Akwụkwọ nsọ
1 Niphaị 16


Isi 16

Ndị ajọọ-mmadụ weere ezi-okwu ahụ ka ihe siri ike—Ụmụ nwoke Lihaị wee lụọ ụmụ-ada Ịshmel—Liahona ahụ na-eduzi ha ụzọ n’ime ọzara—Ozi nile si n’ebe Onye-nwe nọ ka e dere n’elu Liahona site n’oge ruo n’oge—Ịshmel wee nwụọ; ezi na ụlọ ya na-atamu n’ihi ọtụtụ mkpagbu. Ihe dịka n’afọ 600 ruo 592 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo na mgbe mụ, Nifaị, gwasịworo ụmụnne m okwu, lee ha sịrị m: I gwawo anyị ihe siri ike, karịa ka anyị nwere ike ịnagide.

2 Ma o wee ruo na a sịrị m ha na a ma m na-ekwuwo m ihe siri ike megide ndị ajọọ mmadụ, dịka ezi-okwu ahụ siri dị; ma ndị ezi-omume ka m kpeworo ikpe ziri-ezi, ma gbaa kwa ama, na a ga-ebuli ha elu n’ụbọchị ikpeazụ; ya mere, andị-ikpe mara na-ewere bezi-okwu ahụ ka ihe siri ike, n’ihi na o cgbutawo ha ruo n’etiti.

3 Ma ugbua ụmụnne m, ọbụrụ na unu bụ ndị ezi-omume ma jikere Ị n̄a ntị n’ezi okwu ahụ, ma tinye uchu n’ime ya, ka unu wee na a aga n’ịkwụ-ọtọ n’iru Chineke, mgbe ahụ unu agaghị atamu n’ihi ezi-okwu ahụ, na-asị: I na-ekwu ihe siri ike megide anyị.

4 Ma o wee ruo na mụ, Nifaị, gbara ụmụnne m ume, site n’ume m nile, ka ha na-edebe iwu-nsọ nile nke Onye-nwe.

5 Ma o wee ruo na ha mere onwe ha aumeala n’iru Onye-nwe, nke mere na e nwere m ọn̄ụ na nnukwu olile-anya n’ebe ha nọ, na ha ga-aga n’ụzọ nile nke ezi-omume.

6 Ugbua, ihe nile ndị a ka e kwuru ma mee n’oge nna m biri n’ụlọ ikwuu dị na ndagwụrụgwụ nke ọ kpọrọ Lemuel.

7 Ma o wee ruo na mụ, Nifaị, kpọọrọ otu anwa-ada nke Ịshmel ka ọ bụrụ bnwunye m; na kwa, ụmụnne m ndị nwoke kpọọrọ site na ụmụada Ịshmel ka ha bụrụ ndinwunye ha; na kwa cZorọm kpọọrọ isi nwa-ada Ịshmel ka ọ bụrụ nwunye ya.

8 Ma site otu a nna m emezuwọrị iwu-nsọ nile nke Onye-nwe ndị nke enyeworo ya. Na kwa, mụ, Nifaị, ka Onye-nwe gọziworo karịsịa.

9 Ma o wee ruo na olu nke Onye-nwe gwara nna m okwu n’abalị, ma nye ya iwu na n’echi ya ọ ga-amalite njem ya n’ime ọzara ahụ.

10 Ma o wee ruo na dịka nna m na-ebili n’ụtụtụ, ma ga n’iru n’ụzọ ụlọ ikwuu ahụ, na nnukwu ịtụ n’anya nye ya, o wee hụ n’elu ala abọl dị gburu-gburu nke aka ọlụ ya dị ịtụ n’anya; ma-ọbụ kwa ezigbo bras. Ma n’ime bọl ahụ e nwere mkpịsị ikuku oghọ abụọ; ma otu na-atụ aka n’ebe anyị ga-esị gaa n’ime ọzara ahụ.

11 Ma o wee ruo na anyị chịkọtara ihe nile ọbụla anyị kwesịrị ibu baa n’ime ọzara ahụ, na ihe oriri fọdụrụ ndị nke Onye-nwe nyeworo anyị; ma anyị werekwara mkpụrụ-osisi n’ụdị ọbụla anyị nwere ike ibute baa n’ime ọzara ahụ.

12 Ma o wee ruo na anyị werekwara ụlọ-ikwuu anyị ma bilie ije n’ime ọzara ahụ, gafee osimiri Leman ahụ.

13 Ma o wee ruo na anyị gara njem ogologo ụbọchị anọ, ọ fọdụrụ ntakịrị ka ọbụrụ ofe ndịda-ndịda ọwụwa anyanwụ, ma anyị rụnyere ụlọ ikwuu anyị ọzọ; ma anyị kpọrọ aha ebe ahụ Sheza.

14 Ma o wee ruo na anyị weere ụta anyị nile na akụ anyị nile, ma banye n’ime ọzara ahụ igbutere ezi na ụlọ anyị ihe oriri, ma mgbe anyị gbutechara ihe oriri maka ezi na ụlọ anyị nile, anyị wee laghachị ọzọ n’ebe ezi na ụlọ anyị nọ n’ime ọzara, ruo n’ebe ahụ bụ Sheza. Ma anyị gabakwara ọzọ n’ime ọzara ahụ, sorokwa otu ụzọ ahụ, na-aga n’akụkụ kacha mma ịmị mkpụrụ nke ọzara ahụ, nke dị n’oke-ala nile dị nso aOke Osimiri Uhie.

15 Ma o wee ruo na anyị gara njem ogologo ọtụtụ ụbọchị, na-egbuta ihe oriri n’ụzọ, jiri ụta anyị nile na akụ anyị nile na okwute anyị nile na eriri-ébè anyị nile.

16 Ma anyị soro antụzi-aka ụzọ nke bọl ahụ, nke duru anyị na-aga n’ebe kachasị mma ịmị mkpụrụ nke ọzara ahụ.

17 Ma mgbe anyị gaworo njem ogologo ọtụtụ ụbọchị, anyị rụnyere ụlọ ikwuu anyị na nwa ogologo oge, ka anyị zuo ike ọzọ ma nweta ihe oriri nye ezi na ụlọ anyị.

18 Ma o wee ruo na dịka mụ, Nifaị, gara igbute ihe oriri, lee, a gbajịrị m ụta m, nke e jiri ezigbo aigwe mee; ma mgbe m gbajiworo ụta m, lee, ụmụnne m were iwe n’ebe m nọ maka mmebi nke ụta m, n’ihi na anyị enwetaghị ihe oriri.

19 Ma o wee ruo na anyị laghachịkwutere ezi na ụlọ anyị na-ejighi ihe oriri, ma ebe ọbụ na ike gwụrụ ha nke ukwuu, site na njem ha, ha tara nnukwu ahụhụ maka e nweghị ihe oriri.

20 Ma o wee ruo na Leman na Lemuel na ụmụ Ịshmel ndị nwoke malitere ịtamu karịa, n’ihi ahụhụ nile na mkpagbu nile ha n’ime ọzara ahụ; na kwa nna m malitere ịtamu megide Onye-nwe bụ Chineke ya; e, ma ha nile nọ na mwute karịa, nke mere na ha tamuru megide Onye-nwe.

21 Ugbua o wee ruo na mụ, Nifaị, ebe ọbụ na m nọ na nsogbu mụ na ụmụnne m n’ihi nmebi nke ụta m mebiri, na kwa ụta ha tufuworo eriri-ọdụdọ ha, ihe wee malite isi ike karịa, e, nke mere na anyị enweghị ike inweta ihe oriri.

22 Ma o wee ruo na mụ, Nifaị, gwara ụmụnne m nwoke okwu ọtụtụ okwu, n’ihi na ha emesiwokwa obi ha nile ike ọzọ, nke mere na ha akpesara mkpesa megide Onye-nwe bụ Chineke ha.

23 Ma o wee ruo na mụ, Nifaị, mepụtara ụta site n’osisi, ma site na mkpịsị osisi guzoro kwem, akụ; ya mere, e jikere m onwe m n’ijide ụta na akụ, n’ijide eriri-ébè na ijide ọtụtụ okwute. Ma a siri m anna m: O lee ebe m ga-eje inweta ihe oriri?

24 Ma o wee ruo na ọ ajụtara n’aka Onye-nwe, n’ihi na ha ewedatawọrị onwe ha n’ihi okwu m nile; n’ihi na e kwuuru m ha ọtụtụ ihe site n’ike nile nke mkpụrụ-obi m.

25 Ma o wee ruo na olu nke Onye-nwe bịaruru nna m, ma a tara ya aahụhụ n’ezie n’ihi ntamu ya megide Onye-nwe, nke mere na e wedatara ya n’ime omimi nile nke mwute.

26 Ma o wee ruo na olu nke Onye-nwe sịrị ya: Lekwasị anya na bọl ahụ, ma lee ihe ndị e dere.

27 Ma o wee ruo na mgbe nna m hụrụ ihe ndị e dere n’elu bọl ahụ, ọ tụrụ egwụ ma maakwa jijiji karịa, na kwa ụmụnne m ndị nwoke na ụmụ Ịshmel ndị nwoke na ndị nwunye anyị.

28 Ma o wee ruo na mụ, Nifaị, hụrụ ntụ-aka nile dị n’ime bọl ahụ, na ha na-arụ ọrụ dịka aokwukwe na ume na ịn̄a ntị nke anyị nyere ha.

29 Ma e dekwara n’elu ha ihe odide ọhụrụ nke dị mfe ọgụgụ, nke nyere anyị anghọta gbasara ụzọ nile nke Onye-nwe; ma e dere ya ma na-agbanwe ya site n’oge ruo n’oge, dịka otu okwukwe na ume nke anyị nyere ya ha. Ma otu a ka anyị siri hụ na site na bihe ntakịrị ka Onye-nwe na-esị ewepụta nnukwu ihe nile.

30 Ma o wee ruo na mụ, Nifaị, gara rigo n’elu ugwu, dịka ntụzi-aka nke e nyere site na bọl ahụ siri dị.

31 Ma o wee ruo na e gburu m anụ ọhịa, nke mere na enwetara m ihe oriri maka ezi na ụlọ anyị nile.

32 Ma o wee ruo na a laghachịrị m n’ụlọ ikwuu anyị, buru anụ ndị ahụ m gbuworo; ma ugbua, mgbe ha hụrụ na m e wetawo ihe oriri, lee nnukwu ọn̄ụ ha nwere! Ma o wee ruo na ha mere onwe ha umeala n’iru Onye-nwe, ma nye ya ekele.

33 Ma o wee ruo na anyị malitere njem anyị ọzọ, na-aga ọfọdụrụ ntakịrị ka ọ bụrụ otu ụzọ dịka na mmalite; ma mgbe anyị gaworo njem ọtụtụ ụbọchị anyị rụnyere ụlọ ikwuu anyị ọzọ, ka anyị wee nọrọ nwa oge na adịghị anya.

34 Ma o wee ruo na aỊshmel nwụrụ, ma e liri ya n’ebe a na-akpọ Nahọm.

35 Ma o wee ruo na ụmụ-ada nile nke Ịshmel ruru uju karịa, n’ihi ọnwụ nke nna ha, na n’ihi amkpagbu ha nile n’ime ọzara ahụ; ma ha tamuru megide nna m, n’ihi na ọ bụ ya kpọpụtara ha site n’ala Jerusalem, na asị: Nna anyị anwụwo, e, ma anyị awagharịwo hienne n’ime ọzara, ma anyị atawo ahụhụ oke mkpagbu, agụụ, akpịrị-ịkpọ-nkụ, na ike ọgwụgwụ, ma mgbe ahụhụ ndị a nile gasịrị, anyị ga-anwụrịrị n’ime ọzara a site na agụụ.

36 Ma otu a ka ha tamuru megide nna m, na kwa megide m; ma ha chọsịrị ike ịlaghachị Jerusalem ọzọ.

37 Ma Leman sịrị Lemuel na kwa ụmụ nwoke nke Ịshmel: Lee, aka anyị gbuo nna anyị, na kwa nwanne anyị nwoke, Nifaị, onye meworo onwe ya bonye ọchịchị na onye-nkuzi anyị, bụ ụmụnne ya nwoke ndị tọrọ ya.

38 Ugbua, ọ na-ekwu na Onye-nwe agwawo ya okwu, na kwa na andị mụọ-ozi abịakwutewo ma kuziere ya ihe. Mana lee, anyị ma na ọ bụ okwu ụgha ka ọ gwara anyị; ma ọ na-agwa anyị ihe ndị a, ma ọ na-arụ ọtụtụ ihe site na nka nke aghụghọ ya, ka o wee megharịa anyị anya, na-eche, mgbe ụfọdụ, na ya nwere ike idufu anyị n’ime ọzara nke na-amaghị anyị arụ; ma mgbe o dufuworo anyị, o chewo ime onwe ya eze na onye-ọchịchị nke anyị, na ọ ga-emeso anyị dịka ọchịchọ na mmasị ya siri dị. Ma n’ụdị dị otu a ka nwanne m nwoke Leman siri kpasuo ha iwe n’obi.

39 Ma o wee ruo na Onye-nwe nọnyere anyị, e, ọbụna olu nke Onye-nwe bịara gwa ha ọtụtụ okwu, ma ọ tara ha aahụhụ karịa; ma mgbe a tasịrị ha ahụhụ site n’olu nke Onye-nwe ha chifuru iwe ha, ma ha chegharịrị site na mmehie ha nile, nke mere na Onye-nwe gọzikwara anyị ọzọ site n’ihe oriri, nke mere na anyị alaghị n’iyi.