Akwụkwọ nsọ
1 Niphaị 7


Isi 7

Ụmụ Lihaị ndị nwoke wee laghachị Jerusalem ma wee kpọọ Ịshmel na ezi na ụlọ ya oku ka ha soro ha na njem ha—Leman na ndị ọzọ wee nupu isi—Nifaị wee gbaa ụmụnne ya ume ka ha nwe okwukwe n’ime Onye-nwe—Ha kere ya agbụ wee tụọ atụmatụ mbibi ya—A zọpụtara ya site n’ike nke okwukwe—Ụmụnne ya wee rịọ mgbaghara—Lihaị na ndị otu ya chụrụ aja na onyinye nsure ọkụ. Ihe dịka n’afọ 600 ruo 592 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua achọrọ m ka unu nile mata, na mgbe nna m, Lihaị, abuchaworo amụma gbasara mkpụrụ-afọ ya, o wee ruo na Onye-nwe gwakwara ya okwu ọzọ sị na o kwesịghị na ya, Lihaị, na ọ ga-akpọrọ ezi na ụlọ ya gaa n’ime ọzara nanị ha; kama ụmụ ya ndị nwoke kwesịrị ịkpọrọ bndịnyom dịka cnwunye, ka ha nwe ike zulitere Onye-nwe mkpụrụ-afọ n’ala ahụ e kwere na nkwa.

2 Ma o wee ruo na Onye-nwe nyere Lihaị aiwu sị ya na mụ, Nifaị, na ụmụnne m, kwesịrị ịlaghachị n’ala Jerusalem, wee kpọta Ịshmel na ndị ezi na ụlọ ya n’ime ọzara ahụ.

3 Ma o wee ruo na mụ, Nifaị, kpọkwara ụmụnne m aọzọ laghachị n’ime ọzara igbagọ ruo Jerusalem.

4 Ma o wee ruo na anyị gbagoro ruo ụlọ Ịshmel, o wee bụrụ na anyị natara iru ọma n’anya Ịshmel, nke mere na anyị gwara ya okwu nile nke Onye-nwe.

5 Ma o wee ruo na Onye-nwe mere ka obi Ịshmel na kwa nke ezi na ụlọ ya dị nro, nke mere ka anyị na ha bilie njem gbada n’ime ọzara ahụ ruo n’ụlọ-ikwuu nna anyị.

6 Ma o wee ruo ka anyị na-aga njem n’ime ọzara, lee, Leman na Lemuel, na ụmụada Ịshmel abụọ, na kwa aụmụ nwoke Ịshmel abụọ na ezi na ụlọ ha, wee nupu isi imegide anyị; e, imegide mụ, Nifaị, na Sam, na nna ha, Ịshmel, na nwunye ya, na ụmụada ya atọ ndị ọzọ.

7 Ma o wee ruo n’ime nke nnupụ isi, ha chọsịrị ike ịlaghachị n’ala Jerusalem.

8 Ma ugbua, mụ, Nifaị, ebe aowutere m n’ihi imesi-ike nke obi ha, ya mere agwara m ha okwu sị, e, ọbụna gwa Leman na kwa Lemuel: lee unu bụ ụmụnne m ndị okenye, ma olee otu obi unu jiri sie ike otu a, wee kpuo kwa isi n’ime obi unu, na unu ga-achọ na mụ, bụ nwanne unu nke ntakịrị, ga-agwa unu okwu, e, ma bụụrụ unu ihe ịma-atu?

9 O lee otu unu siri ghara ịn̄a-ntị n’okwu nke Onye-nwe?

10 O lee otu unu siri achefuo na unu ahụwo mụọ-ozi nke Onye-nwe?

11 E, ma olee otu unu siri chefuo oke ihe ndị nke Onye-nwe meworo anyị, site an’ịnapụta anyị n’aka Leban, na kwa na anyị ga-enweta akụkọ-ndekọta ahụ?

12 E, olee otu unu siri chefuo na Onye-nwe nwere ike ime aihe nile dịka ọchịchọ ya siri dị, maka ụmụ nke mmadụ, ma ọbụrụ na ha nwere bokwukwe na ya? Ya mere, ka anyị nwe okwukwe n’ebe ọ nọ.

13 Ma ọbụrụ na anyị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ, anyị ga-enweta aala ahụ e kwere na nkwa; ma unu ga-amata n’ọdịnịrụ na okwu Onye-nwe ga-emezu gbasara bmbibi nke Jerusalem; n’ihi na ihe nile Onye-nwe kwuworo gbasara mbibi nke Jerusalem ga-emezurịrị.

14 Ma lee, Mụọ nke Onye-nwe ga-akwụsị ịnọnyere ha n’oge na-adịghị anya; n’ihi na lee, ha aajụwo ndị-amụma, ma bJeremaịa ka ha tụbaworo n’ụlọ mkpọrọ. Ma ha achọwo kwa iwepụ cndụ nke nna m, nke mere na ha achụpụwo ya n’ala ahụ.

15 Ugbua lee, asị m unu na ọbụrụ na unu ga-alaghachị Jerusalem, unu ga-esokwa ha laa n’iyi. Ma ugbua, ebe unu nwere nhọrọ, gbagonụ n’ala ahụ, ma chetanụ okwu nke m na-agwa unu, na ọbụrụ na unu agaa, unu ga-alakwa n’iyi; n’ihi na otu a ka Mụọ nke Onye-nwe kwalitere m ka m kwuo.

16 Ma o wee ruo na mgbe mụ, Nifaị gwaworo ụmụnne m okwu ndị a, ha wesoro m iwe. Ma o wee ruo na ha jidere m, ma lee, oke iwe were ha, ha wee akee m agbụ, n’ihi na ha chọrọ iwepụ ndụ m, ka ha wee hapụ m n’ime ọzara ahụ ka anụ ọhịa rie anụ m.

17 Ma na o wee ruo na e kpere m ekpere nye Onye-nwe, na-asị: O Onye-nwe, dịka okwukwe nke m nwere n’ebe ị nọ, biko napụta m n’aka ụmụnne m; e, ọbụna inye m ume ka m wee adọbisịa agbụ ndị a e jiri kee m.

18 Ma o wee ruo na mgbe m kwuworo okwu ndị a, lee, agbụ ndị a e kere m n’aka na ụkwụ, tọpụsịrị ma m wee guzoro n’iru ụmụnne m, ma gwakwa ha okwu ọzọ.

19 Ma o wee ruo na ha wekwaara m iwe ọzọ, ha wee chọọ kwa ijide m; ma lee, otu n’ime aụmụada Ịshmel, e, na kwa nne ya, na otu nwa nwoke Ịshmel, rịọrọ ụmụnne m, nke mere ka obi ha dị nro; ha wee kwụsịkwa mbọ ha na-agba iwepụ ndụ m.

20 Ma o wee ruo na o wutere ha, n’ihi ajọọ-omume ha, nke mere na ha kpọrọ isi ala nye m, ma rịo kwa m ka m gbaghara ha ihe ha meworo megide m.

21 Ma o wee ruo na n’ezi-okwu, ejiri m obi m nile agbaghara ha ihe nile ha meworo, ma m wee gbaa ha ume ka ha kpee ekpere rịọ Onye-nwe bụ Chineke ha mgbaghara. Ma o wee ruo na ha mere otu ahụ. Ma mgbe ha kpesịworo ekpere rịo Onye-nwe, anyị wee malitekwa njem anyị ọzọ chee iru ebe ụlọ-ịkwuu nna anyị dị.

22 Ma o wee ruo na anyị bịaruru ụlọ-ịkwuu nna anyị. Ma mgbe mụ na ụmụnne m na ezi na ụlọ Ịshmel bịaruworo n’ụlọ-ịkwuu nke nna m, ha wee nye Onye-nwe bụ Chineke ha aekele; wee bchụọ aja na onyinye nsure ọkụ nye ya.