Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 138


Nkeji 138

Ọ́hụ̀ e nyere Onye-isi nduzi Joseph F. Smith na Salt Lake City, Utah, na 3 Oktoba 1918. N’okwu mmeghe ya na Ọgbakọ Ntụgharịkọta uche zuru ọha mpaghara afọ 89 nke Nzukọ-nsọ; na 4 Oktoba 1918, Onye-isi nduzi Smith kwupụtara sị na ya enwetawo ọtụtụ mkpanye ụka ozi nile sitere na Chineke n’ime ọnwa nile ndị gara aga. Otu n’ime ndị a gbasara ngaru nleta nke Onye nzọpụta nye mụọ nile nke ndị nwụrụ anwụ mgbe arụ ya tọgbọ n’ime ili, nke Onye-isi nduzi Smith nwetara n’ụbọchị gara-aga. E depụtara ya otu mgbe ahụ na-eso mmechi ọgbakọ ahụ. Na 31 Oktoba 1918, Onye-isi nduzi Smith wepụtara ya n’iru ndị ndụmọdụ nke Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ, Kansụl nke Iri na Abụọ ahụ, na Onye isi ezi na ụlọ, na ha nile jiri otu olu nabata ha.

1–10, Onye-isi nduzi Joseph F. Smith na-atụgharị uche n’elu edemede nke Pịta na ngaru Onye-nwe anyị garuru ileta ala mụọ; 11–24, Onye-isi nduzi Smith ahụ ndị ezi omume nwụrụ anwụ ka ha zukọtara na paradaịs na ezisa ozi Kraịst n’etiti ha; 25–37, Ọ hụ otu e si hazie nkwusa ozi-ọma ahụ n’etiti ndị mụọ nile; 38–52, Ọ hụ Adam, Iv, na ọtụtụ ndị-amụma nile dị nsọ n’ime ụwa mụọ ndị tulere ọnọdụ ha na mụọ tutu mbilite n’ọnwụ ha dịka ịnọ n’oru; 53–60, Ndị ezi omume nwụrụ anwụ nke ụbọchị ugbu a na-aga n’iru na ọrụ ha nile n’ime ala ndị mụọ nile.

1 N’ụbọchị nke atọ nke Oktoba n’ime nari afọ iri na itoolu na afọ iri na asatọ, ka m nọdụrụ ala n’ime ụlọ m ana-atughari uche n’akwụkwọ nsọ nile;

2 Na na-atule ihe banyere nnukwu aịchụ aja nke mgbaghara mmehie nke Ọkpara Chineke chụrụ, n’ihi bmgbapụta nke ụwa.

3 Na oke aịhụnanya dị ebube nke Nna na Ọkpara ahụ mere ka ọ pụta ìhè n’ime ọbịbịa nke bonye mgbapụta n’ime ụwa;

4 Na site an’aja mgbaghara mmehie ya, na site na bnrube isi nye ụkpụrụ nile nke ozi-ọma, ka ụmụ mmadụ nweta nzọpụta.

5 Mgbe m nọ na-eme nke a, uche m laghachiri azụ gaa n’edemede nile nke Onye-ozi Pịta, degaara ndị-nsọ amgbe ochie ekposasịrị na obodo ọzọ n’ime ala nile nke bPontus, Galatịa, Kapadosia, na mpaghara ọzọ nile nke Esia, ebe e zisaworo ozi-ọma mgbe a kpọgbusiworo Onye-nwe.

6 M wee meghee Bible nsọ na gụọ isi nke atọ na nke anọ nke akwụkwọ-ozi mbụ nke Pịta, na mgbe m na-agụ, e nwere m oke afọ ojuju karịa otu m diworo mbụ enwe, banyere ihe ọgụgụ nile ndị a na-eso:

7 ’’N’ihi na Kraịst hụkwara ahụhụ banyere mmehie, nanị otu mgbe, onye ezi omume n’ihi ndị ajọ omume, ka o wee kuru anyị bịakwute Chineke, n’ihi na e mere ka ọ nwụọ ọnwụ n’anụ arụ ya, na e mere ka ọ dị ndụ na mụọ ya;

8 Nke ọbụ kwa n’ime ya ka ọ gara wee kwusaara ndị mụọ nọ an’ụlọ-mkpọrọ okwu;

9 Ndị na-ekwenyeghị n’oge gara-aga, mgbe ntachi-obi Chineke na-echesi ike n’ụbọchị Noa, mgbe a na-edozi ụgbọ, nke e weere mmiri zọpụta madụ ole-na-ole, yabụ madụ asatọ (Pịta nke mbu 3:18–20).

10 N’ihi na ihe eji zisaara ọbụna ndị nwụrụ anwụ ozi-ọma bụ nke a, ka e wee kpee ha ikpe dịka e si ekpe mmadụ n’anụ arụ, na ka ha we dị ndụ dịka Chineke si dị na mmụọ. (Pịta nke mbu 4:6.)

11 Mgbe m na-atụgharị uche n’elu ihe ndị a nile ndị e adeworo, banya nile nke nghọta m wee meghee, na Mụọ nke Onye-nwe wee cbịakwasị m, na m wee hụ igwe ndị nile dnwụrụ-anwụ, ndị nta na ndị ukwu.

12 Na e kpokọtara ha n’otu ebe ọgbakọ na-enweghi ịgụta ọnụ nke mụọ nile nke andị ezi-omume, ndị bkwesiworo ntụkwasị obi n’ime ịgba-ama ha banyere Jisus mgbe ha biri ndụ n’ịnwụ anwụ;

13 Na ha chụwororị aaja n’oyiyi nke nnukwu aja ahụ nke Ọkpara Chineke chụrụ, na ha benweworị mkpagbu n’aha onye mgbapụta ha.

14 Ndị a nile a hapụwori ndụ nke na-anwụ anwụ, na-anọgide si ike an’olile anya nke bmbilite n’ọnwụ dị ebube, site cn’amara nke Chineke dNna na Ọkpara ya ọ Mụrụ eNanị ya, Jisus Kraịst.

15 M wee hụ na ha juputara an’ọn̄ụ, na obi-ụtọ, na ha na-an̄ụrịkọta ọn̄ụ n’ihi n’ụbọchị nke nnapụta ha a dịwo nso.

16 Ha zukọtara na-eche ọbịbịa nke Ọkpara Chineke n’ime aala mụọ i kwupụta mgbapụta ha site na bagbụ nile nke ọnwụ.

17 Uzuzu ala ahụ e ji kpụọ ha, nke dara n’ụra ka a aga-eweghachi n’ụdị zuru oke ya, bọkpụkpụ nye ọkpụkpụ ya, na akwara nile na anụ arụ arịgokwasị ha, cmụọ na arụ ga-ejikọta ọnụ, a gaghị ekewakwa ha ọzọ, ka ha wee nweta uju nke dọn̄ụ.

18 Ka nnukwu ìgwè ndị a na-echere ma na-akparịta ụka, na-an̄ụrị ọn̄ụ n’ime oge awa nke nnapụta ha site n’ụdọ igwe nile nke ọnwụ, Ọkpara nke Chineke wee gosipụta onwe ya, na-ekwụpụta antọhapụ nye ndị nile a dọkpụụrụ n’agha bụ ndị kwesiworo ntụkwasị obi;

19 Na n’ebe ahụ ya aekwusaara ha bozi-ọma mgbe nile na-adigide, ozizi nsọ nke mbilite n’ọnwụ na mgbapụta nke mmadụ site cn’odịda ahụ na site na mmehie nile nke onye ọbụla n’ọnọdụ dnchegharị site na mmehie.

20 Mana nye ndị aajọ mmadụ, ya onwe ya agaghị, na n’etiti ndị na-ebighị ndụ yiri nke Chineke na ndị na-enweghị nchegharị bụ ndị bmerụworo onwe ha mgbe ha nọ n’anụ arụ, o welighi olu okwu ya;

21 Ọ dịghị ndị nnupụ-isi ndị jụworo ọgbụgba-ama nile na ndụmọdụ nile nke ndị amụma nile mgbe ochie bụ ndị hụrụ iru ya ma-ọbụ lekwasị iru ya anya.

22 N’ebe ndị a nọ ka aọchịchịrị jupụtara, mana etiti ndị ezi-omume ka budo dị.

23 Na ndị-nsọ nile n̄ụriworo ọn̄ụ n’ime amgbapụta ha, na hulata bikpere na nakwere Ọkpara Chineke dịka Onye-mgbapụta na Onye-nnapụta ha site n’ọnwụ na cụdọ-igwe nile nke ala mụọ.

24 Mbara iru ha nile na-enwu na ammuke, na ìhè si n’iru Onye-nwe nọkwasịrị ha, na ha wee bbụọ abụ otuto nye aha nsọ ya.

25 O wee ju m anya, n’ihi na aghọtara m na Onye-nzọpụta tinyere ihe dịka afọ atọ nile n’ime ije ozi ya n’etiti ndị Juu na ndị ahụ bụ ndị ụlọ nke Israel, na-agbalị ikuziri ha ozi-ọma mgbe nile na-adigide na kpọta ha na nehegharị.

26 Ma otu ọdị, na-agbanyeghị ọrụ ya nile dị ukwuu, na ọrụ ebube nile, na ịma ọkwa nke ezi okwu, an’ike dị ukwuu na ikike, ha dị nanị ole n’ole bụ ndị n̄ara ntị n’olu okwu ya; na n̄ụrịa ọn̄ụ n’iru ya, na nweta nzọpụta n’aka ya nile.

27 Mana ije ozi ya n’etiti ndị ahụ bụ ndị nwụrụ anwụ bụ nanị anwa oge dị n’etiti mkpọgbu n’obe na mbilite n’ọnwụ ya;

28 Na o wee dị m ebube bụ okwu nile nke Pịta—nke o kwuru sị na Ọkpara Chineke kwusaara ndị mụọ nile nọ n’ụlọ-mkpọrọ okwu, ndị na-ekwenyeghị, n’oge gara-aga mgbe ntachi obi nke Chineke na-echesi ike n’ụbọchị nile nke Noa—na otu osi kwe omume na ọ ga-ekwusara mụọ nile ndị ahụ okwu na rụọ ọrụ dị mkpa n’etiti ha na mkpirisi oge ahụ.

29 Na mgbe ọ na-adị m iju-anya, anya m nile wee meghee na nghọta m aka-akpalitere, m wee ghọta na Onye-nwe agaghị n’onwe ya n’etiti ndị ọjọọ na ndị na-ekweghị ekwe ndị jụrụ ezi okwu ahụ, ka ọ kuziere ha.

30 Na lee, site n’etiti ndị ezi-omume, ka ọ haziri ndị ọrụ ya nile na rọpụta ndị oje-ozi ya nile, ndị yikwasịworo aike na ikike dịka uwe na kwado ha ịga n’iru na bugara ha ìhè nke ozi-ọma, bụ ndị nọworị bn’ọchịchịrị, ọbụladị nye mụọ cnile nke ndị mmadụ, na site otua ka e si zisaa ozi-ọma nye ndị nwụrụ anwụ.

31 Na ndị-oje ozi nile ndị a họtaworo wee gaa n’iru ikwupụta ụbọchị annabata nke Onye-nwe na wee maa ọkwa bntọhapụ nye ndị a dọkpụrụ n’agha, ndị e kere agbụ, ọbụladị nye ndị nile bụ ndị ga-echegharị si na mmehie ha nile na nara ozi-ọma ahụ.

32 Otua ka e si zisaa ozi-ọma nye ndị anwụwororị anwụ n’ime mmehie ha nile, na-enweghi bmmata nke ezi-okwu, ma-ọbụ n’ime njehie, ebe ha jụrụ ndị amụma nile.

33 Ndị a ka a kụziworo aokwukwe na Chineke, nchegharị site na mmehie, baptism bn’ọnọdụ onye ọzọ n’ihi cnsachapụ nke mmehie nile, donyinye nke Mụọ Nsọ site na-ibịkwasị aka abụọ.

34 Na ụkpụrụ nile ndị ọzọ nke ozi-ọma ndị dịworo mkpa ka ha mara iji wee tozue-oke nye onwe ha ka e wee akpee ha ikpe dịka ndị mmadụ n’anụ arụ, na ha adị ndụ dịka Chineke n’ime mụọ.

35 Ma otua ka e mere ka amara n’etiti ndị nwụrụ anwụ, ma ndị nta, na ndị ukwu, ndị ajọ omume na kwa ndị kwesịrị ntụkwasị obi, na a rụwo ọrụ mgbapụta site an’aja Ọkpara nke Chineke chụrụ n’elu bobe.

36 Otua ka e mere ka-amara na Onye-mgbapụta anyị tinyere oge ya mgbe ọ nọ na njegharị ya n’ime ala ndị mụọ nile, na-inye ntụzi aka na-ikwadobe mụọ nile kwesịrị ntụkwasị obi nke andị-amụma nile ndị gbaworo ama banyere ya n’anụ arụ;

37 Ka ha wee buru ozi nke mgbapụta ahụ nye ndị nile nwụrụ anwụ, bụ ndị ahụ na-onweghị ike gakwuru n’onwe ya, n’ihi annupụ isi ha na njehie; ka ha site na nkwusa ozi nke ndị odibo ya nile nwe kwa ike nụrụ okwu ya nile.

38 N’etiti ndị ukwu na ndị dị ukwuu nile bụ ndị zukọrọ na nnukwu ọgbakọ nke a nke ndị ezi-omume bụ Nna aAdam, Ichie Ụbọchị nile na nna nke mmadụ nile.

39 Na Nne anyị dị otuto aIv ya na ọtụtụ ndị ada ya nwanyị ndị kwesịrị ntụkwasị obi ndị biworo ndụ n’ime ọgbọ nile na kpewoororị Chineke dị ndụ na ezi-okwu.

40 aEbel, onye mbụ e bgburu egbu n’ihi okwukwe ya, nọ ebe ahụ, na nwa nna ya nwoke cSet, otu n’ime ndị ahụ nile dị ukwuu, onye nke dị kpọm kwem dn’ụdị nke nna ya, Adam.

41 aNoa, onye nyere ndụmọdụ banyere ide mmiri ahụ, bShem, nnukwu conye isi nchụ-aja; dAbraham, nna nke ndị nwere okwukwe; eAịsak, fJekọb; na Moses, nnukwu gonye iwu nke Israel;

42 Na aAịsaịa onye kwuworo site n’amụma na-etere Onye-mgbapụta mmanụ ka ọ nyakọta obi ndị e tiwara etiwa, ị ma ọkwa ntọhapụ nye ndị nile a bdọkpụụrụ n’agha, na mmeghe nke cụlọ-mkpọrọ nye ha bụ ndị e kere agbụ, nọkwa ebe ahụ.

43 Nke ka nke, aEzikiel, onye nke e gosiri n’ọhụ oke ndagwurugwụ ahụ nke ọkpụkpụ nile bkpọrọ akpọ, ndị nke a ga eyikwasị anụ arụ, ndị ga-apụta ọzọ na cmbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ka mkpụrụ obi nile dị ndụ;

44 aDaniel, onye hụwororị na kwuworị banyere bala-eze Chineke nke a ga-ewuli elu n’ụbọchị ndị ikpeazụ, nke na-agaghị ebibi kwa ọzọ na a gaghị enyefe ya ndị ọzọ.

45 aElaias, onye ya na Moses nọọrọ n’ugwu bMnwogharị,

46 Na aMalakaị onye-amụma, onye gbaworo ama banyere ọbịbịa bElaịja—onye kwa Moronaị kwuworo banyere ya nye Onye-amụma Joseph Smith, na-ekwusa na-o ga abịa tutu e webata oke cụbọchị ahụ dị egwu, nke Onye-nwe—nọkwa ebe ahụ.

47 Onye-amụma Elaịja ga-akụnye n’ime aobi ndị bụ ụmụ nkwa nile e kwere ndị nna ha nile;

48 Bụrụ onyinyoo bu ụzọ nye oke aọrụ ahụ nke a ga-arụ n’ime btemple nile nke Onye-nwe n’ime cọgbọ ozuzụ oge nile akara aka, n’ihi mgbapụta nke ndị nwụrụ anwụ na dnrachi nke ndị bụ ụmụ nye ndị nile mụrụ ha, a sị ma-ọbụghị otu a, ụwa nile ka a ga-eji nkọcha mekpaa arụ na laa n’iyi na-ọbịbịa ya.

49 Ndị a nile na ọtụtụ ndị ọzọ kwa, ọbụladị andị-amụma nile ndị biri n’etiti ndị Nifaị na gbaworo ama banyere ọbịbịa nke Ọkpara Chineke gwakọtara na mbara igwè ọgbakọ ahụ ma na-echere n’ihi nnapụta ha.

50 N’ihi na ndị nwụrụ anwụ na-ele ogologo mgbe amụọ ha nile na-anọghi n’arụ ha anya dịka ị nọ bn’oru.

51 Ndị a ka Onye-nwe kụziworo, na nye ha aike ịpụta mgbe mbilite n’ọnwụ ya site na ndị nwụrụ anwụ gafeworo, ka ha bata n’ime ala-eze nke Nna ya, n’ebe ahụ ka e wee kpube ha banwụghị-anwụ na ndụ cebighi-ebi;

52 Na ha ga-aga n’iru site mgbe ahụ gawa n’ọrụ ha dịka Onye-nwe kwere nkwa, na bụrụ ndị nile ga-eso ịnata angọzi nile ndị e dobere chere n’ihi ha bụ ndị hụrụ ya n’anya.

53 Onye-amụma Joseph Smith, na nna m Hyrum Smith, Brigham Young, John Taylor, Wilford Woodruff, na ndị mụọ nile ọzọ a họrọ ahọ ndị e adobere ka ha pụta n’ozuzu oge nile akara aka, i so na-ịtọ bntọ-ala nile nke oke ọrụ ụbọchị-ikpeazụ.

54 Tinyere iwu temple nile na ịrụ ọrụ emume-nsọ nile n’ime ha n’ihi mgbapụta nke andị nwụrụ anwụ, nọkwa n’ime ala mụọ.

55 M wee leta na ha so n’etiti andị a maara ama na ndị dị ukwuu ndị a bhọworo na mbụ ịbụ ndị ọchịchị n’ime Nzukọ-nsọ nke Chineke.

56 Ọbụnadị tutu a mụọ ha, ha n’ọtụtụ ndị ọzọ nile, nwetara nkụzi mbụ ha n’ime ala ndị mụọ nile na e wee akwadobe ha ịpụta bn’oge a kara-aka nke Onye-nwe ị rụ ọrụ n’ime cubi vine ya, n’ihi nzọpụta nke mkpụrụ obi nile nke ndị mmadụ.

57 M wee hụ andị okenye nile kwesịrị ntụkwasị obi nke ọgbọ nke a, mgbe ha na-ahapụ ndụ nke na-anwụ anwụ, na-aga n’iru n’ọrụ ha nile na-ikwusa ozi-ọma nke nchegharị na mgbapụta site n’aja ahụ nke Ọkpara ahụ Chineke Mụrụ Nanị ya chụrụ, n’etiti ndị ahụ bụ ndị nọ bn’ọchịchịrị na ndị nọ n’oru nke mmehie n’ime oke ụwa ndị mụọ nile nke ndị nwụrụ anwụ.

58 Ndị nwụrụ anwụ nke chegharịrị ka a aga-agbapụta site na nrube isi nye bemume-nsọ nile nke ụlọ Chineke.

59 Na mgbe ha kwụsịworo ụgwọ ntaram ahụhụ dịịrị njehie ha nile, na a asachaa ha ka ha dị ọcha, ha ga-enweta ụgwọ ọrụ dịka bọrụ ha nile siri dị, n’ihi na ha bụ ndị nketa oke nke nzọpụta.

60 Otu a ka e si kpughee ọ́hụ̀ nke mgbapụta nke ndị nwụrụ anwụ nye m, na ana m agba ama, na amatara m na ama nke a bụ aezie, site na ngọzi nke Onye-nwe anyị na Onye-nzọpụta, Jisus Kraịst, ọbụna otua. Amen.