiti ndị Nifaị. Ihe dịka n’afọ 544 ruo 421 tutu amụọ Kraịst.

1 N’ihi na lee, o wee ruo mgbe iri afọ ise na afọ ise gafeworo site n’oge ahụ Lihaị hapụrụ Jerusalem; ya mere, Nifaị nyere mụ aJekọb, biwu gbasara cepekele ndị ntakịrị, ndị ọbụ n’elu ha ka a kanyere ihe ndị a.

2 Ma o nyere mụ, Jekọb, iwu ka m dee n’elu epekele ndị a ihe ole na ole ndị m chere na ha kachasịrị dị mkpa; na mụ agaghị ebịtụ aka ma ọbụghị na ọbụ na nke-nke, gbasara akụkọ nke ndị a bụ ndị a na-akpọ ndị nke Nifaị.

3 N’ihi na o kwuru na akụkọ nke ndị ya ka a ga-akanye n’elu epekele ya ndị ọzọ, ma na m ga-edokwa epekele ndị a ma nyefee ha na-agbada, nye mkpụrụ-afọ m, site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.

4 Ma ọbụrụ na e nwere ikwusa ozi-ọma nke dị nsọ, ma-ọbụ mkpughe nke dị ukwuu, ma-ọbụ ibu-amụma, na m ga-akanye aisi okwu ha nile n’elu epekele ndị a, ma rụtụ ha aka otu o si kwe omume, n’ihi Kraịst, na n’ihi ndị nke anyị.

5 N’ihi na maka okwukwe na nnukwu nchekasị, e mewo n’ezi okwu ka anyị mata gbasara ndị nke anyị, ihe ndị aga-eme ha.

6 Ma anyị nwetakwara ọtụtụ mkpughe, na mụọ nke nnukwu ibu-amụma; ya mere, anyị matara maka aKraịst na ala-eze ya, nke ga-abịa.

7 Ya mere anyị rụsịrị ọrụ ike n’etiti ndị nke anyị, ka anyị wee tụgharịa obi ha aịbịakwute Kraịst, ma keta oke n’ịdị mma nke Chineke, ka ha wee baa n’ime bizu-ike ya, na eleghị anya ọ ga-an̄ụ iyi n’oke iwe ya na ha agaghị caba n’ime, dịka n’ụdị dmkpasu-iwe n’ụbọchị nile nke ọnwụnwa mgbe ụmụ nke Israel nọ n’ime eọzara.

8 Ya mere, anyị ga-ekpere Chineke ka anyị wee nwe ike tụgharịa obi ndị mmadụ nile ka ha ghara ainupu-isi megide Chineke, bịkpasu ya iwe, ma na ka ndị mmadụ nile wee kwere na Kraịst, ma lekwasị anya n’ọnwụ ya, ma taa ahụhụ nke cobe ya ma buru ihere nke ụwa; ya mere, mụ, Jekọb, e werewo ya n’isi onwe m imezu iwu nke nwanne m nwoke Nifaị.

9 Ugbua Nifaị malitere ime okenye ma ọ hụrụ na ya aga-anwụrịrị na nso; ya mere, o btere otu nwoke mmanụ ka ọ bụrụ eze na onye-ọchịchị n’etiti ndị ya ugbua, dịka ọchịchị nile nke cndị eze siri dị.

10 Ndị mmadụ, ebe ha hụrụ Nifaị n’anya karịa, ya, ebe ọ bụworo oke onye-nchekwa nye ha, ebe o jiworo amma agha nke Leban mee ihe mgbochị nke ha, ma ebe ọrụsịworo ọrụ ike n’ụbọchị ya nile n’ihi ọdịmma nke ha—

11 Ya mere, ndị mmadụ chọsịrị ike idota aha ya na ncheta. Ma onye ọbụla nke ga-achị n’ọnọdụ ya ka ndị mmadụ kpọrọ, Nifaị nke abụọ, Nifaị nke atọ, ma otu ahụ gaa n’iru, dịka ọchịchị nile nke ndị eze siri dị; ma otu a ka ndị mmadụ siri na-akpọ ha, ha zaa aha ọbụla dị ha mma.

12 Ma o wee ruo na Nifaị nwụrụ.

13 Ugbua ndị mmadụ na-abụghị andị Leman bụ bndị Nifaị; otu o sila dị, a na-akpọ ha ndị Nifaị, ndị Jekọb, ndị Josef, cndị Zorọm, ndị Leman, ndị Lemuel, na ndị Ịshmel.

14 Mana mụ, Jekọb, site ugbua agaghị eji aha ndị a ekewa ha, ma na aga m aakpọ ha ndị Leman ndị na-achọ ibibi ndị nke Nifaị, na ndị nke ha na ndị nke Nifaị dị na mma aga m akpọ ha bndị Nifaị, ma-ọbụ cndị nke Nifaị, dịka ọchịchị nile nke ndị eze siri dị.

15 Ma ugbua o wee ruo na ndị nke Nifaị, n’okpuru ọchịchị nke eze nke abụọ, malitere ito n’imesi obi ha ike, ma tinye onwe ha n’ụdị ime ajọọ-omume dị iche iche dịka nke Devid nke mgbe ochie ịchọsi ọtụtụ andịnyom ike na enyi ndịnyom, na kwa Solomon, nwa ya.

16 E, ma ha malitekwara ịchọ nnukwu ọla-edo na ọla-ọcha, ma malite ibuli onwe ha elu n’ụdị mpako.

17 Ya mere mụ, Jekọb, nyere ha okwu ndị a oge m na-akụziri ha ihe n’ime atemple, ebe m nwetaworo bije-ozi m site n’aka Onye-nwe.

18 N’ihi na mụ, Jekọb, na nwanne m nwoke Josef bụ ndị nchụ-aja na ndị nkuzi e adowororịị nsọ nke ndị a, site n’aka nke Nifaị.

19 Ma anyị rụzuru aọkpụkpọ-oku nke anyị nye Onye-nwe, buru n’isi anyị bọrụ nile dị n’ime ya, na-aza mmehie nile nke ndị ahụ n’isi onwe anyị ma ọbụrụ na anyị akụzirighị ha okwu nke Chineke site n’ịrụsi ọrụ nile ike; ya mere, site n’iji ike anyị rụọ ọrụ anyị cọbara ha agaghị abịakwasị uwe anyị nile; ma ọbụghị otu a, ọbara ha ga-abịakwasị uwe anyị nile, ma agaghị enweta anyị na-enweghị ntụpọ n’ụbọchị ikpeazụ.