Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Mnwogharị


Mnwogharị

Ọnọdụ nke ndị mmadụ ndị bụ ndị a tụgharịrị site na mpụta-ìhè na ụdị okike nke na-agaghị adịgide-nke arụ bụ ikulite ha ga n’ogo dị elu nke mụọ—nke ga-eme ka ha nagide iru na ebube nke ndị elu-igwe.

Mnwogharị nke Kraịst

Pịta, Jemes, na Jọn hụrụ Onye-nwe ebe e doro ya n’ebube na nwogharịa ya n’iru ha. Onye-nzọpụta ekweworị nkwa na Pịta ga-anata ọtụghe-ụzọ nile nke ala-eze elu-igwe (Mat. 16:13–19; 17:1–9; Mak 9:2–10; Luk 9:28–36; 2 Pita 1:16–18). N’oge ihe omume a nke dị mkpa, Onye-nzọpụta, Moses, na Elaịja nyere ọtụghe-ụzọ nile nke ọkwa nchụ-aja ahụ e kwere na nkwa n’aka Pịta, Jemes, na Jọn. Site na-ijide ọtụghe-ụzọ nile nke ọkwa nchu-aja ndị a, Ndị-ozi ahụ nwere ike ịga n’iru n’ọrụ nke ala-eze mgbe Jisus rigosiworo n’elu-igwe.

Joseph Smith kụziri na n’elu ugwu nke mnwogharị, Pịta, Jemes na Jọn ka enwogharịkwara enwogharị. Ha hụrụ otu ọ̀hụ́ nke ụwa dịka ọ ga-apụta ìhè na mgbe dị n’iru n’ọnọdụ nke ebube ya (OznỌd. 63:20–21). Ha hụrụ Moses na Elaịja, mmadụ abụọ enwogharịrị enwogharị, na nụkwara olu okwu nke Nna ahụ. Nna ahụ sịrị, Nke a bụ Ọkpara M Hụrụ n’Anya, Onye ihe ya dị m ezi mma; nụrụ nụ okwu ya (Mat. 17:5).

Ndị e nwogharịrị enwogharị