Akwụkwọ nsọ
1 Niphaị 14


Isi 14

Mụọ-ozi wee gwa Nifaị maka ngọzi nile na ọbụbụ ọnụ nile ga-adakwasị ndị Jentaịlụ—E nwere nanị nzukọ abụọ: Nzukọ-nsọ nke Nwa-atụrụ Chineke na nzukọ nke ekwensu—Ndị-nsọ nke Chineke na mba nile a na-esogbu ha site n’aka nnukwu nzukọ ahụ rụrụ arụ—Onye-ozi Jọn ga-ede gbasara ọgwụgwụ ụwa. Ihe dịka n’afọ 600 ruo 592 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ọ ga-eru mgbe, na ọ bụrụ na ndị aJentaịlụ ga-an̄a ntị nye Nwa-atụrụ nke Chineke n’ụbọchị ahụ ọ ga-egosịpụta onwe ya nye ha n’okwu, na kwa bn’ike, na omume kwa, ruo n’iwepụrụ ha cokwute mkpọbe-ụkwụ ha nile—

2 Ma ghara imesi obi ha ike megide Nwa-atụrụ nke Chineke, a ga-agụnye ha n’etiti mkpụrụ-afọ nke nna gị; e, a ga aagụnye ha n’ime ụlọ nke Israel; ma ha ga-abụ bndị a gọziri agọzi n’elu ala e kwere na nkwa ruo mgbe nile; a gaghị akpọdata kwa ha ọzọ n’ime ndọkpụ n’agha; ma ụlọ nke Israel agaghị enwe kwa mgbagwọju-anya ọzọ.

3 Ma nnukwu aolulu ahụ, nke e gwuworo maka ha site n’aka nnukwu nzukọ ahụ rụrụ arụ, nke e hiwere site n’aka ekwensu na ụmụ ya, ka o wee nwe ike dupụ mkpụrụ-obi ụmụ nke mmadụ gbada n’ala mụọ—e, nnukwu olulu ahụ nke egwuworo maka mbibi ụmụ nke mmadụ ga ejupụta na ndị gwuru ya, ruo na mbibi ha nile kpam kpam, ka Nwa-atụrụ nke Chineke kwuru; ọ bụghị mbibi nke mkpụrụ-obi, ma ọ bụghị ilufu ya n’ime bala mụọ ahụ na-enweghị ọgwụgwụ.

4 N’ihi na lee, nke a bụ dịka ndọkpụ n’agha nke ekwensu siri dị, na kwa dịka ikpe ziri ezi nke Chineke siri dị, ga-emeso ndị nile ga-alụ ọlụ ajọọ-omume na ihe arụ n’iru ya.

5 Ma o wee ruo na mụọ-ozi ahụ gwara mụ, Nifaị okwu, na-asị: I hụworị na ọbụrụ na ndị Jentaịlụ echegharịa ọ ga-adịrị ha mma; ma ị matakwara gbasara ọgbụgba-ndụ nile nke Onye-nwe nye ụlọ nke Israel; ma ị nụwokwa na onye ọbụla ana-echegharịghị ga-alarịrị n’iyi.

6 aYa mere, ahụhụ na-adịrị ndị Jentaịlụ ma ọbụrụ na ha ga-emesi obi ha ike megide Nwa-atụrụ nke Chineke ahụ.

7 N’ihi na oge na-abịa, ka Nwa-atụrụ nke Chineke kwuru, mgbe m ga-arụ annukwu na oke ọrụ dị ịtụ-n’anya n’etiti ụmụ nke mmadụ; ọrụ nke ga-adị ruo mgbe nile na-adigide, n’otu aka ma-ọbụ nke ọzọ—na ime ka ha tụgharịa-obi nye udo na bndụ ebighi-ebi, ma-ọbụ nye nnapụta nke ha ruo n’imesi-obi ha ike na ikpu-isi nke echiche ha nile ruo mgbe a ga-ewedata ha n’ime ndọkpụ n’agha, na kwa baa na mbibi, ma na nke arụ ma na nke mụọ, cdịka ndọkpụ n’agha nke ekwensu siri dị, nke m kwuworo maka ya.

8 Ma o wee ruo na mgbe mụọ-ozi ahụ kwusịrị okwu ndị a, o wee sị m: I chetara aọgbụgba-ndụ nile nke Nna nye ụlọ nke Israel? A sịrị m ya, E.

9 Ma o wee ruo na ọ sịrị m: Lee, ma hụ nnukwu nzukọ ahụ rụrụ arụ, nke bụ nne nke ihe arụ nile, nke onye-nchọpụta ya bụ aekwensu.

10 Ma ọ sịrị m: Lee e nwere nanị anzukọ abụọ; nke mbụ bụ nzukọ-nsọ nke Nwa-atụrụ nke Chineke, ma bnke ọzọ bụ nzukọ nke ekwensu; ya mere, onye ọbụla na-esonyeghị nzukọ nke Nwa-atụrụ nke Chineke sonyere nnukwu nzukọ ahụ, nke bụ nne nke ihe arụ nile; ma-ọbụ onye cakwụnakwụna nke ụwa nile.

11 Ma o wee ruo na e lere m ma hụ onye akwụnakwụna nke ụwa nile, ma ọ nọdụrụ n’elu ọtụtụ amiri; ma bo nweere ike ọchịchị n’elu ụwa nile, n’etiti mba nile, ebo nile, asụsụ nile, na mmadụ nile.

12 Ma o wee ruo na a hụrụ m nzukọ-nsọ nke Nwa-atụrụ nke Chineke, na ọnụ-ọgụgụ ya dị aole na ole, n’ihi ajọọ-omume na ihe arụ nile nke akwụnakwụna ahụ onye nọdụrụ n’elu ọtụtụ mmiri; otu o sila dị, a hụrụ m na nzukọ-nsọ nke Nwa-atụrụ ahụ, bụ ndị nsọ nke Chineke, nọ kwa n’elu biru nile nke ụwa; ma ọnọdụ ha nwere n’elu ụwa dị ntakịrị, n’ihi ajọọ-omume nke nnukwu akwụnakwụna ahụ bụ onye m hụrụ.

13 Ma o wee ruo na a hụrụ m na nnukwu nne nke ihe arụ nile ahụ kpọkọtara igwe mmadụ n’elu iru nke ụwa nile, n’etiti mba nile nke ndị Jentaịlụ, aịlụso Nwa-atụrụ nke Chineke ọgụ.

14 Ma o wee ruo na mụ, Nifaị, hụrụ ike nke Nwa-atụrụ nke Chineke, na ọ dakwasịrị n’elu ndị nsọ nke nzukọ-nsọ nke Nwa-atụrụ ahụ, na n’elu ndị ọgbụgba-ndụ nke Onye-nwe, ndị gbasasịrị n’elu iru nile nke ụwa; ma ngwa-ọgụ ha ji bụ ezi-omume na aike nke Chineke n’ime nnukwu otuto.

15 Ma o wee ruo na a hụrụ m na oke iwe Chineke ka ọ awụkwasịrị n’elu nnukwu nzukọ ahụ rụrụ arụ, nke mere na e nwere agha nile na asịrị agha nile n’etiti bmba nile na ebo nile nke ụwa.

16 Ma ka a malitere inwe aagha nile na asịrị agha nile n’etiti mba nile nke nne ihe arụ nile ahụ nwere, mụọ-ozi ahụ gwara m okwu, si: Lee oke iwe nke Chineke abịakwasịwo nne nke ndị akwụnakwụna; ma Lee, ị n’ahụ ihe ndị a nile—

17 Ma mgbe aụbọchị ahụ ruru na boke iwe ọkụ Chineke ga-awụkwasị n’elu nne nke ndị akwụnakwụna, nke bụ nnukwu nzukọ nke ihe arụ nke ụwa nile, nke onye-nchọpụta ya bụ ekwensu ahụ, e mesịa, n’ụbọchị ahụ, cọrụ nke Nna ga-amalite, n’idozi ụzọ maka imezu dọgbụgba-ndụ ya nile, nke o meworo nye ndị ya bụ ndị nke ụlọ nke Israel.

18 Ma o wee ruo na mụọ-ozi ahụ gwara m okwu sị: Lee!

19 Ma e lere m ma hụ otu nwoke, ma o yi uwe mwụda ọcha.

20 Ma mụọ-ozi ahụ sịrị m: Lee aotu n’ime ndị-ozi iri na abụọ nke Nwa-atụrụ ahụ.

21 Lee, ọ ga-ahụ ma dee ihe nile ndị nke fọdụrụ; e, na kwa ọtụtụ ihe ndị meworo.

22 Ma ọ ga kwa ede gbasara ọgwụgwụ nke ụwa.

23 Ya mere, ihe ndị ọ ga-ede zịrị-ezi bụrụ ezi-okwu; ma lee, e dere ha n’ime aakwụkwọ ahụ nke ị hụrụ si n’ọnụ nke ndị Juu na-apụta; ma-ọbụ n’oge akwụkwọ ahụ siri n’ọnụ ndị Juu pụta, ihe ndị e dere dị mfe nghọta na e nweghị ntụpọ, na boke mkpa na ịdị mfe nghọta nye mmadụ nile.

24 Ma lee, ihe nile aonye-ozi nke Nwa-atụrụ ahụ ga-ede bụ ọtụtụ ihe ndị nke ị hụworo; ma lee, ndị nke fọdụrụ ka ị ga-ahụ.

25 Ma na ihe ndị ị ga-ahụ site ugbua ị gaghị ede ha; n’ihi na Onye-nwe Chineke echiwo onye-ozi nke Nwa-atụrụ nke Chineke ahụ echichi ka o wee adee ha.

26 Na kwa ndị ọzọ ndị biworọrịi, ha ka o gosịworo ihe nile, ma ha edewo ha; ma aarachịrị ha ka ha pụta n’ịdị ọcha, dịka ezi-okwu ahụ nke dị n’ime Nwa-atụrụ ahụ, mgbe oge dị Onye-nwe mma zuru, nye ụlọ nke Israel.

27 Ma mụ, Nifaị, nụrụ ma gbaa aka-ebe, na aha nke onye-ozi nke Nwa-atụrụ ahụ bụ aJọn, dịka okwu nke mụọ-ozi ahụ siri dị.

28 Ma lee, mụ, Nifaị, e gbọchịrị m na m ga-ede ihe ndị nke fọdụrụ n’ihe ndị m hụrụ ma nụ; ya mere, ihe ndị m deworo e zuworo m; ma e dewo m nanị akụkụ ntakịrị n’ihe ndị m hụrụ.

29 Ma a gbara m ama na a hụrụ m ihe ndị anna m hụrụ, na mụọ-ozi nke Onye-nwe mere ka m mata ha.

30 Ma ugbua, a na m eweta okwu m n’isi njedebe gbasara ihe ndị m hụrụ mgbe a kpọpụrụ m n’ime mụọ; ma ọbụrụ na edeghị m ihe nile nke m hụrụ, ihe ndị m deworo bụ aezi-okwu. Ma otu a ka ọ dị. Amen.