Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 22


Nkeji 22

Mkpụghe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Manchester, New York, Epril 1830 (History of the Church, 1: 79–80). Mkpughe a ka e nyere nzukọ-nsọ maka ndị ụfọdụ bụ ndị emere rịị baptism chọrọ ịbata sonye na Nzukọ-nsọ na-emeghị baptism ọzọ.

1, Baptism bụ ọgbụgba-ndụ ọhụrụ na mgbe nile na-adigide; 2–4, Baptism nwere ikike bụ ihe a chọrọ.

1 Lee, a sị m unu na aọgbụgba-ndụ ochie nile bụ nke m mere ka ha gabiga n’ihe nke a; ma nke a bụ ọgbụgba-ndụ ọhụrụ na bmgbe nile na-adigide, ọbụna nke ahụ nọ site na nmalite.

2 Ya mere, ọbụ ezie na mmadụ ga-eme baptism otu nari ugboro ọdịghị uru ọbụla ọ ga-abara ya, n’ihi na ị gaghị-esi n’ọnụ ụzọ dị warara baa site an’iwu nke Moses, ma-ọbụ bn’ọrụ unu nile nwụrụ anwụ.

3 N’ihi na ọ bụ maka ọru nwụrụ anwụ unu nile ka m ji mee ọgbụgba-ndụ ikpe-azụ a na nzukọ-nsọ a ị bụrụ ihe ewulitere nye m; ọbụna dịka n’ụbọchị nile ndị ochie.

4 Ya mere, banye an’ọnụ ụzọ ama ahu, dịka m nyere n’iwu, ma bachọla ka i nye Chineke gị ndụmọdụ. Amen.