Akwụkwọ nsọ
Jakọb 2


Isi 2

Jekọb kwutọrọ ịhụ akụ na ụba n’anya, mpako, na adịghị ọcha—Ndị mmadụ nwere ike ịchọ akụ na ụba iji nyere ndị mmadụ ibe ha aka—Jekọb megidere omume nke ịlụ ọtụtụ ndịnyom na-enweghị ikike—Onye-nwe na-enwe mmasị n’ịdị ọcha nke ụmụ nwanyị. Ihe dịka n’afọ 544 ruo 421 tutu amụọ Kraịst.

1 Okwu nile nke Jekọb, nwanne nwoke nke Nifaị, gwara ndị nke Nifaị, mgbe Nifaị nwụsirị:

2 Ugbua, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, mụ, Jekọb, dịka ihe dịrị m nke m nọ n’okpuru ya nye Chineke, ibulite ọkwa-ọrụ nke m n’anya udo, ma na m ga-asachapụ uwe m nile site na mmehie unu, a bịalitere m n’ime temple n’ụbọchị nke a ka m wee kwupụtara unu okwu nke Chineke.

3 Ma unu onwe unu matara na site na mbụ a na m arụsị ọrụ ike n’ime ọkwa-ọrụ nke ọrụ nke ọkpụkpọ; mana mụ n’ụbọchị taa, ibu na-anyida m site n’inwe nnukwu ọchịchọ na nchekasị maka ọdịmma nke mkpụrụ-obi unu karịa otu ọ na-adị m na mbụ.

4 N’ihi na lee, ruo ugbua, unu na-enwe irube-isi nye okwu nke Onye-nwe, bụ nke m nyeworo unu.

5 Mana lee, n̄aanụ m ntị, ma mata na site n’enyem-aka nke Onye-okike nke elu-igwe na ụwa ahụ kachasị ike, e nwere m ike ịgwa unu gbasara aechiche unu nile, otu ọ siri bụrụ na unu na-amalite ịrụ-ọrụ n’ime mmehie, bụ mmehie nke pụtara ihe arụ dị ukwuu nye m, e, na bụrụ ihe arụ nye kwa Chineke.

6 E, ọ na-ewuta mkpụrụ-obi m na-eme ka m sụlaa n’ihere n’iru Onye-meworo m, na m ga-agbarịrị ama nye unu gbasara ajọọ-ọmume nke obi unu.

7 Na kwa ọ na-ewuta m na m ga-eji annukwu enweghị-egwụ ha otu a na-ekwu gbasara unu, n’iru ndị nwunye unu na ụmụ unu, ọtụtụ ndị mmetụta n’obi ha dịkarịrị nro na bọcha mmekorịta ma dị nro n’iru Chineke, nke bụ ihe dị mmasị nye kwa Chineke.

8 Ma e werewo m ya na ha abịalitewo nso ịnụrụ aokwu dị mmasị nke Chineke; e, okwu nke na-agwọ obi nwere mmeru-arụ.

9 Ya mere, ọ na-anyịgbu mkpụrụ-obi m na a ga-akwagide m, n’ihi iwu-nsọ siri ike m nataworo, site n’aka Chineke, ịdụ unu ọdụ dịka imebi-iwu unu nile siri dị, ime ka mmeru-arụ nke ndị merụworọrịị arụ buo ibu, karịa ịkasi-obi na ịgwọ mmeru-arụ ha nile; ma ndị nke na emerụbeghị arụ, karịa inwe oriri n’elu okwu dị mmasị nke Chineke, nwere nke-nke-mma pịrị-ọnụ e debere iji dụpuo mkpụrụ-obi ha nile ma merụọ echiche ha dị nro arụ.

10 Mana, na-agbanyeghị ịdị ukwuu nke ọrụ ahụ, aga m eme dịka aiwu-nsọ nile siri ike nke Chineke, ma gwa unu gbasara ajọọ-omume na ihe arụ nile unu, n’iru ndị dị ọcha n’obi, na ndị obi tiwara etiwa, na n’okpuru bndupu nke ile-anya nke Chineke nke Pụrụ Ime Ihe nile.

11 Ya mere, aga m agwarịrị unu ezi-okwu dịka aikwụ-ọtọ nke okwu Chineke siri dị. N’ihi na lee, dịka m jụtara Onye-nwe, otu a ka okwu ahụ siri bịara m, na-asị: Jekọb, galite n’ime temple echi, ma kwupụta okwu nke m ga-enye gị inyeru ndị a.

12 Ma ugbua lee, ụmụnne m nwoke, nke a bụ okwu ahụ nke m na ekwupụtara unu, na ọtụtụ n’ime unu amalitewọrịị ịchọ ọla-edo, na ọla-ọcha, na ụdị antụ-igwe oke-ọnụ ahịa nile, nke dị n’ala nke a, nke bụ bala e kwere na nkwa nye unu na nye mkpụrụ-afọ unu, jupụtara ebe ọ dị ukwuu.

13 Ma aka ahụ na-enyezu amụkwasịwo unu amu otu kachasị ịdị mmasị, na unu enwetawo ọtụtụ akụ na ụba; ma n’ihi na ụfọdụ unu enwetawo n’uju karịa nke ụmụnne unu, unu ana-afuli onwe unu elu n’ime mpako nke obi unu nile, ma yịkwasị ịkpọ-ekwe-nkụ na isi mbụli-elu nile n’ihi oke onụ ahịa nke uwe unu, ma na-esogbu ụmụnne unu n’ihi na unu na-eche na unu ka ha mma.

14 Ma ugbua ụmụnne m nwoke, unu na-eche na Chineke weere unu dịka ndị zịrị-ezi n’ime ihe nke a? Lee, asị m unu, E-e. Ma ọ na-ekwutọ unu, ma ọ bụrụ na unu nọsie-ike n’ime ihe ndị a nile, ikpe ya nile ga-abịakwasịrịrị unu ọsọ-ọsọ.

15 O ka ọbụrụ na ọ ga egosị unu na ya nwere ike dupuo unu, ma jiri otu nle-anya ya, O nwere ike ịkụda unu n’uzuzu!

16 O ka ọ zọpụta unu site na ajọọ-omume na ihe arụ nke a. Ma, O ka unu wee gee ntị n’okwu nke iwu ya nile, ma ghara ikwe ka ampako nke obi unu a bibie mkpụrụ-obi unu!

17 Na-eche nụ maka ụmụnne unu nwoke dịka onwe unu, ma nwee nụ mmetụta unu na mmadụ nile ma na-emepu nụ aka an’ihe unu nwere, ka bha wee baa ụba dịka unu.

18 Ma tutu unu achọọ aakụ na ụba, chọọ nụ bala-eze nke Chineke.

19 Ma mgbe unu nwetaworo olile-anya n’ime Kraịst unu ga-enweta akụ na ụba, ma ọbụrụ na unu a chọọ ha; ma unu ga-achọ ha maka nzube nke aime ihe-ọma—iyibe ndị gbaa ọtọ uwe, na inye ndị agụụ na-agụ nri, na ịdọpụta ndị a dọkpụụrụ n’agha, na inye ndị ọrịa na ndị na-enwe mmekpa-arụ enyem-aka.

20 Ma ugbua, ụmụnne m nwoke, a gwawo m unu okwu gbasara mpako; ma ndị n’ime unu nyeworo ndị agbata-obi unu mmekpa arụ, ma nye ha nsogbu n’ihi na unu nwere mpako n’ime obi unu, n’ihi ihe nile ndị Chineke nyeworo unu, gịnị ka unu kwuru maka ya?

21 Unu echeghị na ihe ndị di otu a bụ ihe arụ nye ya bụ onye kere anụ-arụ nile? Na otu mmadụ dị mkpa n’anya ya ka nke ọzọ dị. Na anụ-arụ nile si n’uzuzu; na maka otu njedebe ahụ ka ọ keworo ha, ka ha na edebe aiwu-nsọ ya nile na na-eto ya ruo mgbe nile.

22 Ma ugbua ana m eweta ịgwa unu okwu gbasara mpako a n’isi njedebe. Ma ọbụrụ na ọbụghị na m ga-agwarịrị unu okwu gbasara imebi-iwu nke ka njọ, obi m ga-an̄ụrị ọn̄ụ karịa n’ihi unu.

23 Ma na okwu Chineke na-anyịgbu m n’ihi mmebi iwu unu ndị di oke njọ. N’ihi na lee, otu a ka Onye-nwe kwuru: Ndị a na-amalite na-agbasi-ike n’ajọọ-omume; ha anaghị aghọta akwụkwọ-nsọ nile, n’ihi na ha na-achọ inye onwe ha mgbanarị-ụta nke ịgba akwụnakwụna, n’ihi ihe ndị e deworo gbasara Devid, na Solomon nwa ya nwoke.

24 Lee, Devid na aSolomon n’ezie nwere ọtụtụ bndị nwunye na ndị enyị nwanyị bụ ihe nke bụ ihe arụ n’iru m, ka Onye-nwe kwuru.

25 Ya mere, otu a ka Onye-nwe kwuru, e dupụtawo m ndị a site na ala nke Jerusalem, site n’ike nke ogwe aka m, ka m wee welitere onwe m angalaba ezi-omume site na mkpụrụ nke ukwu Josef.

26 Ya mere, mụ bụ Onye-nwe Chineke agaghị ekwe na ndị a ga-eme dịka ndị nke mgbe ochie.

27 Ya mere, ụmụnne m nwoke, nụrụ nụ olu m, ma n̄aa ntị n’okwu nke Onye-nwe: N’ihi na agaghị enwe nwoke ọbụla n’etiti unu ga-enwe ma ọbụghị aotu nwunye; ma enyi nwanyị ọ dịghị nke ọ ga-enwe;

28 N’ihi na mụ, bụ Onye-nwe Chineke, na-enwe mmasị an’ịdị ọcha mmekọrịta nke ndịnyom. Ma akwụnakwụna nile bụ ihe arụ n’iru m; otu a ka Onye-nwe nke usuu nile nke ndị agha kwuru.

29 Ya mere, ndị a ga-edebe iwu-nsọ m nile, ka Onye-nwe nke usuu nile nke ndị agha kwuru, ama-ọbụ a bụọ ala ọnụ n’ihi ha.

30 N’ihi na ọbụrụ na m achọọ, ka Onye-nwe nke usuu nile nke ndị agha kwuru, iwelite amkpụrụ-afọ nye onwe m, aga m enye ndị m iwu; ma ọbụghị otu a ha ga an̄a-ntị n’ihe ndị a.

31 N’ihi na lee, mụ, Onye-nwe, ahụwo mwute, ma nụ iru-uju nke ụmụada nke ndị nke m n’ime ala Jerusalem, e, na n’ime ala nile nke ndị m, n’ihi ajọọ-omume na ihe arụ nile nke ndị di ha.

32 Ma a gaghị m ekwe, ka Onye-nwe nke usuu nile nke ndị agha kwuru, na akwa nile nke ezigbo ụmụada nke ndị a, nke m dupụtaworo site n’ala Jerusalem, ga-agbagokwute m megide ndị nwoke nke ndị m, ka Onye-nwe nke usu nile nke ndị agha kwuru.

33 N’ihi na ha agaghị edupụ na ndọkpụ n’agha ụmụada nile nke ndị m n’ihi ịdị nro ha, ma ọbụghị na m ga-eleta ha n’oke ọbụbụ-ọnụ, ọbụna ruo kwa na mbibi; n’ihi na ha agaghị agba aakwụnakwụna, dịka ndị nke mgbe ochie, ka Onye-nwe nke usu nile nke ndị agha kwuru.

34 Ma ugbua lee, ụmụnne m nwoke, unu matara na iwu-nsọ nile ndị a ka e nyere nna anyị, Lihaị; ya mere, unu amatawo ha rịị mbụ; ma unu abịakwutewo nnukwu amam-ikpe; n’ihi na unu emewo ihe ndị a nile nke unu na-ekwesịghị ime.

35 Lee, unu emewo aajọọ-omume karịa nke ndị Leman, ụmụnne anyị ndị nwoke. Unu etiwaala obi nile nke ndị nwunye unu dị nro, ma tufuo ntụkwasị-obi nke ụmụ unu, n’ihi ọmụma-atụ ọjọọ unu n’iru ha; na ịsụ-ude nile nke obi ha na-arịgokwute Chineke megide unu. Ma n’ihi isi ike nke okwu Chineke, nke na-agbadata megide unu, ọtụtụ obi nwụrụ, adụpuru na mmeru-arụ dị omimi.