Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 36


Nkeji 36

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith onye-amụma nye Edward Partridge na-nso Fayette New York, Disemba 1830 (History of the Church, 1:131). (Lee isi-ọkwu nke nkeji 35). Onye-amụma sịrị na Edward Partridge “bụ ihe-nlere anya na okpukpere chi, na otu n’ime nnukwu mmadụ nke Onye-nwe; (History of the Church, 1:128).

1–3, Onye-nwe bikwasịrị aka n’isi Edward Partridge site n’aka Sidney Rigdon; 4–8, Nwoke ọbụla nke natara ozi-ọma na ọkwa nchụ-aja ka aga-akpọ ị ga kwusaa ozi-ọma.

1 Otu a ka Onye-nwe Chineke kwuru, aOnye bụ Dike nke Israel; lee, a sị m gị nwa odibo m bEdward, ngọzi na-adịrị gị ma agbagharawo gị mmehie gị nile, ma akpọrọ gị ikwusa dịka jiri olu nke opi;

2 Ma a ga m ebịkwasi gị aaka site n’aka nwa odibo m Sidney Rigdon, ma ị ga-anata mụọ m, Mụọ Nsọ, ọbụna bOnye-nkasị-obi ahụ, nke ga-akụziri gị cihe udo nile nke ala-eze;

3 Ma ị ga-ekwupụta ya n’olu ike nasị; Hosanna, ngọzi na-adịrị aha nke Chineke onye-kachasị elu.

4 Ma ugbu a ọkpụkpọ nke a na iwu-nsọ ka m na-enye gị gbasara mmadụ nile.

5 Ka ha ra bụ ndị ga-abịa n’iru ụmụ odibo m Sidney Rigdon na Joseph Smith, Nta, na-anabata ọkpụkpọ a na iwu-nsọ ka a aga-echi echichi ma zipụkwa bịkwụsa ozi-ọma mgbe nile na-adigide n’etiti mba nile.

6 Na-eti mkpu nchegharị na-asị azọputanụ onwe unu n’ọgbọ a dị mgbagọ, ma pụtakwanụ site n’ọkụ, na-akpọkwa-asi ọbụna buwe nile anụ arụ nyeworo ntụpọ.

7 Ma iwu-nsọ nke a ka a ga-enye ndị okenye nke nzukọ-nsọ m, ka nwoke ọbụla nke nabatara ya n’obi nke aghụghọ n’adịghị ka e chie ya echichi ma zipukwa ya, ọbụna, dịka m kwuworo.

8 A bụ m Jisus Kraịst, Ọkpara nke Chineke; ya mere, kee ihe okike ukwu gị ma a ga m abịa na mgberede na atemple m. Ọbụna otu a. Amen.