Akwụkwọ nsọ
1 Niphaị 12


Isi 12

Nifaị wee hụ n’ọ́hụ̀ ala e kwere na nkwa; ezi-omume ahụ, ajọọ-omume, na ọdịda nke ndị bi n’ime ya; ọbịbịa nke Nwa-atụrụ nke Chineke n’etiti ha; otu ndị Na-eso Ụzọ Iri na Abụọ na Ndị-ozi Iri na Abụọ ga-esị kpee Israel ikpe; na ọnọdụ enweghị mmasị na iru-inyi nke ndị na-ala azụ site n’ekweghị ekwe. Ihe dịka n’afọ 600 ruo 592 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma o wee ruo na mụọ-ozi ahụ gwara m sị: Lee, ma hụ mkpụrụ-afọ nke gị, na kwa mkpụrụ-afọ nke ụmụnne gị. Ma e lere m ma hụ aala ahụ e kwere na nkwa; ma a hụrụ m igwe ndị mmadụ nile, e, ọbụna dịka ọnụ-ọgụgụ ha ọ dị ọtụtụ dịka aja dị n’ime oke- osimiri.

2 Ma o wee ruo na a hụrụ m igwe mmadụ nile gbakọrọ ịlụ agha, otu megide ibe ya; ma a hụrụ aagha nile, na asịrị nile nke agha nile, na oke ogbugbu nile nke mma agha n’etiti ndị m.

3 Ma o wee ruo na a hụrụ m ọtụtụ ọgbọ ka ha gafere, site n’ụdị agha nile na ndọrọ-ndọrọ nile dị n’ala ahụ; ma a hụrụ m ọtụtụ obodo-ukwu, e, ọbụna na agụtaghị m ha ọnụ.

4 Ma o wee ruo na a hụrụ m aigirigi nke bọchịchịrị n’elu iru nke ala e kwere na nkwa; ma a hụrụ m amụma nile, ma a nụrụ m egbe-elu igwe nile, na ala ọma jijiji nile, na ụdị mkpọtụ nsogbu nile; ma a hụrụ m ala ahụ na nkume nile, na ha na-ekewasị, ma a hụrụ m ugwu nile ka ha na-atụgharị na agbarịsị; ma a hụrụ m obosara ala nke ụwa, ka ha gbawasịrị; ma a hụrụ m otutụ obodo-ukwu ka ha cmiri n’ime ala; ma a hụrụ m ọtụtụ ka ha gbara ọkụ; ma a hụrụ m ọtụtụ ndị nke tụgharịrị daa n’ala, n’ihi ọma jijiji ahụ.

5 Ma o wee ruo ka m hụchara ihe ndị a nile, a hụrụ m aigirigi nke ọchịchịrị ka ọ gafere n’elu iru nke ụwa ahụ, ma lee, a hụrụ m igwe mmadụ nile ndị na-adabeghị n’ihi nnukwu ikpe dị egwụ nke Onye-nwe.

6 Ma a hụrụ m elu-igwe nile ka o meghere, na aNwa-atụrụ nke Chineke ka ọ na-arịdata site n’elu-igwe; ma ọ gbadatara ma gosị ha onwe ya.

7 Ma a hụkwara m ma na-agba ama na Mụọ Nsọ dakwasịrị airi na abụọ ndị ọzọ; e wee chie ha echichi nke Chineke, ma họpụta ha.

8 Ma mụọ-ozi ahụ gwara m okwu, si: Lee ndị na-eso ụzọ iri na abụọ nke Nwa-atụrụ ahụ ndị a họpụtara ikwusa ozi-ọma nye mkpụrụ-afọ gị.

9 Ma o wee si m: I chetara andị-ozi iri na abụọ nke Nwa-atụrụ ahụ? Lee bha bụ ndị ga-ekpe agbụrụ iri na abụọ nke Israel ikpe; ya mere, ndị-ozi iri na abụọ nke mkpụrụ afọ gị ka ha ga-ekpe ikpe; n’ihi na unu bụ ndị si n’ụlọ nke Israel.

10 Ma ndị-ozizi airi na abụọ ndị a ị hụrụ ga-ekpe mkpụrụ-afọ gị ikpe. Ma, lee, ha bụ ndị ezi-omume ruo mgbe nile; n’ihi na ọ bụ maka okwukwe ha n’ime Nwa-atụrụ nke Chineke ka buwe ha na-enwu ọcha site n’ọbara ya.

11 Ma mụọ-ozi ahụ gwara m okwu sị m: Lee! Ma e lere m, ma hụ aọgbọ atọ gafere n’ezi-omume; ma uwe ha dị ọcha dịka nke Nwa-atụrụ nke Chineke. Ma mụọ-ozi ahụ wee sị m: E mere ka ndị a dị ọcha n’ime ọbara nke Nwa-atụrụ ahụ, n’ihi okwukwe ha nwere na ya.

12 Ma mụ, Nifaị, hụkwara ọtụtụ n’ime aọgbọ nke anọ ndị gafere n’ezi-omume.

13 Ma o wee ruo na a hụrụ m igwe mmadụ nile nke ụwa ka ha gbakọtara.

14 Ma mụọ-ozi ahụ wee sị m: Lee mkpụrụ-afọ gị, na kwa mkpụrụ-afọ nke ụmụnne gị.

15 Ma o wee ruo na e lere m ma hụ ndị mmadụ nke mkpụrụ-afọ m ka ha gbakọtara n’igwe ana-emegide mkpụrụ-afọ nke ụmụnne m; ma ha gbakọtara ịlụ agha.

16 Ma mụọ-ozi ahụ wee gwa m okwu, na-asị: Lee isi miri nke ammiri ruru inyi nke nna gị hụrụ; e, ọbụna bosimiri ahụ nke o kwuru maka ya; ma omimi ya bụ omimi nile nke cala mụọ.

17 Ma aigirigi nke ọchịchịrị bụ ọnwụnwa nile nke ekwensu, nke bna-ekpu isi n’anya, ma ga-emechị obi nile nke ụmụ nke mmadụ, ma na-edufu ha baa n’ime cụzọ nke sara mbara, ka ha laa n’iyi ma fuo.

18 Ma nnukwu na obosara aụlọ ahụ nke nna gị hụrụ, bụ bechiche nke efu nile ya na cmpako nke ụmụ nke mmadụ. Ma nnukwu na doke ọlụlụ dị egwụ kewara ha; e, ọbụna okwu nke eikpe zịrị ezi nke Chineke ebighi-ebi, na Mesaịa ahụ bu Nwa-atụrụ nke Chineke nke Mụọ Nsọ na-agba ama banyere ya site na mmalite ụwa wee ruo ugbua, na site ugbua ruo mgbe nile.

19 Ma mgbe mụọ-ozi na-ekwu okwu ndị a, e lere m ma hụ na mkpụrụ-afọ nke ụmụnne m nwere ndọrọ-ndọrọ megide mkpụrụ-afọ m, dịka okwu nke mụọ-ozi ahụ siri dị; ma n’ihi mpako nke mkpụrụ-afọ m, na aọnwụnwa nile nke ekwensu, m wee hụ na bike mkpụrụ-afọ nke ụmụnne m karịrị nke mkpụrụ-afọ m.

20 Ma o wee ruo na e lere m, ma hụ mkpụrụ-afọ nke ụmụnne m na ha emeriwo mkpụrụ-afọ m; na ha jegharịrị n’ìgwè n’elu iru nke ala ahụ.

21 Ma a hụrụ m ha ka ha gbakọtara n’ìgwè; ma a hụrụ m aagha nile na asịrị agha nile n’etiti ha; na n’ime agha nile na asịrị agha nile a hụrụ m ọtụtụ ọgbọ ka ha gafere.

22 Ma mụọ-ozi ahụ sịrị m: Lee ndị a aga-ala azụ n’ekweghị ekwe.

23 Ma o wee ruo na e lere m, mgbe ha laworo azụ n’ekweghị ekwe, ha ghọrọ ndị aoji, na-enweghị mmasị, bndị ruru inyi, jupụtara na cịnọ nkịtị na ụdị ihe arụ nile di iche iche.