Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 57


Nkeji 57

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Zaịọn, Ógbè Jackson, Missouri, 20 Julaị 1831 (History of the Church, 1:189–190). N’irube-isi n’iwu nke Onye-nwe (nkeji 52), ndị okenye ejewo njem site na Kirtland ruo na Missouri ma nwee ọtụtụ ihe mere ha dị iche-iche na ụfọdụ mmegide. Mgbe ọ na-eche maka ọnọdụ nke ndị Leman na enweghị mmepe-anya, ọzụzụ, na okpukpe-chi zuru ọha n’etiti ndị ahụ nile, Onye-amụma tipụrụ mkpu: “Olee mgbe ka ọzara ga-agbawa ifuru dịka rose? Olee mgbe a ga-ewulite Zaịọn elu n’ebube ya, na olee ebe temple Gị ga-eguzo, ebe mba nile ga-abịa n’ụbọchị ndị ikpe-azụ?” (History of the Church, 1:189). Na nsochi o nwetara mkpughe nke a.

1–3, Independence, Missouri bụ ebe dị maka Obodo-ukwu nke Zaịọn na temple; 4–7, Ndị-nsọ nile ga-azụta ala ma nata ihe-nketa nile na mpaghara ahụ, 8–16; Sidney Gilbert ga-ehiwe ụlọ ahịa, W.W. Phelps ga-abụ onye mbipụta akwụkwọ, ma Oliver Cowdery ga-ahazi ihe e dere maka mbipụta.

1 N̄aa-ntị, O unu ndị okenye nke nzukọ-nsọ m, ka Onye-nwe Chineke unu kwuru, ndị kpọkọtaworo onwe unu ọnụ, dịka iwu-nsọ m nile siri dị, n’ala nke a, nke bụ ala nke aMissouri, nke bụ bala nke m họpụtaworo ma cdoo nsọ maka dmkpọkọta nke ndị-nsọ.

2 Ya mere, nke a bụ ala e kwere na nkwa, na aebe bụ maka obodo-ukwu nke bZaịọn.

3 Ma otu a ka Onye-nwe Chineke unu kwuru, ọbụrụ na unu ga-anabata amamihe nke a bụ amamihe. Lee, ebe ahụ nke a na-akpọ Independence ugbụ a bụ ebe etiti ya; ma ebe bụ maka atemple dị n’ọdịda-anyanwụ ya, n’ebe na-adịghị anya site na-ụlọ-ikpe.

4 Ya mere, ọ bụ amamihe na ndị nsọ nile aga-azụta ala ahụ, na kwa ala nile dị n’ọdịda anyanwụ, ọbụna ruo n’ahịrị nke gara n’iru n’etiti bndị Juu na ndị Jentaịlụ;

5 Na kwa ala nile nke dị n’oke ebe ahịhịa nile, ọbụrụraa na ndị-na-eso-uzo m enwe ike aịzụta ala nile. Lee, nke a bụ amamihe, ka ha wee bnweta ya dịka ihe nketa mgbe nile na-adigide.

6 Ma ka nwa odibo m Sidney Gilbert guzo n’ọkwa-ọrụ nke m họpụtaworo ya, ịnata ego nile, ị bụrụ onye annọchite-anya nzukọ-nsọ, ịzụta ala na mpaghara nile gbara gburu-gburu. Ọbụrụraa na a ga-enwe ike ime n’ezi-omume, ma dịka amamihe ga-atuzi-aka.

7 Ma ka nwa odibo m aEdward Partridge guzo n’ọkwa-ọrụ nke m họpụtaworo ya, ma bkewaa nye ndị-nsọ nketa ha, ọbụna dịka m nyeworo n’iwu; na kwa ndị ahụ nke ọ họpụtaworo inyere ya aka.

8 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, ka nwa odibo m Sidney Gilbert hiwe onwe ya n’ebe a, ma mepee ụlọ-ahịa ka ọ wee nwee ike ire ngwa ahịa nile n’enweghi aghụghọ, ka ọ wee nwee ike inweta ego were zụta ala nile maka ọdị mma nke ndị-nsọ nile, na ka ọ wee nweta ihe ọbụla ndị-na-eso-ụzọ nwere ike ịchọ iji hiwe onwe ha n’ihe-nketa ha.

9 Na kwa ka nwa odibo m Sidney Gilbert nweta akwụkwọ ikike—lee n’ebe a ka amamihe dị, ma ka onye ọbụla na-agụ ya ghọta—ka ọ wee nwe ike izipu ngwa-ahịa kwa nye ndị mmadụ, ọbụna site n’aka ndị ọbụla ọ chọrọ dịka ndị ode-akwụkwọ e nyere ọrụ n’ije-ozị ya.

10 Ma site otu a nweta ihe maka ndị-nsọ m nile, ka e wee kwusaa ozi-ọma m nye ndị ahụ nke nọ ọdụ an’ọchịchịrị ma na mpaghara na bonyonyo nke ọnwụ.

11 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, ka e hiwe nwa odibo m aWilliam W. Phelps n’ebe a, ma ka e hiwe ya dịka bonye-mbipụta akwụkwọ nye nzukọ-nsọ.

12 Ma lee, ọ bụrụ na ụwa anabata edemede ya—lee ebe a ka amamihe dị—ka o nweta ihe ọbụla o nwere ike inweta n’ezi-omume, maka ọdị mma nke ndị-nsọ.

13 Na ka nwa odibo m aOliver Cowdery nyere ya aka, ọbụna dịka m nyeworo n’iwu, n’ebe ọbụla m ga-ahọpụta nye ya, ijije, na idezi, na ịhọpụta, ka ihe nile dị mma n’iru m, dịka a ga-enwe ike ịchọpụta ezi-okwu ya site na Mụọ site na ya.

14 Ma otu a ka e hiwe ndị a nile m kwuworo maka ha n’ala nke Zaịọn, ngwa ngwa ka o si kwee omume, ha na ezi na ụlọ ha nile, ime ihe ndị ahụ nile ọbụna dịka m kwuworo.

15 Ma ugbụ a gbasara mkpọkọta ahụ—ka ụkọchukwu na onye nnọchite-anya mee njikere nile, maka ezi na ụlọ nile ndị ahụ e nyeworo iwu ịbịa n’ala nke a, ọsọ ọsọ dịka o si kwe omume, ma hiwe ha n’ihe-nketa ha.

16 Ma nye ndị fọdụrụ n’ime ndị okenye na ndị-otu, a ga-enye ntuzi-aka ndị ọzọ ma e mesịa. Ọbụna otu a. Amen.