Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 114


Nkeji 114

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Far West, Missouri, 17 Epril 1838 (History of the Church, 3:23).

1–2, Ọkwa-ọrụ nile nke ndị n’ekwesighi ntụkwasị-obi ji ka a ga-enyefe ndị ọzọ.

1 N’ezie otu a ka Onye-nwe kwuru: Ọ bụ amamihe nke nwa odibo m David W. Patten, ka o mezie ọrụ nke ya nile ngwa-ngwa dịka o nwere ike, na nyepụchasia ngwa-ahịa ya nile, ka o nwee ike ije igbasa ozi-ọma nke m na mmalite udummiri na-abịa, ya na ndị-ọzọ, ọbụna ndị iri na abụọ ahụ tinyere onwe ya, igba-ama nke aha m na gbaa ama ozi-ọma nye ụwa nile.

2 N’ihi n’ezie otu a ka Onye-nwe kwuru, na ọ bụrụ raa na enwere ndị ahụ n’etiti unu ndị na-agọnarị aham, ndị ọzọ ka a aga-edochi bn’ọnọdụ ha na nara ọkwa ụkọchukwu ha. Amen.