Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 133


Nkeji 133

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith, Onye-amụma na Hiram, Ohio, 3 Novemba 1831 (History of the Church, 1:229–234). N’okwu mmalite mkpughe nke a Onye-amụma dere, ’’N’oge nke a ọtụtụ ihe dị nke ndị Okenye nile nwere mmasị ịmata banyere izisa Ozi-ọma nye ndị nile bi n’ime ụwa, na gbasara mkpọkọta ahụ n’usoro ije ije n’ime ezi ìhè ahụ, na nweta ndụmọdụ nke si n’elu, na 3 Novemba, 1831, achọwo m n’aka Onye-nwe na nweta mkpughe nke a dị mkpa na-eso’’ (History of the Church, 1:229). Nkeji nke a ka e buru ụzọ tinye n’akwụkwọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile dịka nso n’azụ na e mesịa nye ya ọnụ ọgụgụ nkeji.

1–6, Ndị-nsọ nile ka-enyere iwu nsọ ka ha kwado maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ; 7–16, Mmadụ nile ka e nyere iwu ka ha si na Babịlọn gbapụ bịa na Zaiọn, na kwado maka oke ụbọchị nke Onye-nwe; 17–35, Ọ ga-eguzo n’Ugwụ Zaiọn, kontinenti nile ga-abụrụ otu ala, na agbụrụ nile nke Israel nke furu efu ga-alọghachi; 36–40, Ozi-ọma ahụ ka e weghachiworo site n’aka Joseph Smith ka e wee zisaa n’ime uwa nile; 41–51, Onye-nwe ga-agbadata n’ọbọ n’arụ ndị ajọ mmadụ; 52–56, Ọ ga-abụ afọ nke ndị ya agbapụtaworo; 57–74, Ozi-ọma ahụ ka a ga-ezipụ iji zọputa Ndị-nsọ nile na n’ihi mbibi nke ndị ajọ mmadụ.

1 N̄aa-ntị, O unu ndị nke nzukọ nsọ m, ka Onye-nwe Chineke unu kwuru, na nụrụ nụ okwu nke Onye-nwe gbasara unu.

2 Onye-nwe, onye nke aga-abịa na temple ya; na mberede, Onye-nwe, onye nke ga-agbadata n’elu ụwa jiri ịbụ ọnụ na bikpe-ikpe, e, n’elu mba nile na-echefu Chineke, na n’elu isi ndị nile na-amaghị Chineke n’etiti unu.

3 N’ihi na ọ aga-agbawa ogwe aka ya ọtọ n’anya nile nke mba nile, na nsọtụ nile nke ụwa ga-ahụ bnzọpụta nke Chineke ha.

4 Ya mere, kwadobe nụ, kwadobe nụ, O ndị nke m, sachaanụ onwe unu nile, gbakọtaanụ ọnụ, O unu ndị nke nzukọ nsọ m, n’elu ala nke Zaịọn, unu nile ndị na-enyeghị iwu ka unu chere.

5 Si nụ na aBabịlọn pụọ. Dị nụ bọcha bụ ndị na-ebu ngwa-ọrụ nile nke Onye-nwe.

6 Kpọọ ọgbakọ ofufe ime mụọ unu nile, na akwuo nụ okwu ugboro ugboro otu onye nye onye ọzọ. Na ka nwoko ọbụla kpọkuo aha nke Onye-nwe.

7 E, n’ezie asị m unu ọzọ, oge ahụ abịawo mgbe olu-okwu nke Onye-nwe na-adara unu: Sinu na Babịlọn pụọ, agbakọta nụ site n’etiti mba nile, site bn’ifufe anọ nile, site n’otu ngwụcha nke elu-igwe ruo na nke ọzọ.

8 aZipụ ndị okenye nke nzukọ nsọ m nye mba nile, bụ ndị nọ n’ebe dị anya; nye bala nile mmiri gbara gburu gburu, ziga nye ala ndị ọzọ nile, kpọkuo mba nile, nke mbụ nye cndị Jentaịlụ nile, na mgbe ahụ dndị Juu nile.

9 Na lee, na hụ, nke a ga-abụ iti mkpu ha, na olu-okwu nke Onye-nwe nye mmadụ nile: Gaa nụ baa n’ime ala nke Zaịọn, ka oke ala ndị m buwanye ibu, na ka astek ya nile nwee agbam-ume, na ka bZaịọn wee gaa n’iru baa n’ime mpaghara nile dị gburu gburu.

10 E, ka iti mkpu ahụ gaa n’iru n’etiti madụ nile: Teta na bilie na gaa n’iru izute aOnye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ; lee na hụ, Onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-abia; pụọ nụ gaa zute ya. Kwadobe onwe unu nile maka boke ụbọchị nke Onye-nwe.

11 Ya mere, achee nu nche, n’ihi na unu bamataghị ụbọchị ahụ ma-ọbụ oge awa ahụ.

12 Ya mere, ka ha-ra, bụ ndị nọ an’etiti ndị Jentaịlụ nile gbaba na bZaịọn.

13 Na ka ha ra bụ ndị aJuda gbaba na bJerusalem, cn’ugwụ nile nke dụlọ nke Onye-nwe.

14 Pụọ nụ site n’etiti mba nile, ọbụladị site na Babịlọn, site n’etiti ajọọ omume nke bụ Babịlọn nke mụọ.

15 Mana n’ezie, otu a ka Onye-nwe kwuru, ka mgbapụ unu ghara ịdị aọsọ ọsọ, mana ka a kwado ihe nile n’iru unu, na onye na-aga, ya belekwala anya n’azụ, ka mbibi mberede ghara ịdakwasị ya.

16 N̄aa ntị na nụrụ, O unu ndị bi n’elu ụwa. aGekọtaa nụ ntị ọnụ unu ndị okenye nile nke nzukọ nsọ m, na nụrụ nụ olu okwu nke Onye-nwe; n’ihi na ọ na-akpọ madụ nile oku, ọ na enyekwa madụ nile ịwu n’ebe nile ka ha bchegharịa.

17 N’ihi lee, Onye-nwe Chineke aezipụwori mụọ-ozi ahụ na-eti mkpu n’etiti nke elu-igwe, na-asị: Kwado nụ ụzọ nke Onye-nwe, na mee ka okporo ụzọ ya dị bwarawara, n’ihi na oge awa ahụ nke cọbịbịa ya adịwo nso—

18 Mgbe aNwa-atụrụ ahụ ga-eguzo, n’elu bUgwụ Zaịọn, ya na otu cnarị puku na iri puku anọ na anọ, bụ ndị e deworo aha nke Nna ya n’egedege iru ha nile.

19 Ya mere, kwado nụ maka aọbịbịa nke bOnye na-alụ nwunye ọhụrụ; gaa nụ, gaa nụ n’ezi i zute ya.

20 N’ihi lee, ọ aga-eguzo n’elu ugwụ Olivet, na n’elu nnukwu oke osimiri, ọbụna ebe miri oke emi, na n’elu ala nile mmiri gbara gburu gburu, na n’elu ala nke Zaịọn.

21 Na ọ aga-ekwupụta olu okwu ya site n’ime bZaịọn, na ọ ga-ekwu okwu site na Jerusalem, a ga-anụkwa olu okwu ya n’etiti ndị nile;

22 Ọ ga-abụkwa olu okwu dika aolu okwụ nke ọtụtụ mmiri nile, dika kwa olu okwu nke oke begbe elu-igwe, nke cga-akwatu ugwu ukwu nile, na ndagwurugwụ nile ka na-agaghị achọta.

23 Ọ ga-enye ebe miri oke emi iwu, ma e wee chụghachi kwa ya azụ n’obodo nile nke elu elu, na aala nile mmiri gbara gburu-gburu ga-aghọ otu ala;

24 Na ala nke aJerusalem na ala nke Zaịọn ka a ga-eweghachi azụ bịa n’ime ọnọdụ nke ha, na elu ụwa ga-adị dịka ọ dịworo n’ụbọchị nile tutu e bkewaa ya.

25 Na Onye-nwe, ọbụna Onye nzọpụta ga-eguzo n’etiti ndị nke ya, na o aga-achị eze nye anụ arụ nile.

26 Na ka ha ra bụ ndị nọ n’obodo nke aelu elu nile ga-abịa na ncheta n’iru nke Onye-nwe, na ndị amụma ha nile ga-anụ olu okwu ya, na ha a gaghị kwa akwụsị onwe ha, ha ga-emekpa kwa nkume nile arụ, na mmiri jụrụ oyi ga-eruda n’iru ha.

27 A ga ewu kwa aokporo ụzọ n’ime etiti ebe ahụ miri oke emi.

28 Ndị iro ha ga-abụrụ ha anụ mgburi.

29 Na n’ime ọzara nile nke ana-enweghi ike ịmịta mkpụrụ, ebe ahụ ka ọdọ mmiri nile nke ndụ ga-esi pụta, na ala ahụ nke kpọrọ nkụ a gaghị abụ kwa ala nwere agụụ mmiri.

30 Na ha ga-eweta ụba akụ ha nile nye n’aka ụmụ aIfrem, ndị odibo m nile.

31 Na oke ala nile nke augwụ nile nke mgbe nile na-adigide ga-ama jijiji n’iru ha.

32 N’ebe ahụ kwa ka ha ga-ada n’ala, e wee kpube ha okpu eze ebube, ọbụladị n’ime Zaịọn, site n’aka nile nke ndị odibo nke Onye-nwe, ọbụna ụmụ nke Ifrem.

33 Na ha ga-ejupụtakwa an’abụ nile nke ọn̄ụ mgbe nile na-adigide.

34 Lee, nke a bụ ngọzi ahụ nke Chineke mgbe nile na-adigide n’elu aagbụrụ nile nke Israel, na ngọzi nke kacha n’ụba n’elu isi nke bIfrem na ndị ibe ya nile.

35 Na ha onwe ha kwa nke agbụrụ aJuda, mgbe ahụ mgbu ha gafere, a ga-asacha ha n’ime bịdị nsọ n’iru Onye-nwe, ibi n’iru ya ehihie na abalị, ruo mgbe nile na mgbe nile.

36 Na ugbụ a, n’ezie ka Onye-nwe kwuru, ka-amata ihe ndị a n’etiti unu, O ndị nile bi n’elu ụwa, ezipuwo m ri amụọ-ozi nke m ka ọ na-efe n’etiti elu-igwe, na-enwe bozi-ọma mgbe nile na-adigide, onye gosiworo onwe ya nye ụfọdụ, o nyefewo kwa ya n’aka mmadụ, onye ga-egosikwa onwe ya nye ọtụtụ ndị bi n’elu ụwa.

37 Na aozi-ọma nke a ka a bga-ezisa nye mba cnile, na ebo nile, na asụsụ nile, na ndị nile.

38 Na ndị odibo nile nke Chineke ga-aga n’iru, na-asị n’oke olu okwu: Tụọ nụ Chineke egwu na nye ya otuto, n’ihi n’oge awa nke ikpe ya abiawo;

39 aKpọọ kwa nụ isi ala nye ya bụ onye kere elu-igwe, na ala na oke osimiri, na isi iyi nile nke mmiri nile—

40 Na-akpọku aha nke Onye-nwe, ehihie na abali, na-asị: O asị na ị aga-adọwa elu-igwe nile ka i wee rịdata, asi na ugwụ ukwu nile ga-eruda dika mmiri n’iru gị.

41 Na a ga-aza ya n’isi ha nile; n’ihi na iru nke Onye-nwe ga-adị ka ọkụ na-agbaze ihe nke na-ere, na dịka ọkụ na-eme ka mmiri nile asụọ.

42 O Onye-nwe, ị ga-aridata ime ka aha gị pụta ìhè nye ndị iro gị, na mba nile ga-amakwa jijiji n’iru gị—

43 Mgbe i mere ihe nile di egwu, ihe nile ha na-eleghị anya ha;

44 E, mgbe i rịdatara, na ugwu ukwu nile esi n’iru gị ruda dịka mmiri, ị aga-ezute onye ahụ nke na-an̄ụrị ọnụ ma na-arụkwa ọrụ ezi omume, onye nke na-echeta kwa gị n’ime ụzọ gị nile.

45 N’ihi site na mbido nke ụwa, mmadụ anụghị, ha anụtaghị kwa na ntị, ma-ọbụ anya ọbụla ahụghi kwa, O Chineke, ewezuga gị, ka ihe nile sị dị ukwuu nke i akwadoworo nye onye nke bna-echere gị.

46 Na a ga-ekwu sị: aOnye bụ nke a na-esi na Chineke nke elu-igwe bna-arịdata, yi uwe nsọ e tejiri ọbara-ọbara; e, site na mpaghara nile nke na-amaghị ama, onye na-eyi uwe dị ebube mara nma ya, na-azọ ije na ịba-ụba nke ike ya?

47 Na onye ahụ ga-asị: Abụ m ya onye nke kwuworo okwu n’ezi omume, dị ike ịzọpụta.

48 Onye-nwe ga-adi aọbara ọbara n’uwe ya, na uwe nsọ ya dịka nke onye ahụ nke na-ayọcha mmanya n’ebe ịnara mmanya.

49 Na ọ ga-adị ukwuu bụ ebube nke iru ya, nke mere na aanyanwụ ga-ezopụ iru ya n’ihere, na ọnwa ga-ejide ìhè ya, na kpakpando nile ka a ga-atụda site n’ebe nile nke ha.

50 Na a ga-anụ olu okwu ya: aazọchawo m ebe ịnara mmanya nanị m, na ewetawo m ikpe megide ndị nile; na ọ dịghị onye ọbula mụ na ya nọ;

51 Na azọpịawo m ha n’oke iwe m, na m zọdara ha na ọnụma m, na ọbara ha ka m afesara n’uwe nsọ m nile, na merụọ uwe oyiyi m nile, n’ihi na nke a bụ ụbọchị ịbọ ọbọ nke dịworị n’ime obi m.

52 Na ugbua afọ nke ndị m agbapụtaworo abịawo, na ha ga-ekwupụta ịhụnanya obi-ọma nke Onye-nwe ha, na-ihe nile o nyeworo n’aka ha dịka ịdị nma ya siri dị, na dịka ịhụnanya obi-ọma ya siri dị ruo mgbe nile na mgbe nile.

53 N’ime amkpagbu nile ha, ya ka-akpagburu. Na mụọ-ozi nke iru ya azọpụtawo ha, na n’ime bịhụnanya ya, na ọmiko ya, ọ cgbapụtara ha, na palie ha, na kụrụ ha ụbọchị nile nke mgbe ochie;

54 E, na aInọk kwa, na ndị ahụ bụ ndị nọnyeere ya; ndị amụma nile ndị bu ya ụzọ; na bNoa kwa, na ndị ahụ bụ ndị bu ya ụzọ; na cMoses kwa, na ndị ahụ bu ndị bu ya ụzọ;

55 Na site na Moses ruo na Elaịja, na site na Elaịja ruo na Jọn, ndị nonyeere Kraịst n’ime ambilite n’ọnwụ ya, na ndị-ozi nile dị nsọ, tinyere Abraham, Aịsak, na Jekọb ga-anọ n’iru nke Nwa-atụrụ ahụ.

56 Na aili nile nke bndị-nsọ ka a ga cemeghe; na ha ga-apụta, guzokwa dn’aka nri nke Nwa-atụrụ ahụ, mgbe ọ ga-eguzo n’elu eUgwu ukwu Zaịọn, na n’elu obodo ukwu ahụ dị nsọ, Jerusalem fỌhụrụ ahụ; na ha ga-abụ gabụ nke hNwa-atụrụ ahụ, ehihie na abalị ruo mgbe nile na mgbe nile.

57 Na n’ihi nke a, ka e mee ka ndị mmadụ keta oke an’ebube nile nke a ga-ekpughe, Onye-nwe ezipuwo uju nke bozi-ọma ya, ọgbụgba-ndụ mgbe nile na-adigide nke ya na-ịtụgharị uche na ịdị mfe nghọta na enweghị mpako.

58 Ka e wee kwadobe ndị na-adịghị ike maka ihe ndị ahụ na-abịa n’elu ụwa, na n’ihi ozi nke Onye-nwe, n’ụbọchị ahụ mgbe andị na-adịghị ike ga-eme ka ihere mee ndị oke amamihe, na bonye dị nta ga-aghọ mba dị ike, na madụ cabụọ ga-eme ka puku mmadụ iri ha nile gbalaga.

59 Na site n’ihe nile na-adịghị ike nke ụwa, Onye-nwe aga-azọcha mba nile site n’ike nke Mụọ ya.

60 Na n’ihi nke a ka-enyeworo iwu nsọ nile ndị a; e nyere iwu nsọ ndị a ka-ewezuga ha site n’ụwa n’ụbọchị nke e nyere ha, mana ugbụ a ha aga-aga n’iru nye banụ arụ nile—

61 Na nke a dịka uche na ọchịchọ obi nke Onye-nwe siri dị, onye na-achị eze nye anụ arụ nile.

62 Na nye onye ahụ nke ana-echegharị ma bna-asacha onwe ya n’iru Onye-nwe ka a ga-enye ndụ cebighi-ebi.

63 Na n’isi ha bụ ndị ana-an̄aghị ntị nye olu okwu nke Onye-nwe ka a ga-emezu nke ahụ e dere site n’aka onye-amụma Moses, na-aga bebepụ ha site n’etiti ndị mmadụ.

64 Na kwa nke ahụ e dere site n’aka onye-amụma aMalakaị: N’ihi na, lee, bụbọchị ahụ na-abịa nke cga-ere ọkụ ka ite ọkụ, na ndị nfuli-elu nile, e, na ndị nile na-eme ihe mmebi iwu, ga-abụ ahịhịa ọka, na ụbọchị ahụ nke na-abia ga-erechapụ ha, ka Onye-nwe nke usuu nile nke ndị agha kwuru, nke mere na a gaghị ahapụrụ ha, ọbụghị mgbọrọgwụ, na-ọbụghị alaka.

65 Ya mere, nke a ga-abụ ọzịza nke Onye-nwe nye ha.

66 N’ụbọchị ahụ mgbe m bịakwutere ndị nke m, ọ dịghị onye ọbụla n’etiti unu nke anabatara m, ma a chụpụrụ unu n’ezi.

67 Mgbe m kpọrọ oku ọzọ, ọ dịghị onye ọbụla n’ime unu nọ maka ịza; mana aaka m adịghị mkpụ mkpụ ma ọlị nke m agaghị agbapụta, ma-ọbụ bike m ịnapụta.

68 Lee, na-ibasi mba ike m, ana m eme ka oke osimiri ataa. Ana m eme ka osimiri nile ghọọ ọzara; azụ ha na-esi-isi, na ha na-anwụ n’ihi akpịrị ịkpọ nkụ.

69 Ana m eyikwasị elu-igwe nile uwe ojii, na ana m eme akwa uwe ịgba mkpe ihe mkpuchi ahụ ha.

70 Na anke a ka unu ga-enweta n’aka m—unu ga-edina ala na mwute.

71 Lee, na hụ, ọ dịghị ndị ọbụla ga-enwe ike ịnapụta unu, n’ihi na unu erubeghị isi n’olu okwu m mgbe m kpọrọ unu oku site n’ime elu-igwe nile; unu ekwenyeghị okwu ndị odibo m, na mgbe e azitere ha nye unu, unu a nabataghị ha.

72 Ya mere, ha aarachiwo ọgbụgba ama ahụ na kechie iwu ahụ, na e nyefewo unu n’aka ọchịchịrị.

73 Ndị a ga-apụ baa n’ime ọchịchịrị nke ezi, ebe aịkwa akwa, ịkwa arịrị, na-ịta ikekere eze dị.

74 Lee Onye-nwe bu Chineke gị ekwuwo ya. Amen.