Akwụkwọ nsọ
1 Niphaị 8


Isi 8

Lihaị hụrụ ọ́hụ̀ nke osisi nke ndụ—O wee rachaa mkpụrụ ya wee chọọkwa ka ndị ezi na ụlọ ya mee otu aka ahụ—Ọ hụrụ okporo igwe, ụzọ di wara-wara ma dị kwa mkpafa, na igirigị ọchịchịrị nke kpuchiri ndị mmadụ—Saraịa, Nifaị, na Sam wee rachaa mkpụrụ-osisi ahụ, ma Leman na Lemuel jụrụ ajụ. Ihe dịka n’afọ 600 ruo 592 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma o wee ruo na anyị kpokọtara ụdị mkpụrụ-osisi dị iche iche n’ụdị ọbụla, na mkpụrụ-akụkụ ubi n’ụdị ọbụla, ma kwa mkpụrụ-akụkụ nile nke mkpụrụ-osisi ndị ọzọ n’ụdị ọbụla.

2 Ma o wee ruo n’oge a nna m nọ n’ime ọzara, ọ gwara anyị okwu na-asị: Lee, aarọwo m nrọ; ma-ọbụ asụgharịa ya, ahụwo m bọ́hụ̀.

3 Ma lee, n’ihi ihe nke m hụrụ, ekwesịrị m ịn̄ụrị ọn̄ụ n’ime Onye-nwe n’ihi aNifaị na kwa Sam; N’ihi na o kwesịrị ka m buru n’obi na ha, na kwa ọtụtụ mkpụrụ-afọ ha, ka a ga-azọpụta.

4 Ma lee, aLeman na Lemuel, egwụ na-atụsi m ike maka unu; n’ihi na lee, ọ dị m ka m hụrụ na nrọ m, ọchịchịrị na ọzara dị egwụ.

5 Ma o wee ruo na ahụrụ m otu nwoke, ma o yi auwe nwụda ọcha; o wee bịa guzoro n’iru m.

6 Ma o wee ruo na ọ gwara m okwu, wee sị m soro ya.

7 Ma o wee ruo na mgbe m na-eso ya, m wee hụ onwe m ka m nọ n’ọchịchịrị n’ala tọgbọrọ n’efu ma dị kwa egwụ.

8 Ma mgbe m jegharịworo ọtụtụ oge n’ime ọchịchịrị ahụ, m wee malite ikpere Onye-nwe ka o meere m aebere, dịka ịba ụba nke ebere Ya nile siri dị.

9 Ma o wee ruo mgbe m kpesịworo ekpere nye Onye-nwe, m wee hụ nnukwu obosara aala.

10 Ma o wee ruo na m hụrụ aosisi, nke bmkpụrụ ya dị mmasị ime mmadụ obi ụtọ.

11 Ma o wee ruo na m garuru rachaa amkpụrụ si na ya; m wee hụ na ọ dị ụtọ nke ukwuu, karịa ndị nile m rachatụworo mbụ. E, m wee hụ na mkpụrụ osisi ahụ dị ọcha, karịa bọcha nile m hụtụworo.

12 Ma mgbe m na-aracha mkpụrụ-osisi a, o mejupụtara mụọ m n’oke aọn̄ụ karịrị akarị; ya mere, a malitere m bịchọsike na ezi na ụlọ m ga-eso kwa rachaa ya, n’ihi na a matara m na ọ cdị mmasị karịa mkpụrụ-osisi ndị ọzọ.

13 Ma mgbe m lere anya gburu-gburu, na eleghị-anya, m nwere ike chọta ezi na ụlọ m kwa, m wee hụ aosimiri nke mmiri; ma ọ na-ekwo ekwo, ma ọ dị kwa nso n’osisi nke a m nọ na-aracha mkpụrụ ya.

14 M wee lee ka m hụ ebe o si n’ekwopụta, m wee hụ isi ya, agamitụ ntakịrị: ma n’isi ya ebe ahụ ahụrụ m nne gị, Saraịa, na Sam, na Nifaị; ma ha guzokwara dịka ha amaghị ebe ha ga-eje.

15 Ma o wee ruo na m feere ha aka; ma etịkwara m mkpu sị ha bịakwute m, bịa ma rachaa mkpụrụ osisi ahụ, nke dị mmasị karịa mkpụrụ osisi ndị ọzọ.

16 Ma o wee ruo na ha bịakwutere m wee rachaa mkpụrụ osisi ahụ.

17 Ma o wee ruo na achọsịrị m ike na Leman na Lemuel ga-abịa soro rachaa kwa mkpụrụ osisi ahụ; ya mere, elepụrụ m anya n’ebe isi osimiri ahụ dị, na eleghị anya enwere m ike ịhu ha.

18 Ma o wee ruo na m hụrụ ha, ma ha ekweghị aịbịakwute m ịracha mkpụrụ-osisi ahụ.

19 Ma ahụrụ m aokporo igwe, ma ọ gbatịrị n’akụkụ osimiri ahụ, wee ruo n’osisi ahụ m guzoro n’akụkụ ya.

20 Ma ahụkwara m aụzọ di wara-wara ma dị kwa mkpafa nke soro okporo igwe ahụ bịa, wee ruo n’osisi ahụ m guzoro n’akụkụ ya; ma o wee gabiga kwa isi mmiri ahụ, wee chee iru na nnukwu obosara bala, nke dị kwa ka a ga-asị na ọ bụ ụwa.

21 Ma ahụrụ m igwe mmadụ anapụghị ịgụta ọnụ, nke ọtụtụ n’ime ha na-enufe na-aga n’iru, ka ha wee nweta aụzọ mkpafa ahụ gara n’ebe osisi ahụ m guzoro n’akụkụ ya dị.

22 Ma o wee ruo na ha gakwara n’iru, wee malite ịga n’ime ụzọ mkpafa nke gara n’osisi ahụ.

23 Ma o wee ruo na aigirigị ọchịchịrị gbachirị; e, ọbụna nnukwu igirigị ọchịchịrị, nke mere na ndị ahụ malitere gawa n’ụzọ mkpafa ahụ furu ụzọ, na ha site kwara ebe ọzọ wee kpafuo ma gafuo.

24 Ma o wee ruo na a hụrụ m ndị ọzọ ka ha na-enufe na-aga n’iru, ma ha bịaruru wee jide isi okporo igwe ahụ, ma ha na-enukwa na-aga n’iru site n’igirigị ọchịchịrị ahụ, jidesiekwa okporo igwe ahụ ike, ọbụna wee ruo mgbe ha pụtara wee rachaa amkpụrụ osisi ahụ.

25 Ma mgbe ha rachaworo mkpụrụ osisi ahụ ha wee legharịa anya dịka aga-asị na aihere mere ha.

26 Ma m wee legharịa kwa anya wee hụ, n’ofe osimiri nke mmiri ahụ, annukwu na obosara ụlọ; ma o guzokwara dịka ọ dị n’ikụkụ, n’ebe dị elu karịa ala.

27 Ma o jupụtakwara na mmadụ, ma ndị okenye ma ụmụ-ntakịrị, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị; ma uwe ha mara mma nke ukwuu; ma ha nọ kwa an’ụdị ịkwa emu ma na-atụ kwa ndị bịaruworo osisi ahụ ma na-aracha mkpụrụ ya aka.

28 Ma mgbe ha arachaworo mkpụrụ osisi ahụ bihere mere ha, n’ihi ndị ahụ na-akparị na-akwa kwa ha emu; cha wee daba n’ụzọ mkpafa nke asị esọla, wee fuo.

29 Ma ugbua mụ, Nifaị, anaghị ekwupụta aokwu nile nke nna m kwuru.

30 Mana, n’igbu ihe odide m na mkpirisi, lee, ọ hụrụ igwe mmadụ ọzọ na-enufe na-aga n’iru; ma ha bịara wee jisie isi aokporo igwe ahụ ike; ma ha nukwara ka ha na-aga n’iru, ma oge nile ha na-ejidesịkwa okporo igwe ahụ ike, wee ruo mgbe ha bịaruru wee daa n’ala ma rachaa mkpụrụ osisi ahụ.

31 Ma o wee hụkwa aigwe mmadụ ndị ọzọ na-achọgharị kwa ụzọ ịgarụ nnukwu na obosara ụlọ ahụ.

32 Ma o wee ruo na otutụ mmadụ rugburu n’ime aisi miri ahụ dị omimi; ma ọtụtụ fukwara site n’anya ya, na-akpagharị n’ụzọ ha na-amaghị.

33 Ma ọtụtụ ka igwe mmadụ ahụ dị bụ ndị bara n’ime ụlọ ahụ ha na-amaghị. Ma mgbe ha bara n’ime ụlọ ahụ ha tụrụ m aka n’ọnọdụ aịkwa emu, na kwa ndị ahụ na-aracha mkpụrụ osisi ahụ; ma anyị an̄aghị ha ntị.

34 Ndị a bụ okwu nke nna m: N’ihi na ka ha ra bụ ndị an̄ara ha ntị, ha nile adapụwọrịị.

35 Ma aLeman na Lemuel arachaghị mkpụrụ osisi ahụ, otu a ka nna m kwuru.

36 Ma o wee ruo mgbe nna m kwuworo okwu nile nke nrọ ma-ọbụ ọ́hụ̀ ya, nke dị ọtụtụ, o wee sị anyị, n’ihi ihe ndị a ọ hụrụ n’ọ́hụ̀, egwụ na-atụ ya nke ukwuu maka Leman na Lemuel; e, egwụ tụrụ ya na aga achụpụ ha site n’ebe Onye-nwe nọ.

37 Ma ọ gwasịkwara ha ike dịka anna nwere ịhun’anya, ka ha gee ntị n’okwu ya, na eleghị anya, Onye-nwe ga-emere ha ebere, ghara ịchụpụ ha; e, nna m kwusaara ha ozi-ọma.

38 Ma mgbe ọ gwachara ha ozi-ọma, ma buokwara ha amụma gbasara ọtụtụ ihe, o wee gwa ha ka ha na-edebe iwu-nsọ nile nke Onye-nwe; ma ọ kwụsịrị ịgwa ha okwu.