Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ikwuhie Chineke, Nkwuhie Chineke


Ikwuhie Chineke, Nkwuhie Chineke

Ikwu okwu na-enyeghị Chineke ma-ọbụ ihe nile dị nsọ nsọpụrụ ma-ọbụ nkwanye ugwu.

Ndị Juu boro Jisus ebubo ikwuhie Chineke ọtụtụ oge n’ihi na O kwuru na O ruuru ya ịgbaghara mmehie nile (Mat. 9:2–3; Luk 5:20–21), n’ihi na ọ kpọwọ onwe ya Ọkpara Chineke (Jọn 10:22–36; 19:7), ma n’ihi na o kwuru na ha ga-ahụ ya ka Ọ na anọdụ n’aka nri nke ike na na-abịa kwa n’igwe ojii nile nke elu-igwe (Mat. 26:64–65). Ebubo ndị a gaara abụ ezi-okwu ma a sị na-ọ bụghịrị ihe ndị a nke Ọ sị na ya bụ. Ebubo ndị aka-ebe ụgha nile boro ya na mgbe a na-ekpe ya ikpe n’iru ndị Sanhedrin (Mat. 26:59–61) bụ nke nkwuhie megide temple nke Chineke, Nkwuhie Chineke megide Mụọ Nsọ, nke bụ ịkpachara anya gọnarị Kraịst mgbe e nwetasịworo mmụta zuru oke banyere ya, bụ mmehie ahụ na-enweghi mgbaghara (Mat. 12:31–32; Mak 3:28–29; OznỌd. 132:27).