Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 81


Nkeji 81

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Hiram, Ohio, Maach 1832 (History of the Church, 1:257–258). Frederick G. Williams ka a kpọrọ ka ọ bụrụ onye isi nchụ-aja na onye-ndụmọdụ n’Otu ndị-isi nduzi nke Ọkwa Nchụ-aja Dị Elu. Akụkọ ndekọta nile gosịrị na mgbe a natara mkpughe nke a na Maach 1832, ọ kpọrọ Jesse Gause n’ọkwa-ọrụ nke onye-ndụmọdụ nke Joseph Smith n’Ọtụ ndị-isi nduzi. Otu ọ dị, mgbe ọ jụrụ ị gan’iru n’ụzọ kwesịrị n’ọrụ nke a, ọkpụkpọ-oku ahụ ka e mesịrị nyefee Frederick G. Williams. Mkpughe ahụ (e nyere oge ya ka Maach 1832) ka e kwesịrị iwere dịka otu nzọ-ụkwụ chere iru n’ezi nhazi nke Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ, ịkpọ-aha kpọm-kwem maka ọkwa-ọrụ nke onye-ndụmọdụ n’òtù ahụ ma na-akọwa ùgwù nke nhọpụta n’ọkwa-ọrụ ahụ Nwanne-nwoke Gause rụtụrụ nwa-oge mana a chụpụrụ ya site na Nzukọ-nsọ na Disemba 1832. Nwanne-nwoke Williams ka e chiri echichi baa n’ọkwa-ọrụ ahụ a kpọrọ aha na 18 Maach 1833.

1–2, Ọtụghe-ụzọ nile nke ala-eze ga-adị oge nile n’aka Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ; 3–7, Ọbụrụ na Frederick G. Williams ekwesị ntụkwasị-obi n’ije-ozị ya, ọ ga-enweta ndụ ebighi-ebi.

1 N’ezie, n’ezie, a sị m gị nwa odibo m Frederick G. Williams: Gee ntị n’olu nke ya onye na-ekwu, nye okwu ahụ nke Onye-nwe Chineke gị, ma n̄aa ntị n’ọkpụkpọ-oku ahụ nke a kpọrọ gị, ọbụna ị bụ aonye ịsị nchụ-aja na nzukọ-nsọ m, na onye-ndụmọdụ nye nwa odibo m Joseph Smith, Nta.;

2 Onye e nyeworo aọtụghe-ụzọ nile nke ala-eze ahụ, nke bụ nke bOtu ndị-isi nduzi Ọkwa Nchụ-aja dị Elu oge nile:

3 Ya mere, n’ezie a nakwere m ya n’ezi-okwu ma ga-agọzi ya, na kwa gị, ọbụrụraa na ị kwesịrị ntụkwasị-obi na ndụmọdụ, n’ọkwa-ọrụ nke m nyeworo gị, n’ekpere oge nile, n’olu gị ma n’obi gị, n’iru ụwa ma na nzuzo, na kwa n’ije-ozị gị n’ikwusa ozi-ọma n’ala nke ndị dị ndụ, ma n’etiti ụmụnne gị.

4 Ma n’ime ihe ndia ị ga-eme ihe kachasị dị mma nye ndị mmadụ ibe gị, ma ga-ebuli aotuto ya elu onye bụ Onye-nwe gị.

5 Ya mere, kwesị ntụkwasị-obi, guzoro n’ọkwa-ọrụ nke m nyeworo gị; alekọta ndị n’adịghị ike, welite aka ndị ahụ rudara ala, ma mee ka ikpere nile ndị bn’adịghị ike ka ha cguzozie.

6 Ma ọ buru na ị kwesị ntụkwasị-obi ruo ọgwụgwụ ị ga-enwe okpu-eze nke aanwụghị anwụ, na ndụ bebighi-ebi cn’ebe-obibi nile m kwadoworo n’ụlọ nke Nna m.

7 Lee, ma hụrụ, ndị a bụ okwu nile nke Alfa na Omega, ọbụna Jisus Kraịst. Amen.