Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 40


Nkeji 40

Mkpughe e nyere Joseph Smith onye-amụma na Sidney Rigdon, na Fayette, New York, Jenuarị 1831 (History of the Church, 1:145). Tutu e nwee ndepụta nke mkpughe nke a. Onye-amụma dere “dịka James Covill jụrụ okwu nke Onye-nwe, ma laghachi soro ndị ya ochie na ụkpụrụ ha nile, Onye-nwe nyere mụ na Sidney Rigdon mkpughe nke a n’eso” (History of the Church, 1:145).

1–3, Ụjọ nke mkpagbu na nchegbu maka ihe nke ụwa na-eme anabataghị ozi-ọma.

1 Lee, n’ezie a sị m unu, na obi nwa-odibo m aJames Covill ziri-ezi n’iru m, n’ihi na o mere ọgbụgba-ndụ mụ na ya na ọ ga-erube isi n’okwu m.

2 Ma ọ anabatara okwu ahụ n’obi ụtọ, kama otu mgbe ahụ Setan nwara ya, ma ụjọ nke bmkpagbu na nchegbu maka ihe nke ụwa mere ya cịjụ okwu m.

3 Ya mere, o mebiri ọgbụgba-ndụ m, ọ fọdụrụ m ime ya otu o si masị m. Amen.