Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Dan


Dan

N’ime Testament Ochie, otu nwa-nwoke nke Jekọb na Bilha, odibo nwanyị Rachel (Jen. 30:5–6).

Agbụrụ nke Dan

Maka ngọzi Jekọb n’isi Dan, hụ Jenesis 49:16–18. Maka ngozi Moses n’isi agbụrụ Dan hụ Deuteronọmị 33:22. Mgbe ha nọdụsiri na Kenean, agbụrụ Dan nwetara ntakịrị ala nke nwebigara ike oke ịmịta mkpụrụ ihe ubi, (Josh. 19:40–48). Ọ bụụrụ ha nnukwu ihe isi ike iche kwa ya site n’aka ndị Amorait (Ndikp. 1:34) na kwa site n’aka ndị Filistịa (Ndikp. 13:2, 25; 18:1). N’ihi nke a ndị Dan gbagooro Mpaghara Elu-elu nke Palestain (Ndikp. 18), gburu gburu Laish ma kpọgharịa aha obodo ukwu ahụ Dan. Obodo a bụ ebe a maara nke ọma dika oke ala ugwu nke Palestain, nke gbatịrị site “Dan ọbụna ruo Bia-Sheba”.