Akwụkwọ nsọ
1 Niphaị 10


Isi 10

Lihaị wee buo-amụma na ndị Babịlọn ga-adọkpụrụ ndị Juu n’agha—O wee kwuo maka ọbibịa n’etiti ndị Juu nke Mesaịa, Onye-nzọpụta, Onye-mgbapụta—Lihaị wee kwuo kwa maka ọbịbịa nke otu onye ga-eme Nwa-atụrụ Chineke baptism—Lihaị wee kwuo maka ọnwụ na mbilite n’ọnwụ nke Mesaịa—O jiri mkposasị na mkpọkọta nke ụmụ Israel tụnyere osisi olive—Nifaị wee kwuo maka Ọkpara nke Chineke, onyinye nke Mụọ Nsọ, ya na mkpa ọ dị ime ezi-omume. Ihe dịka n’afọ 600 ruo 592 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua mụ, Nifaị, na-aga n’iru inye nkọwasị ihe m meworo n’elu aepekele ndị a, na ọchịchị na ije-ozi m; ya mere, n’ịga n’iru na nkọwasị m, m ga-ekwubiri ntakịrị okwu gbasara ihe nile nke nna m, na kwa nke ụmụnne m.

2 Ma lee, o wee ruo ka nna m kwusịrị okwu gbasara anrọ ya, na kwa ịgba ha ume ka ha lụsie ọlụ ike, ọ gwara ha okwu gbasara ndị Juu—

3 Ma mgbe ebibisịworo ha, ọbụna obodo-ukwu ahụ bụ aJerusalem, ma bdọkpụrụ kwa ọtụtụ ha n’agha wee gaa cBabịlọn, dịka oge Onye-nwe siri dị, ha ga dalaghachị kwa ọzọ, e, ọbụna ịkpọghachị ha azụ site na ndọkpụ n’agha; ma mgbe a ga-akpọghachị ha azụ site ndọkpụ n’agha, ha ga-enwetakwa ala nke nketa ha.

4 E, ọbụna anarị afọ isii site na mgbe nna m hapụrụ Jerusalem, bonye-amụma ka Onye-nwe Chineke ga-ewelite n’etiti ndị Juu—ọbụna cMesaịa, ma-ọbụ, n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Onye-nzọpụta nke ụwa.

5 Ma o kwukwara okwu gbasara ndị-amụma, lee ka ọtụtụ mmadụ agbaworo ama maka ihe ndị a, gbasara Mesaịa bụ onye nke o kwuworo maka ya, ma-ọbụ Onye-mgbapụta nke ụwa.

6 Ya mere, mmadụ nile afuru efu ma nọrọ n’ọnọdụ ndị dara ada, ma ga-anọgide n’ọnọdu a ma ọbụghị ma ha dabere n’Onye-mgbapụta a.

7 Ma o kwukwara okwu gbasara aonye-amụma ga-ebu Mesaịa ụzọ bịa, idozi ụzọ nke Onye-nwe—

8 E, ọbụna ọ ga-agakwa tie mkpu n’ọzara: aDozienu ụzọ nke Onye-nwe, meekwanụ ka ụzọ ya gụzozie; n’ihi na o nwere onye guzoro n’etiti unu onye unu na-amataghị; ma ọ dịkwa ukwuu karịa m, onye nke m na-etorughị ịtọpụ eriri akpụkpọ-ụkwụ ya. Ma ọtụtụ okwu ka nna m kwuru gbasara ihe nke a.

9 Ma nna m siri na ọ ga-eme baptism na aBetabara, n’ofe Jọdan; ma o kwukwara na ọ ga-eji mmiri bmee baptism, ọbụna na ọ ga-eji mmiri mee Mesaịa ahụ baptism.

10 Ma mgbe o jiworo mmiri mee Mesaịa ahụ baptism, ọ ga-ahụ na gbaa-ama na ya emewo aNwa-atụrụ nke Chineke baptism, bụ onye ga-ebupụ mmehie nile nke ụwa.

11 Ma o wee ruo mgbe nna m kwusịworo okwu ndị a o wee gwa ụmụnne m okwu gbasara ozi-ọma nke aga-agbasa n’etiti ndị Juu, na kwa gbasara aịla-azụ bn’ekweghị ekwe nke ndị Juu. Ma mgbe ha cgbuworo Mesaịa ahụ, nke ga-abịa, na mgbe egbuworo ya, ọ dga-esị kwa na ndị nwụrụ anwụ bilie, ma gosị kwa onwe ya, site na eMụọ Nsọ, nye ndị Jentaịlụ.

12 E, ọbụna nna m kwuru ọtụtụ okwu gbasara ndị Jentaịlụ ahụ, na kwa gbasara ụlọ nke Israel, na a ga-eji ha tụnyere aosisi olive, nke aga-agbajipụ ngalaba ya wee bfesasịa ya n’elu iru nile nke ụwa.

13 Ya mere, ọ sịrị na ọ ga-adị mkpa na a ga-eji otu obi duba anyị an’ala e kwere na nkwa, wee ruo mgbe a ga-emezu okwu nke Onye-nwe, na anyị ga-agbasasị n’elu iru nile nke ụwa.

14 Ma mgbe ekposasịrị ụlọ nke Israel a aga-ekpokọta kwa ha ọzọ; ma-ọbụ, na mkpirisi, mgbe ndị bJentaịlụ nabataworo uju nke ozi-ọma ahụ, ndị bụ ngalaba cosisi olive ahụ n’ezie, ma-ọbụ ụfọdụ nke ụlọ nke Israel, ka a ga-akpọbata kwa, ma-ọbụ bịa na mmata nke ezi Mesaịa ahụ, Onye-nwe ha na Onye-mgbapụta ha.

15 Ma n’ụdị asụsụ dị otu a ka nna m jiri buo-amụma ma gwa kwa ụmụnne m okwu, na kwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ ndị m na-agaghị ede n’akwụkwọ a; n’ihi na edewo m ụfọdụ n’ime ha m chere dị mkpa ka m dee an’akwụkwọ m nke ọzọ.

16 Ma ihe nile ndị a, m kwuru maka ha, bụ ndị e mere n’oge nna m bi n’ụlọ-ikwuu, nke dị na ndagwụrụgwụ Lemuel.

17 Ma o wee ruo na mụ, Nifaị, ka m nụworo aokwu nile nke nna m, gbasara ihe ndị ọ hụrụ bn’ọ́hụ̀, na kwa ihe ndị o kwuru site n’ike nke Mụọ Nsọ, bụ ike nke o nwetara site n’okwukwe o nwere n’Ọkpara nke Chineke—ma Ọkpara nke Chineke bụ cMesaịa ahụ nke ga-abịa—Mụ, Nifaị, chọsịkwara ike ka m hụ, ma nụ, ma mata gbasara ihe ndị a, site n’ike nke Mụọ Nsọ, nke bụ donyinye Chineke nye ndị nile ena-achọsị ya ike, ma fmgbe ochie ma kwa mgbe ọ ga-egosịpụta onwe ya n’iru ụmụ nke mmadụ.

18 N’ihi na ọ adị otu a, ụnyahụ, taa, na ruo mgbe nile; ma e doziworo mmadụ nile ụzọ site na ntọ-ala nke ụwa, ma ọbụrụ na ha ga-echegharị wee bịakwute ya.

19 N’ihi na onye ọbụla nke chọsịrị ike ga-achọta; na aihe omimi nile nke Chineke ka a ga-ekpughere ha, site n’ike nke bMụọ Nsọ, dịka ọ dị ugbua ka ọ dị kwa na mgbe ochie, ma otu ọ dị mgbe ochie ka ọ ga-adị kwa n’oge na-abịa abịa; ya mere, cụzọ nke Onye-nwe na-adị otu gburugburu ebighi-ebi.

20 Ya mere, cheta, O mmadụ, na n’ihe nile ị na-eme ka a ga-eji kpe gị aikpe.

21 Ya mere, ọbụrụ na unu chọrọ ime ihe ọjọọ n’ụbọchị nile nke amnwale unu, mgbe ahụ a ga-achọpụta na unu bruru inyi n’iru oche-ikpe nke Chineke; ma ọ dịghị ihe ọbụla ruru inyi nwere ike ibinyere Chineke; ya mere, a ga-achụpụ unu ruo mgbe nile.

22 Ma Mụọ Nsọ na-enye m ike ka m kwuo ihe ndị a, ghara ịgọnarị ha.