Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Jemes, Nwanne-nwoke nke Onye-nwe


Jemes, Nwanne-nwoke nke Onye-nwe

N’ime Testament Ọhụrụ, otu nwanne nwoke nke Onye-nwe (Ndị-Gal. 1:19) na nke Joses, Saimọn, Judas na ụfọdụ ụmụnne ya ndịnyom (Mat. 13:55–56; Mak 6:3; Jud 1:1). A maakwara ya dịka Jemes onye ziri-ezi na nọọrọ n’ọnọdụ dị mkpa na Nzukọ-nsọ dị na Jerusalem (Ọlndoz. 12:17; 15:13; 1 Ndị-Kọ 15:7; Ndị-Gal. 2:9–12). Ikekwa ọbụ ya dere akwụkwọ-ozi nke Jemes.

Akwụkwọ-ozi e degaara nke Jemes

Otu akwụkwọ n’ime Testament Ọhụrụ. Na mmalite ma-ọbụ leta e dere nye agbụrụ iri na abụọ nke Israel a gbasasịrị na mba ndị ọzọ na ikekwe e dere ya site na Jerusalem. Akwụkwọ-ozi ahụ nwere ụfọdụ ihe e doro ọnọdụ doro anya banyere omume nke okpukpere chi, tinyere ndụmọdụ ahụ dị mkpa dị na isi nke 1 na ọ bụrụ na amamihe kọrọ onye ọbụla, ya rịọ n’aka Chineke maka enyem-aka (Jemes 1:5–6; A—JS 1:9–20). Isi nke 2 gbasara okwukwe na ọrụ nile. Isi nile nke 3–4 kwuru maka mkpa ọdị bụ inwe ike ịtụziri ire aka ma dọọ ndị-nsọ aka na ntị ịghara ikwu ihe ọjọọ onye ọbụla maka ibe ya. Isi nke 5 na-agba Ndị-nsọ ume inwe ntachi-obi na ka ha na-akpọ ndị okenye maka ngọzi mgbe nrịrịa; ọ na-akụzikwa maka ngọzi nile nke inye aka igbanwe ndị ọzọ.