Akwụkwọ nsọ
1 Niphaị 20


Isi 20

Onye-nwe wee kpughee ebum-n’obi ya nile nye Israel—A họpụtawo Israel n’ime oke ọkụ nke mkpagbu ma ha ga-agapụ site na Babịlọn—Tulee Aịsaịa 48. Ihe dịka n’afọ 588 ruo 570 tutu amụọ Kraịst.

1 N̄aa ntị ma nụrụ ihe a, O ụlọ nke Jekọb, ndị a na-akpọ aha nke Israel, ma ha si na mmiri nile nke Juda pụta, ma-ọbụ site n’ime mmiri nile nke abaptism, ndị na-an̄ụ iyi n’aha nke Onye-nwe, ma na-akpọtụ ọnụ maka Chineke nke Israel, ma na ha anaghị an̄ụ iyi n’ezi okwu ma-ọbụ n’ezi-omume.

2 Otu o sila dị, ha na-akpọ onwe ha ndị aobodo-ukwu dị nsọ ahụ, ma ha anaghị badabere onwe ha n’arụ Chineke nke Israel, onye bụ Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha; e, Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha bụ aha ya.

3 Lee, e kwupụtawo m aihe ndị mere n’oge gara-aga site na mmalite; ma e ji m ọnụ m kwupụta ha, ma e gosịrị m ha. E gosịrị m ha na mberede.

4 Ma e mere m ya n’ihi a ma m na ai bụ onye-na-adịghị erube isi, ma olu gị bụ agịrị igwe, ma iku-anya gị bụ bras.

5 Ma e sịwo m na mmalite kwupụtara gị, tutu ya e ruo, e gosịrị m gị ha; ma e gosịrị m ha na a dịghị ama ama ị ga-ekwu—aArụsị m emewo ha, na arụsị m pịrị api, na arụsị m kpụrụ akpụ nyere ha iwu.

6 I hụwo ma nụ ihe nile ndị a; ma ị gaghị ekwupụta ha? Ma na egosịwo m gị ihe ọhụrụ nile site n’oge a, ọbụna ihe e zoro ezo, ma ị mataghị ha.

7 E kere ha ugbua, ma ọbụghị site na mmalite, ọbụna tutu ụbọchị mgbe ị na-anụbeghị maka ha, e kwupụtara ha nye gị, ka ịghara ikwu—Lee, a matara m ha.

8 E, ma ị nụghị kwa; e, ị mataghị kwa; e, site na mgbe ahụ ntị gị aka-emegheghị; n’ihi a ma m na ị ga-akpa agwa onye aghụghọ, ma a kpọrọ gị aonye-njehie iwu site n’ime akpa nwa.

9 Otu o sila dị, an’ihi aha m ka m ga-eji bugharịa iwe m, na n’ihi otuto m ka m ga-eji zere onwe m site n’ebe i nọ, ka m ghara igbubepụ gị.

10 N’ihi na, lee, a yọchawo m gị, a họpụtawo m gị n’ime okporo ọkụ nke amkpagbu.

11 N’ihi mụ onwe m, e, n’ihi mụ onwe m ka m ga-eme nke a, n’ihi na agaghị m ekwe ka aaha m bụrụ ihe e merụrụ emerụ, ma bagaghị m enye onye ọzọ otuto m.

12 N̄aa ntị n’olu m, O Jekọb, na Israel ndị m kpọpụtara, n’ihi na a bụ m ya; a bụ m onye ambụ, ma a bụ kwa m onye bikpe-azụ.

13 Aka m aatọwo kwa ntọ ala nke ụwa ahụ, ma aka nri m agbasasịwo elu-igwe nile. A kpọrọ m ha ma ha guzokọtara ọtọ.

14 Unu nile, kpọkọtanụ onwe unu, ma nụrụ; onye n’ime ha kwupụtaworo ihe ndị a nye ha? Onye-nwe ahụwo ya n’anya; e, ma ọ ga aemezu okwu ya nke o kwupụtaworo site na ha; ma ọ ga-eme bBabịlọn ihe dị ya mma, ma aka ya ga abịakwasị ndị Kaldịa.

15 Ọzọ, otu a ka Onye-nwe kwuru, mụ, bụ Onye-nwe, e, e kwuwo m; e, a kpọwo m ya ka o kwupụta, a kpọtawo m ya, ma ọ ga-eme ka o nwee ọ ga n’iru nʼụzọ ya.

16 Bịanu m nso; E kwughị m na anzuzo; site na mmalite, site n’oge nke e kwupụtara ya ka m kwuru; ma Onye-nwe Chineke, na Mụọ ya, ezipụtawo m.

17 Ma otu a ka Onye-nwe kwuru, aOnye-mgbapụta gị, Onye-Nsọ nke Israel; E zitawo m ya, Onye-nwe bụ Chineke gị Onye na-akụziri gị ka inweta uru, Onye bna-edu gị n’ụzọ ịkwesịrị ịga, e mewo ya.

18 O, ọ dị m ka asị na ị n̄ara ntị an’iwu-nsọ m nile—mgbe ahụ ka udo gị gaara a dịka osimiri, ma ezi-omume gị dịka nfeghari mmiri nile nke oke osimiri.

19 aMkpụrụ-afọ gị kwa diworo ka aja; ụmụ nke afọ gị nile ka mkpụrụ okwute dị ya; aha ya agaraghị abụ ihe ebepụrụ ma-ọbụ ebibiri site n’iru m.

20 aSi nụ na Babịlọn pụọ, gbapụ nụ site n’aka ndị Kaldịa, jiri olu nke ịbụ abụ kwupụta nụ ya; kwuo nke a, kwupụta ya n’ebe ụwa sọtụrụ; kwuo nụ: Onye-nwe agbapụtawo boru ya nwoke Jekọb.

21 Ma aakpịrị akpọghị ha nkụ; o duru ha gabiga ọzara ahụ nile; o mere ka mmiri si na bnkume gbapụtara ha; o tiwakwara nkume mmiri wee gbapụta.

22 Ma na-agbanyeghị, o mewo ihe ndị a nile, na nnukwu ihe ndị ọzọ kwa, audo agaghị adị ka Onye-nwe kwuru, nye ndị ajọọ-omume.